Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Onye haziri nkwatu ọchịchị na Mali enwetala nkwado ịbụ onyeisiala ruo afọ ise

    Onye haziri nkwatu ọchịchị na Mali enwetala nkwado ịbụ onyeisiala ruo afọ ise

    Ebe foto si, AFP

    Onyeagha na-achị mba Mali bụ Gen Assimi Goïta enwetala nkwado ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama ịbụ onye a ga-ekwupụta dịka onyeisiala maka afọ ise na-abịa abịa.

    Nwaamadị ahụ dị afọ iri anọ na otu (41) akpachiela ọchịchị ugboro abụọ, ma bụrụkwa onye e kwupụtara dịka onyeisiala nchereoge oge ọ kwatuchara ọchịchị nke ikpeazụ ya n’afọ 2021.

    N’oge ahụ, o kwere nkwa ịhazi ntuliaka n’afọ nke na-esote mana ọ dara mba imezu nkwa ahụ.

    Ọgbakọ ọha obodo nke ọchịchị ya haziri ma bụrụ nke pati ndị na-agba ọchịchị ya ụkwụ na-agaghị akpọọla oku ugbua ka e kwupụta Gen Goïta dịka onyeisiala ruo n’afọ 2030.

    Ka o sinadị, o nwebeghị ihe o kwuru gbasara ọnọdụ a mana ọgbakọ ahụ bụ nke a hụtara dịka mbọ ịkwado ọchịchọ Goïta ịnọgide n’ọkwa.

    Na ngwụcha izuụka ka onye ndu otu na-agba gọọmenti Goïta ụkwụ bụ Mohamed Salia Touré gwara ụlọmgbasaozi AFP na ịzọpịa ụkpụrụ ọtụtụ pati ga-abụ “nnukwu ajọ omume”.

    N’ụbọchị Wenezde ka otu Amnesty International kwuru na ha agọpụla onwe ha n’ihe ha kọwara dịka “atụmatụ ikpochapụ pati niile na mba Mali”.

  2. Akụnaụba Amerịka ejirila 0.3% belata ka ụlọọrụ di iche iche na-agba mbọ imeri ụtụisi Trump

    Akụnaụba Amerịka ejirila 0.3% belata ka ụlọọrụ di iche iche na-agba mbọ imeri ụtụisi Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Akụnaụba US ejirila 0.3% belata n'ime ọnwa atọ mbụ nke afọ 2025 dịka ọtụtụ ụlọọrụ kpachiri ngwaahịa ndị ha tụbatara n'ihi ụtụisi Donald Trump.

    Ndekọ ahụ lekwasịrị anya n'oge Onye isi ala Trump a mabeghị ọkwa ụtụisi ọhụrụ.

    Trump ga-anabata ndi isi ụlọọrụ di iche iche nke gụnyere Nvidia na GE Aerospace, nke ahụ gasịa, ọ ga-enwe nzukọ nke ndị otu na-arụrụ ya ọrụ.

    N'abalị Tuzde, iji cheta otu narị ụbọchị mbụ Trump banyere n’ọchịchị, o kwuru na ya emeela ihe di iche iche ịhụ na akụnaụba mba Amerịka mere nke ọma, nke gụnyere itinye ego site n'ụfọdụ ụlọọrụ nke ya na ndị isi ha ga-enwe nzukọ ma e mechaa.

    Trump gara n’ihu na-etu ọnụ na ya tinyere ihe karịrị $5tr (£ 3.74tr) na itinye ego, nke ọ na-akọwa na ọ ga-ekepụta ohere ọrụ ọhụrụ karịrị narị puku anọ na iri ise (450,000).

  3. Okporoụzọ ọjọọ: Ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi Mbieri ebegarala gọọmenti Imo steeti akwa

    Aha onyonyo, Ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi dị na Mbieri akwaala arịrị n’ihi ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzọ ha.

    Ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi dị n’Umuonyeali Mbieri n’okpuru ọchịchị Mbaitoli nakwa ndị na-agba n'okporoụzọ siri Akwakuma gawa Mbieri ebesarala gọọmenti Imo steeti akwa n’ihi ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzọ ahụ, ọkachasị ugbua a banyere n'oge udummiri.

    Ha kpughere nke a oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gbara ha ajụjụ n’ụbọchị Tuzde 29 Eprel 2025.

    Otu n’ime ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi Mbieri bụ Bede Nwakaudu kwuru na okporoụzọ ọjọọ emetụtala ahịa ya n’ụzọ na-adịghị mma ma kwuo na ọ na-esiri ndị mmadụ ike ugbua ịbata na ya bụ ahịa ịzụrụ ihe.

    Okporoụzọ ọjọọ: ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi Mbieri ebegarala gọọmenti Imo steeti akwa

    Onye nke ọzọ aha ya bụ Obinwanne Alozie kwuru na ya na-aga ahịa kwa ụbọchị gbara aka ego laa n’ihi na e nweghị ndị na-azụ ya ahịa.

    O kwuru na ọ na-esi nnukwu ike tupu gwongworo na ụgbọala ndị ọzọ abata n’ime ahịa ahụ, nke mere ebe niile jiri tọgbọrọ chakoo.

    Otu nwaanyị na-ere ahịa bụ Ijeoma Nzetannadi kwuru na ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzo ahụ achụọla ha ndị ahịa ma na-ebutere ha njọ ahịa.

    Ọ sịrị na ndị si Akwakuma, Ubomiri na Orlu na-abịa azụ ha ahịa n’oge mbụ mana ugbua, enweghịzi onye na-ahụ ha n’ihi okporoụzọ ọjọọ.

    Okporoụzọ ọjọọ: ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi Mbieri ebegarala gọọmenti Imo steeti akwa

    N’okwu nke ya, Ogechi Nwakamma kwuru na okporoụzọ ahụ na-ekwo ekwo n’oge mbụ mana ugbua, ndị mmadụ anaghịzi eji ike agba ya dịka ọnọdụ ahụ buteere ha njọ ahịa.

    Otu nwoke na-agba ọkada aha ya bụ John kwuru na ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzọ ahụ sitere Akwakuma gawa Ọgbọ osisi Mbieri ebutela ọtụtụ ihe mberede ma mee ka unyi tojuo ebe niile.

    Ọtụtụ ndị ọzọ kwuputakwara uche ha gbasara okporoụzọ ahụ ma rịọ Gọọmenti Imo steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Dịka anyị siri ghọta, okporoụzọ ahụ siri Akwakụma gawa Mbieri bụ nke jikọtara ụfọdụ obodo gụnyere Umuonyeali Mbieri na Umudagu Mbieri dịcha n’okpuru ọchịchị Mbaitoli tinyere Akwakuma na Orji dịcha n’okpuru ọchịchị Owerri North ma bụrụkwa okporoụzọ ndị na-ere ahịa n'Ọgbọ osisi Mbieri si ebubata ngwaahịa ha n'ime ahịa ahụ.

    Okporoụzọ ọjọọ: ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi Mbieri ebegarala gọọmenti Imo steeti akwa
    Okporoụzọ ọjọọ: ndị na-ere ahịa n’Ọgbọ osisi Mbieri ebegarala gọọmenti Imo steeti akwa
  4. Nzụkọ MACBAN na Onye nnochite anya U.S na Naịjirịa: lee ihe anyị maara

    Ndi otu MACBAN na U.S Mission na Naịjirịa

    Ebe foto si, U.S Mission in Nigeria

    Nkọwa foto, Ndi otu MACBAN na U.S Mission na Naịjirịa

    Kemgbe abalị ole ma ole garaaga ka ụlọọrụ nnọchịteanya mba Amerịka bụ U.S Mission na Naịjirịa wepụtara ozi n’akara X soshal mịdịa ha kwuo na ha na otu jikọrọ ndị na-achụ ehi bụ Mi-Yetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) were ọgbakọ, ụmụ amaala Naịjirịa gara n’akara ahụ na-aju ajuju dị icheiche.

