Akụkọ ndị dị mkpa taa: Nwaanyị a ga-aka nwoke chịta nke ọma
Akụkọ dị mkpa taa
Na mba ofesi
Ọ pụtara na aka ụmụnwaanyị ka kwụọtọ karia nke ụmunwoke?

Ebe foto si, AFP
Ọ bụ ihe Praim Minister mba Ethiopia na-ekwu dịka o mere Aisha Mohammed onyeisi ndịọrụ nchekwa mbụ ma nyekwa ụmụnwaanyị ọkwa ọchichị ruru ọkara na gọọmentị ya.
Red Cross ebeela akwa Hauwa Liman.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onyeisi Red Cross na mpaghara Afrịka bụ Patrcia Danzi ekwuola na ọnwụ Hauwa Liman bụ ihe obi mgbawa
Danzi rịọrọ gọọmentị Naịjirịa ha gbaa mbọ hụ na udiri ihe a emeghị ọzọ.

Ebe foto si, Lere Olayinka
Aka chịbụrụ Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose wụchiri n'ụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC taa.
Fayose mere nke a dịka eduru onye nọchịrị anya ya bụ Kayode Fayemi n'iyi ọrụ n'Ekiti taa.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu bọọlụ Madagascar etozuola ịga asọmpị Africa Cup of Nations nke mbụ ha dịka ha meriri otu bọọlụ Equitorial Guinea.
Ndị Super Eagles nke Naịjiria ga-ezute otu boolu mba Libya ta na Tunisha.
Gee Nkeji nke mgbede a:
N'ụtụtụ
Aga m ebu akwa ndina gaa n'ụlọọrụ EFCC

Ebe foto si, @GovAyofayose
Onye bụbu Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fasoye ekwuola na ọ ga-ebu ote ya na akwa ndị na niile ya gaa zara ọnụ n'ụlọọrụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC.
Cheta na e boro ya ebubo na ọ na-atara ego dị otu ijeri naịra na ọma bụ nke ekwuru onye bụbu onye ndụmaọdụ na nchekwa bụ Sambo Sinatọ Musilu Obanikoro nyere ya.
Ọrụ Fayose dịka gọvanọ gụrụ n'isi ụtụtụ taa nke a mere ikike na-echekwa bụ immunity na bekee ị gaara ọnụ ya gụkwara n'otu aka ahụ.
Naịjirịa akatọọla ogbugbu Leman:

Ebe foto si, @Twitter/ICRC
Ụmụ Naịjirịa akatọọla gọọmentị etiti maka ịnọ na mmiri ncha a baa ha anya n'ihi ogbugbu ndị Boko Haram gburu Hauwa Leman onye ọrụ Red Cross.
Cheta Boko Haram tọọrọ Leman na ndị oru ibe ya n'ọnwa Maachị afọ 2018.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4
Akwamozu nwafọ Igbo uweojii mba Amerịka gburu

Ebe foto si, Getty Images
Taa bụ akwamozu Chinedu Okobi, nwa afọ Igbo dị afọ iri atọ na isii ndị uweojii mba Amerịka gburu n'anyaọcha na mba ahụ.
Nwanne ya bụ Ebele Okobi gwara BBC Igbo na aka nwanne ya dị ọcha, ma kpọkuo mba ụwa ka ha nye ezinaụlọ ha aka inweta ikpe kwụ ọtọ.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Odeakwụwkọ mba Amerịka bụ Mike Pompeo ga-ezute Eze Salman Amid nke Saudi Arabia taa n'ihi ogbugbu onye ntaakụkọ Saudi a kpọrọ Jamal Khashoggi furu n'ụlọ ọrụ nnọchiteanya ha dị na Turkey.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
England ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Spain n'asọmpị mba Uefa ha gbara n'abalị
mmeri a bụ mbụ England na-enweta n'aka mba Spain n'ime afọ iri atọ na otu.
Gee Nkeji nke mgbede a: