Eid-El-Kabir: Gọọmenti abalị abụọ dịka ụbọchị ezumike

Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime ala anyị bụ Abdulrahman Dambazau kwupụtara nke a ụbọchị Tọsde n'Abuja n'akwụkwọ si n'ụlọọrụ ya n'aha gọọmentị etiti.
Eide-El-Kabir bụ emume sọ na ndị dịkachara mkpa na ndụ ndị na-ekpe ụka Alakụba na-eme.
Emume nke ha na-egbukarị ebule bụ emume ha ji echeta nrubeisi Ibrahim(Abraham) rubere site n'ikwenye iji nwa ya chụọrọ Chineke aja.
Dambazau rịọrọ ụmụ Naijiria ka ha were ohere a makụọ ifunanya na ịchụ aja maka ịdịnotu na ọganihu Naijiria.
Ọ rịọkwara ndị Naijiria nọ n'ụlọ na ndị bị n'ọhịa ka ha kwado ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.
Dambazau kpere mmadụ niile ekpere ihe ọṅụ n'oge emume a.
Akụkọ ga-amasị gị