    Ka ọtụtụ na akatọ nkata mba Amerịka na otu MACBAN, ndị ọzọ na-akwadokwa ya.

    N’akara X soshal mịdịa U.S Mission na Naịjirịa ka ha kwuru na “Onye nnọchite anya bụ Mills zutere ndị otu Mi-Yetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) maka ị nụta nsogbu ha nwere na ihe na-eme ndị na-achụ ehi”.

    “Nkata anyị kpara gbasara ihe na-ebute ọnọdụ enweghị nchekwa nakwa etu e nwereike ị jiri wete udo”.

    N’oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ otu onye na ngaraba mgbasa ozi U.S Mission na Naịjirịa bụ Brian Neubert n’ekwentị ka ọ gwara anyị sị “onye otu m ga-akpọghachi BBC ugbua n'ekwenti”.

    Mana tupuu akụkọ a apụta, BBC enwetebeghị oku ekwenti ahụ sitere na U.S mission na Naịjirịa.

  5. Ndị uweojii Saụt Afrịka a chọpụtala ozu ndị ọrụ ya atọ n’osimiri

    Ndị uweojii Saụt Afrịka a chọpụtala ozu ndị ọrụ ya atọ n’osimiri

    Ebe foto si, South Africa Police Service

    Nkọwa foto, Ndị uweojii Saụt Afrịka a chọpụtala ozu ndị ọrụ ya atọ n’osimiri

    Ndị uweojii Saụt Afrịka a chọpụtala ozu ndị ọrụ ya mmadụ atọ n’osimiri bụ ndị a na-achọ achọ kemgbe abalị isii.

    Ha kwuru na mgbe ikpeazụ a hụrụ ndị uweojii ahụ gụnyere Boipelo Senoge dị afọ 20, Cebekhulu Linda dị afọ 24 na Keamogetswe Buy dị afọ 30, bụ oge ha hapụrụ ọdụ mmanụ ụgbọala dị nso n’obodo Johannesburg n’ụbọchị Wenezde gara aga.

    A chọtara ozu ha ihe dịka kilomita iri asaa (70km) site na osimiri Hennops, yana ozu mmadụ abụọ ọzọ a na-akpọghị aha ha.

    Ndị uweojii kwuru na mbụ na ndị uweojii ahụ na-enyocha ikpe nke "ịtọrọ mmadụ" mana na Tuzde ha kwuru na ha enweghị ike ịkọ ma ọnwụ ahụ ọ bụ ihe mberede maọbụ na ọ bụghị.

    Ndị uweojii atọ ahụ bụ ndị ọrụ nchekwa - na-eme njem n’ụgbọala VW Polo ọcha mgbe ha malitere ifu efu, dịka nkwupụta ndị uweojii kwuru.

    Ha kwuru na ngwa nlekota ụgbọala na ekwentị mkpanaaka ha agbanyụrụ kemgbe ahụ.

  6. Onyeisiala Trump ekelela Praịm Mịnịsta Carney meriri na ntuliaka nke Kanada

    Onyeisiala Trump na Praịm Mịnịsta Mark Carney

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump na Praịm Mịnịsta Mark Carney

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ekelela Praịm Mịnịsta Mark Carney bụ onye meriri na ntuliaka nke mba Kanada. Ha abụọ kwekọrịtara na ha ga-ezute 'n'ọdịnihu'

    A na-atụ anya na mba abụọ ahụ ga-enwe mkparịtaụka banyere inwe mmekọrịta akụnaụba na nchekwa ọhụrụ dịka e mechara ntuliaka n’ụbọchị Mọnde.

    Onye mgbasa ozi ọhanaeze CBC kwuru na tarifu azụmaahịa nke Onyeisiala Trump na okwu ugboro ugboro na-emebi nweere onwe Kanada nke kpuchiri ntuliaka ahụ, nke mere eji atụ anya na Liberal pati nke Carney ga-enwe mmeri nke gọọmentị pere mpe.

