Gọọmenti Legos steeti: Anyị anaghị akpa nkata ọbụla megide Ndigbo

Gọvanọ na-achị Lagos state

Ebe foto si, @AkinwunmiAmbode

Nkọwa foto, Ambode na-akọwa uru ụgwọ ala ga a ba
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aka na-achị Legos steeti bụ Akinwunmi Ambode ekwuola na gọọmenti ya anaghị eme ihe ọjọọ ọbụla maọbụ akpa nkata ọjọọ ọbụla megide Ndigbo bi na Legos.

Ambode kwuru nke a ụnyaahụ bụ Tọọsde na nzaghachi akụkọ na-akpagharị n'igwe soshal midia ọ kachasị na 'Whatsapp' nke na-ekwu gbasara nkata a na-akpa megide Ndigbo bi na Legos.

Akụkọ ahụ kwuru na Ambode akwụsịla echichi Eze Ndigbo na Legos ma na-akpakwa nkata ọzọ iji mekpaa Ndigbo ahụ.

O kwukwara na Legos steeti bụ ala ndị Yoruba na ọ bụghị ebe ndị mgbere ohu biri maọbụ na ọ bụghị ala onye ọbụla.

Mana Ambode kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ okwu ụgha na enweghi ebe ọ gbadoro ụkwụ cha cha, nke ndị na-ebugharị ya na enweghi aka ọrụ ma bụkwara ndị omekome.

Kọmịshọna na-ahụ maka atụmatụ(Strategy) na steeti ahụ bụ Kehinde Bamigbetan kwuru na akụkọ ahụ ekwughị ebe Gọvanọ Ambode nọ were kwuo ụdị okwu ahụ maọbụ ọgbakọ ebe ọ nọ kwuo ya nke pụtara na o kwughị ya bụ okwu.

O kwuru na Ambode kwere nkwa n'ọchịchị bụ nke ga-anabata onye ọbụla agbanyeghị ebe onye si maọbụ onye mmadụ bụ, nkwa ọ na-emezu n'okwu ya.

Mana Bamigbetan kwuru na akụkọ ahụ bụ ihe ịkpa ọchị ma kwuo na Ambode ka na-etinye uchu ịhụ n'ọchịchị ya bụ nke mmadụ niile.

O kwuru na nkata ndị kpokobara akụkọ ahụ akpụọla afọ n'ala maka na ọ chịtaghị aja.

Gọvanọ Ambode kwuru na ya enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha chọpụta ebe ya bụ ozi si bido ma jide ndị niile malitere ya ma takwa ha ahụhụ dịrị ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị