Ebele Okobi: Ndị uweojii gwa anyị ihe mere Chinedu
Na mbido ọnwa Ọktoba a, ndị uweojii mba Amerịka gburu nwafọ Igbo aha ya bụ Chinedu Okobi n’anya ọcha na-enweghi ihe doro anya o mere.
Akụkọ kwuru na Okobi, onye ji otu nwa na-aga n’okporoụzọ oge ndị uweojii were igwe ọkụ latrik ha ji akpachi mmadụ nke a kpọrọ taser na bekee were regbuo ya.
Na mkparịtaụka BBC Igbo na nwanne ya nwaanyị bụ Ebele Okobi nwere, o kwuru na odoghi ya anya ihe mere ndị uweojii jiri kpasoo nwanne ya akwa karịa ịkpa oke agbụrụ ha na-akpasa ndị isiojii.
Okobi, onye bụ onyeisi na-ahụ maka atụmatụ maka Afrịka n'ụlọọrụ Facebook sị, “Anyị na-ahụ etu ndị uweojii Amerịka na-ejidenwu onyeọcha ji egbe na-egbughi ha maọbụ merụọ ha ahụ, mana gbuo onye oji ejighị egbe.”

Ebe foto si, Okobi Family
N'ọsịsa ha, ndị uweojii San Mateo County kwuru n'ezie na a na-enyocha ihe mere ụbọchị Ọctoba 3, afọ. na ndị uweojii o metụtara gawara ezumike nwa oke iji nye ohere ka ha nyocha ihe mere.
Ha gwara BBC Igbo kwuru na Chinedu "na agbagharị n'etiti ụgbọala nọ n'ahịrị, onye uweojii pụtara n'ụgbọ ya gakwuru ya ma ọ nwụrụ ya ọgụ, ya nwere kpọọ ndị otu ya ndị gbata ya ọsọ enyemaka.
"E bugara onye uweojii ụlọgwu leta ya maka ahụ ọ merụrụ, ma bugakwa onye a nwụchiri n'ụlọgwu ebe e kwuru n'ọ nwụọla."
Ha kwuru na eziokwu ga-apụta ihe ma ha mecha nyocha.
Lee ihe okwuru n'uju na ihe nkiri a:.