    N’oku izizi ha kemgbe ntuliaka ahụ, Onyeisiala Trump kelere Carney na mmeri ya, dịka ụlọọrụ praịm mịnịsta siri kwuo na Tuzde 29 Eprel 2025.

    Ụlọọrụ praịm mịnịsta ahụ kwukwara na ndị isi abụọ ahụ "kwekọrịtara na ọ dị mkpa ka Kanada na Amerịka na-arụkọ ọrụ ọnụ - dịka mba nweere onwe ya na ndị nweere onwe ha - maka ọdịmma ha abụọ".

  7. Ihe Onyeisiala Trump kwuru n'oge emume ụbọchị 100 n'ọfịs ya

    Ihe Onyeisiala Trump kwuru maka emume ụbọchị 100 n'ọfịs ya

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe Onyeisiala Trump kwuru maka emume ụbọchị 100 n'ọfịs ya

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump emeela emume ụbọchị 100 n’ọfịs kemgbe ọ malitere ọchịchị nke abụọ dịka Onyeisiala.

    N’ozi ya, o kwupụtara ihe ndị ọ rụzuru na imegide ndị iro ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị.

    N'ịkwado ihe ọ kpọrọ "mgbanwe nke ọgụgụ isi", ọ gwara ìgwè ndị na-akwado ya na Michigan na ya na-eji ọkwa dịka onyeisiala na-eweta "mgbanwe dị ukwuu".

    Trump bụ onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Republican chịrị onye bu ya ụzọ nke Democratic bụ Joe Biden, ọchị ma tụkwaa nkatọ ọhụrụ n’ebe onyeisioche US Federal Reserve nọ, ebe ọ na-akatọ ntuliaka na-egosi na iwu ewu ya na-ebelata.

    Onyeisiala Trump ebelatala ọnụ ọgụgụ ndị kwagara mba ndị ọzọ na-abata mba Amerịka n’ụzọ iwu akwadoghị mana akụnaụba Amerịka bụ ihe ọghọm ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwereike ime, dịka ọ na-ebu agha azụmahịa zuru ụwa ọnụ.

    "Anyị ka bidoro ebido, ị hụbeghị ihe ọ bụla," Onyeisiala Trump gwara igwe mmadụ n’ụbọchị Tuzde na mpaghara Detroit.

    Onyeisiala Trump kwuru na ụlọọrụ ụgbọala “na-agbakọ n'ahịrị” imepe ụlọọrụ nrụpụta ọhụrụ na steeti Midwwest.

  8. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu.

    Anyị na-asị unu abịala n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 30 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile n'ụtụtụ a mana Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Udo dịrị unu!

  9. A tụọla onye ọrụ Access Bank nga maka isere onyonyoo ibe ya oge ha gba ọtọ

    A tụọla onye ọrụ Access Bank nga maka isere onyonyoo ibe ya oge ha gba ọtọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe dị na Legọs steeti atụkpuola Stephen Ejezie dị afọ iri abụọ na asaa (27) n’ụlọmkpọrọ n’ihi ebubo isere onyonyoo ndị ọrụ ibe ya oge ha gba ọtọ.

    Ejezie bụ onye ọrụ n’ụlọakụ Access Bank Contact Centre dị na mpaghara Oniru nke Legọs steeti.

    Ndị uweojii Legọs steeti kpụpụrụ nwaamadị ahụ n’ụlọikpe n’ụbọchị Mọnde ma boo ya ebubo abụọ maka igbochi udo ọhanaeze site n’ise ndị ọrụ ibe ya onyonyoo oge ha na-asa ahụ tinyekwara ịlụso ndị ọrụ ibe ya ọgụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC Pidgin na akụkọ ahụ mere eme ma kwuo na ha nwụchiri Ejezie izuụka gara aga, mechaa tọhapụ ya na beelụ iji mechaa nnyocha ha.

