Naijiria: Anyị ejịghị ego gbapụta ụmụaka Dapchi

Ebe foto si, Isaac Linus Abrak
Mịnịsịta okwu mgbasaozi dị n'aka bụ Lai Mohammed ekwusiela ike na gọọmenti etiti enweghi mgbe ha nyere onye ọbụla ego maka mgbapụta ụmụaka Dapchi ndị Boko Haram tọọrọ.
Otu United Nation ekwuola na nyocha ha mere gosiri na gọọmentị Naịjirịa kwuru ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ Dapchi a tọọrọ n'ọnwa Febụwarị.
Dika otu ahụ siri kọwa, inye ego soo ewelite mkpamkpa otu Boko Haram na-akpa na mpaghara Naijiria na Chad.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Lai Mohammed gọrọnarịrị sị na Naịjirịa ma kwuo na ọ nweghị ego e ji gbapụta ụmụaka Dapchi.
O kwuru ka onye ọbụla na-ekwu ụdị ihe ahụ wepụta ihe ngosi akaebe kpatara o ji ekwu ya.

Ebe foto si, Yobe State Government
N'okwu ya; "O zughị ibo Naijirịa ebubo na ọ kwụrụ ego, obere maọbụ nnukwu. Ọ ga-enwerịrị ihe mgbado ụkwụ ga-egosi ihe ndị ahụ.
Mana ọ bụrụ na o nweghị ihe ngosi ọbụla, ị mara na ọ bụ 'nkonuko' ka ndị mmadụ na-eme.
Lai Mohammed si n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Segun Adeyemi wee kwuo ihe ndị a n'abalị Tọọsde.

Otu ndekọ ndị UN nke e nyere ngalaba nchekwa ha kwuru etu ndị Boko Haram si enweta ego nakwa etu ego a na-ahụ anya nke kachasị na Naịjirịa si enyere ha aka nakwa etu ya bụ ego gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ha si kwalite ha.
Mana cheta na oge a tọghapụrụ ụmụaka Dapchi ahụ bụ ndị a tọọrọ n'ọnwa Febụwarị afọ a, mịnịsịta a okwu mgbasaozi dịkwa n'aka bụ lai mohammed kwukwara oge ahụ na a gbapụara ụmụaka Dapchi ahụ na-akwụghị ihe ọbụla.
Onye na-akpọ onwe ya Mama Boko Haram kwuru na onweghi ego gọọmenti Naịjirịa kwụrụ maka mgbapụta ụmụada ahụ.Na mkparịtaụka BBC Igbo na Mama Boko Haram nwere o kwuru na gọọmenti Naịjirịa akwụghị Boko Haram ego iji tọghapụ ụmụada Dapchi.
Mana otu nwantakịrị nwaanyị bụ leah Sharibu bụ naanị onye agbapụtaghị n'ime ha niile, ọ ka nọkwa n'aka ndị Boko Haram.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị











