Paul Esemene: Ihe ndị Uweojii Malaysia kwuru maka onye Igbo nwụrụ n'obodo ahụ

Aha onyonyo, Etu ejima m ji nwúo na Malaysia
Peter na Agiliga Esemene

Ebe foto si, Peter Esemene

Mgbe Paul Agiliga Esemene hapụrụ ụlọ ya na Vince Hill Condominium na Kuala Lumpur, isi obodo Malaysia n'ụbọchị 28 ọnwa Ọgọstụ, ọ maghị na ọnwụ ga-echere ya na nlọta.

Mana nwa amadị a lọtara ụlọ ma zute ọnwụ ike.

Agịlịga Esemene na nwunye nwanne ya

Ebe foto si, Peter Eseme

Mazị Esemene bụ ejima, ma bụrụ onye ojiegoachụego aka ya dị na mbụpụ na mbụbata ngwaahịa na Malaysia.

Ejima ya bụ Peter Onyeisi Esemene bi na New Dehli, India, gwara BBC Igbo na Agiliga gara ịhụ enyi ya nwoke wee lọta ma zute ndị uweojii n'ụlọ ya.

Dịka Onyeisi siri kwuo, ọ maghị ihe mere nwanne ya nwoke jiri gbapụ ọsọ mana ọ sị na o nwere ike imetụta ihe mere o jiri nye ya ego ugboro atọ kemgbe afọ otu na ọkara Agiliga gara Malaysia.

Uweojii Malaysia

Ebe foto si, Peter Esemene

Nkọwa foto, Uweojii buputere Paul Agiliga Esemene n'ụtụtụ ụbọchị Tusde

"Enyere m ya ego ugboro atọ maka iji gbapụta onwe ya n'aka ndị uweojii."

Onyeisi gara n'ihu kwuo na aka ndi uweojii Malaysia di n'ọnwụ ejimma ya.

"Ọ bụ ndi uweojii na-achụ ya mgbe ọ dara wee kụọ isi n'ala, ọ bụ ihe gburu ya,"

Onyeisi kwuru na ọ bụ na nke enyi ya ahụ na-adịghị ka nwanne ya gara ileta tupu ihe ike a eme ya.

Peter na Paul Esemene mgbeha dị obere

Ebe foto si, Peter Esemene

Nkọwa foto, Peter Esemene sị na ọ bụ n'afọ 2016 ka o mere Paul Akwụkwọ ka ọ ga Malaysia

BBC Igbo gbara mbọ nweta onye uweojii okwu a dị na-aka bụ Sergeant Samsudeen. O kwuru na ha mere nyocha banyere ihe gbụrụ nwaamadị a wee hụ na ọ bụ ọdịda elu gburu ya.

Sergeant Samsudeen kwukwara na ha ka na-eme nyocha ihe kpatara nwaamadị a jiri si n'elu daa.

Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ma aka ndị uweojii ọ dị na ọnwụ Agiliga, o kwuru na ha nụrụ na ndị uweojii gara ebe ahụ, mana ọ bụghị ndị nke si n'ụlọọrụ ha bụ Pekan Batu 9.

O kwukwara na ha na-eme nnyocha ebe ndị uweojii ahụ si, maọbụ na ha chụrụ ya ọsọ.

Aha onyonyo, Nkwọwa ndịuweojii Malaysia mere n'ọnwụ Paul Esemene.

Onye Naịjirịa ọzọ bụ agbata obi Agiliga na Venice Hill Condomimium kpọrọ onwe ya Tobechukwu, gwara BBC Igbo na ndị uweojii na-abịa enye ndi isi ojii nsogbu, na-anakọrọ ha ego.

Ọ sị na ihe a metụtara akpọmasị agbụrụ, bụ nke Bekee kpọrọ Racism.

O kwukwara na Agiliga nwụrụ ọnwụ ike maka ndị uweojii na-achụ ya akwụsịghi ka ha nyere ya aka mgbe o si n'elu ụlọ a na-akpụsa ụgbọala daa.

Nwunye Onyeisi Esemene bụ Diana Samantha Esemene gwara BBC Igbo na-agaghị akpachapụ akpọmasị agbụrụ n'ihe mere ọgọ ya nwoke.

Aha onyonyo, Okwu nwaanyị Indịa maka akpọmasị agbụrụ

BBC Igbo gbara mbọ ka anyị nụ olu ndị ụlọọrụ na-anọchịte anya Naịjirịa na Malaysia bu Nigerian High Commision mana anyị enweteghi ha n'ekwentị.

Ndị nwe Agiliga ebidorola nhazị etu a ga-esi bulata ya na Naịjirịa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