    Ọ kọwara na nwaamadị ahụ a na-enyo enyo lọghachiri n’ụlọọrụ ndị uweojii n’ụbọchị Mọnde dịka ha kpụpụrụ ya ụlọikpe.

    N’akwụkwọ ikpe e mere ka o rute BBC aka, ụlọikpe ahụ nyere Ejezie ntọhapụ beelụ n’ọnụego narị puku naịra ise (500,000) tinyere ndị akaebe abụọ.

    Ụlọikpe kwuru na ọ ga-anọgide n’ụlọmkpọrọ dị n’Ikoyi ruo oge o mezuru ọnọdụ niile e nyere ya na beelụ ahụ.

    Ụlọikpe tinyeziri ikpe ahụ n’ụbọchị 19 Mee 2025 maka ilebara ya anya.

  10. Ndị isi PDP akpọọla nzukọ gbatagbata n’Abuja

    Ndị isi PDP akpọọla nzukọ gbatagbata n’Abuja

    Ebe foto si, PDP

    Ndị isi otu Peoples Democratic Party (PDP) amalitela nzukọ gbatagbata n’isi ụlọọrụ pati ahụ dị n’Abuja.

    Ụlọmgbasaozi Channels TV kwuru na nzukọ ahụ PDP na-akwado inwe ga-abụ na nzuzo.

    Ndị isi pati ahụ kpọrọ ya bụ nzukọ iji kpaa maka ọpụpụ ụfọdụ ndị ọkwa ha dị elu pụrụ na nso nso a tinyere nsogbu dị n’etiti ndị ndu otu ahụ.

    N’izuụka gara aga ka onye jiri aha PDP zọọ ọkwa Osote onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023 bụ Ifeanyi Okowa na aka na-achị Delta steeti bụ Sheriff Oborevwori hapụrụ PDP banye APC.

  11. E weela ọkụ na Portugal, Spain

    Ndị njem tọọrọ n'ọdọ ụgbọ oloko na Barcelona

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ndị njem tọọrọ n'ọdọ ụgbọ oloko na Barcelona

    Ọtụtụ ndi mmadụ na-eme njem ụgbọelu tọkịrị na mba Pọtụgal nakwa Spen dịka ụlọọrụ na-enye ọkụ weere ọkụ n'ike, nke mere ka ụlọọrụ njem ụgbọelu na nke ụgbọ oloko dị na mba abụọ ahụ kagbuo mfepụ na mfebata ụgbọelu.

    Pọtụgal kagburu ụgbọelu 185 and mfebata ụgbọelu 187 ụbọchị Monde.

    Mana taa bụ Tuzde , ọbaọzi ọdọụgbọelu Lisbon gosiri na njem ụgbọelu amalitekwala ọzọ.

    Ụlọọrụ 'Eurocontrol ' na-achịkọta njem ụgbọelu na Yurop gwara onye ntaakụkọ BBC na e nyere ụgbọelu 36 iwu ka ha gaa ebe ọzọ ga fetuo ụnyahụ , dịka ya bụ ihe mere ka mfepụ na mbata n'etiti Spen na Potugal jiri 700 pee mpe karịa ihe ahụrụ otu izuụka gara aga.

    Ndị tọọrọ n.ọdọ ụgbọelu

    Ụlọọrụ na-enye ọkụ latrik na mba Spen a kpọrọ "Red Eléctrica' kwuru na ọkụ ọnụnyụ ahụ abụghị mwakpo ịntanet butere ya dịka ụfọdụ ndị mmadụ si eche. onye ọrụ ụgbọelu .

    Ụlọikpe Ukwu mba Spen ekwuola na ha ga-eme nnyocha iji mata ihe butere ọkụ ahụ e were.

    Ụlọọrụ Red Eletrica kwuru na ọkụ nyụrụ ugboro abụọ ụbọchị Monde na akọrọngwa ha rụtara nke mbụ mana nke abụọ karịị ha aka.

