Onye haziri nkwatu ọchịchị na Mali enwetala nkwado ịbụ onyeisiala ruo afọ ise

Ebe foto si, AFP
Onyeagha na-achị mba Mali bụ Gen Assimi Goïta enwetala nkwado ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama ịbụ onye a ga-ekwupụta dịka onyeisiala maka afọ ise na-abịa abịa.
Nwaamadị ahụ dị afọ iri anọ na otu (41) akpachiela ọchịchị ugboro abụọ, ma bụrụkwa onye e kwupụtara dịka onyeisiala nchereoge oge ọ kwatuchara ọchịchị nke ikpeazụ ya n’afọ 2021.
N’oge ahụ, o kwere nkwa ịhazi ntuliaka n’afọ nke na-esote mana ọ dara mba imezu nkwa ahụ.
Ọgbakọ ọha obodo nke ọchịchị ya haziri ma bụrụ nke pati ndị na-agba ọchịchị ya ụkwụ na-agaghị akpọọla oku ugbua ka e kwupụta Gen Goïta dịka onyeisiala ruo n’afọ 2030.
Ka o sinadị, o nwebeghị ihe o kwuru gbasara ọnọdụ a mana ọgbakọ ahụ bụ nke a hụtara dịka mbọ ịkwado ọchịchọ Goïta ịnọgide n’ọkwa.
Na ngwụcha izuụka ka onye ndu otu na-agba gọọmenti Goïta ụkwụ bụ Mohamed Salia Touré gwara ụlọmgbasaozi AFP na ịzọpịa ụkpụrụ ọtụtụ pati ga-abụ “nnukwu ajọ omume”.
N’ụbọchị Wenezde ka otu Amnesty International kwuru na ha agọpụla onwe ha n’ihe ha kọwara dịka “atụmatụ ikpochapụ pati niile na mba Mali”.






