  12. Ọtụtụ ndị Afrịka kwagara mba ọzọ nwụrụ oge Amerịka wakporo Yemen - Houthis

    Ọtụtụ ndị Afrịka kwagara mba ọzọ nwụrụ oge Amerịka wakporo Yemen - Houthis

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị Afrịka kwagara mba ọzọ nwụrụ oge Amerịka wakporo Yemen - Houthis

    Ọwa TV ndị Houthis kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii na asatọ (68) ndị Afrịka kwagara mba ọzọ nwụrụ mgbe mba Amerịka wakporo ụlọnga ndị Houthi na-achị n'ebe ugwu ọdịda anyanwụ Yemen.

    Al Masirah kwuru na ndị kwagara mba ọzọ mmadụ iri anọ na asaa (47) ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ọnọdụ ọtụtụ n'ime ha dị egwu n’ihi ogbenigwe a tụrụ n’ogige ahụ dị na mpaghara Saada.

    O tinyere ihe onyonyo na-egosi ọtụtụ ozu nọ n'ime mkpọmkpọ ebe nke ụlọ mebiri emebi.

    Otu onye ọrụ nchekwa mba Amerịka kwuru na Central Command nke ndịagha Amerịka maara maka nkwuputa nke ndị nkịtị merụrụ ahụ.

    Cheta na mwakpo ahụ mere awa ole na ole mgbe Central Command kwuputara na ndịagha ya wakporo ihe karịrị narị asatọ (800) kemgbe Onyeisiala Donald Trump nyere iwu ka ibu agha ikuku megide Houthis na Machị 15.

  13. Carney emeriela ntuliaka ndị Kanada wee kwuo na 'Trump agaghị emebi anyị'

    Carney emeriela ntuliaka ndị Kanada

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Carney emeriela ntuliaka ndị Kanada

    Onye ahụ ji aha Liberal Pati zọọ ọkwa Praịm mịnịsta na Kanada Mark Carney emeriela ntuliaka ndị Kanada mere.

    N’ozi mmeri ya, Carney gwara ndị na-akwado ya na “Onyeisiala Amerịka Donald Trump na-agba mbọ imebi anyị ka Amerịka nweeike ịnwe anyị - nke ahụ agaghị eme ma ọlị "

    Carney kwuru na Kanada dị njikere ibuso Amerịka agha – onyeisiala Trump nke Amerịka na-eyi egwu ime mba ya steeti nke iri ise na otu (51).

    Akụkọ kwụrụ na ọ dị nso ikwu ma ọ ga-enweta ọtụtụ n'ime ndị omeiwu, maọbụ na ọ ga-adabere na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ iji chịa mba ahụ.

    Onye ndu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Conservative e meriri emeli na ntuliaka ahụ bụ Pierre Poilievre kwuru na ntuliaka ahụ kụziri ha ihe siri ike.

    Nsonaazụ a tụrụ anya bụ mgbanwe dị egwu nke Liberal Pati, bụ nke anaghị eme ọfụma na ntuliaka ahụ nanị ọnwa atọ gara aga, tupu Carney nọchie Justin Trudeau dịka onyeisi.

    Ọzọ bụ na Onyeisiala Trump kwalitere mmekọrịta mba ahụ n’Amerịka were bụrụ okwu akpụ na ọnụ tupu ntuliaka ahụ.

  14. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma nu

    Anyị na-asị unu abịala n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 29 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile n'ụtụtụ a mana Michael Ngene na Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Ndewo nu!

  15. A malitela ịtụ vootu na ntuliaka iji họpụta Praịm Mịnịsta mba Kanada

    Mmadụ abụọ kara aka na-azọ ọkwa na ntuliaka a bụ Mark Carney nke pati Liberal na Pierre Poilievre nke pati Conservative.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mmadụ abụọ kara aka na-azọ ọkwa na ntuliaka a bụ Mark Carney nke pati Liberal na Pierre Poilievre nke pati Conservative.

    Ịtụ vootu agba nke mbụ amalitela na Kanada na ntuliaka iji họpụta onye ga-abụ Praịm Mịnịsta mba ahụ.

    Ntuliaka na-abịa dịka e duru Mark Carney n’ihu ọrụ dịka Praịm Mịnịsta Kanada n’izuụka isii gara aga. Mark Carney nọchiri Justin Trudeau bụbu Praịm mịnịsta Kanada.

    Mmadụ abụọ kara aka na-azọ ọkwa na ntuliaka a bụ Mark Carney nke pati Liberal na Pierre Poilievre nke pati Conservative.

    Ụlọọrụ Elections Canada kwuru na ihe ruru mmadụ nde asaa na narị atọ (7.3m) atụọla vootu na ntuliaka a.

    Cheta na n’afọ 2021, ihe ruru mmadụ nde ise na narị asatọ tụrụ vootu na mmalite ntulaiaka afọ ahụ.

    Ndị tozuru ịtụ vootu na ntuliaka a bụ ndị mba Kanada ruru afọ iri na asatọ ma nwee akwụkwọ njirimara nakwa ngosi ebe ha bi.

    Mmadụ abụọ kara aka na-azọ ọkwa na ntuliaka a bụ Mark Carney nke pati Liberal na Pierre Poilievre nke pati Conservative.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mmadụ abụọ kara aka na-azọ ọkwa na ntuliaka a bụ Mark Carney nke pati Liberal na Pierre Poilievre nke pati Conservative.
  16. A kpụgaala nwoke a na-enyo enyo ụlọikpe maka ụgbọala gburu mmadụ 11 na Vancouver

    A kpụgaala nwoke a na-enyo enyo ụlọikpe maka ụgbọala gburu mmadụ 11 na Vancouver

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, A kpụgaala nwoke a na-enyo enyo ụlọikpe maka ụgbọala gburu mmadụ 11 na Vancouver

    E boro otu nwoke dị afọ iri atọ (30) ebubo igbu ọchụ mgbe ụgbọala ya kwọbatara ebe igwe mmadụ na-eme emume n'okporoụzọ dị na Vancouver nke Kanada, ma gbuo opekata mpe mmadụ iri na otu (11) ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    Ndị uweojii Vancouver kwuru na nwoke ahụ bụ Kai-Ji Adam Lo bi n’obodo ahụ batara n’ụlọikpe na mgbede ụbọchị Sọnde tupu ọ laghachi ụlọmkpọrọ. Ha kwukwara na a ga-ebo ya ebubo ndị ọzọ.

    Onyeisi ndị uweojii Steve Rai kọwaara mwakpo ahụ mere ụbọchị Satọde mgbe a na-eme emume ụbọchị Lapu Lapu nke ihe ruru mmadụ otu narị puku (100,000) dịka ụbọchị kacha ọjọọ n’akụkọ obodo ahụ.

    Ndị ọrụ gọọmentị ewepụtabeghị aha ndị nwụrụ anwụ, mana ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị dị afọ ise ruo iri isii na ise nwụrụ n’ihe mberede ahụ.

  17. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu

    Anyị na-asị unu abịala n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 28 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile n'ụtụtụ a mana Michael Ngene na Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Udo dịrị unu.

  18. Ndị uweojii Kanada kwuru na ọ bụ mmadụ 11 nwụrụ oge ụgbọala kwọbatara n'emume okporoụzọ na Vancouver

    Ụgbọala ndị uweojii Vancouver

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụgbọala ndị uweojii Vancouver

    Ndị uweojii Vancouver ekwuola na ọ bụ mmadụ 11 nwụrụ oge ọkwọ ụgbọala kwọbatara n'emume okporoụzọ ndị mba Philippine na-eme na Vancouver.

    Onyeisi ndị uweojii ahụ bụ Steve Rai kwuru na ọnụọgụ ndị nwụrụ nwereike ịgbago ma kwuo na o doola anya na agwa ahụ abụghị agwa iyi ọha egwu.

    Ndị haziri emume ahụ kwuru na ha mere nnyocha nchekwa tupu ha amalite mmemme ahụ ma gbakwụnye na obi dị ha mwute na ọdachi a dakwasịrị ha.

    Cheta na Praịm Mịnịsta Kanada bụ Mark Carney ekwupụtala mwute ya ma katọọ ajọ agwa ọkwọ ụgbọala ahụ.

    Ndị uweojii ka na-aga n'ihu ime nnyocha dịka ọtụtụ ndị na-eru uju na Vancouver.

  19. Praịm Mịnịsta Kanada akatọọla agwa nwoke ahụ kwọbara ụgbọala n'emume festịvalụ okporoụzọ na Vancouver ma gbuo mmadụ 9

    Praịm Mịnịsta Kanada Mark Carney

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Praịm Mịnịsta Kanada Mark Carney

    Praịm Mịnịsta Kanada Mark Carney ekwupụtala mwute ya n’agwa nwoke ahụ kwọbara ụgbọala ya n’ebe ndị mba Philippine na-eme emume festịvalụ na Vancouver nke gbuo mmadụ 9 ma meruo mmadụ 20 ahụ.

    O kwuru na ndị uweojii kwuru na nwoke ahụ wakporo ndị ahụ mana o chere na ọ bụ agwa iyi ọha egwu.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii anwụchiela nwaamadị ahụ kpara agwa ahụ ma malite ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ajọ agwa ahụ.

    Njiji a na-abịa dịka mba Kanada na-akwado ime ntuliaka ụbọchị Mọnde 28 Eprel, 2025.

  20. Onye nnọchianya Vatịkan akpọọla oku udo na Saụt Sudan iji sọpụrụ Popu

    Onye nnọchianya Vatịkan akpọọla oku udo na Saụt Sudan iji sọpụrụ Popu

    Ebe foto si, South Sudan Presidency Office/Handout

    Nkọwa foto, Onye nnọchianya Vatịkan akpọọla oku udo na Saụt Sudan iji sọpụrụ Popu

    Onye nnọchianya Saụt Sudan na Vatịkan agwala ndị ndu mba ahụ mkpa ọ dị ịkwụsị agha iji kwanyere Popu Francis ugwu.

    Achịbishọp Séamus Patrick Horgan kwuru na, "Anyị ga-agba mbọ ịhụ na anyị gosipụtara ezigbo udo na ndụ ndị Saụt Sudan, na-achọsi ike ịhụ ezi udo na-adịgide adịgide, ya n’inwe mkparịtaụka dịka ọnọdụ udo ahụ na ịhụ na-enwere nkwụsị nke ngwa agha."

    Cheta na mgbe Popu Francis nwụrụ anwụ gara njem nleta na Saụt Sudan n’afọ 2023, ọ gbara ndị ndu mba ahụ ume ma rịọ ka akwụsị agha.

    Mana ime ihe ike n'oge na-adịbeghị anya na-eyi ịkwụsị nkwekọrịta udo na-esighị ike nke ha nwere n’afọ 2018 egwu.

    E nwere nkwekọrịta nkwụsị agha n'etiti otu dị iche iche na mba ahụ dị n’ọwụwa anyanwụ Afrịka nke na-alụ agha obodo.

    Esemokwu bilitere na mbido ọnwa Maachị nke 2025, mgbe otu ndịagha nnupụisi na osote onyeisiala Riek Machar jikọrọ aka n'oge agha obodo Saụt Sudan na ndịagha mba ahụ na-enwe nsogbu.

    Cheta na Onyeisi ụlọọrụ UN na Saụt Sudan Nicolas Haysom dọrọ aka na ntị na mba ahụ nwereike ilaghachita n’agha obodo.

    Archbishọp Horgan kwuru na Popu Francis "kwusiri okwu ike" mgbe ọ gara nleta na 2023, na-akpọ oku maka "nkwụsị ịkwafu ọbara, ọgbaghara, ime ihe ike", na-agbakwụnye na ozi pontiff nwụrụ anwụ ka "dị mkpa".