2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Enugu

Eunice Atuejide/Ibenaku Onoh

Ebe foto si, Eunice Atuejide/Ibenaku Onoh

Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ #NotTooYoungToRun, ndị ntorobịa a si Enugwu steeti apụtala ịzọ ọchịchị n'afọ 2019.

BBC Igbo chọrọ ịgba ụfọdụ ndị ntorobịa ndị ahụ n'anwụ, ka ọha mara ha dịka ha na-anwa ike ha itinye anya n'ọchịchị.

Ndị a nọ ebe a chọrọ ịnọchite anya ndị Enugwu n'ọkwa dị iche iche na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Onyeisiala

1) Eunice Atuejide dị afọ 39 bụ ọkaiwu.

Atuejide bụ onye Ukehe dị n'okpuru ọchịchị Igbo Etiti chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Eunice Atuejide

Ebe foto si, Eunice Atuejide

Ụlọomeiwu ukwu

1) Chigbo Izundu dị afọ 28 bụ ode akwụkwọ nakwa onye achụmnta ego.

Izundu bụ onye Eke dị n'okpuru ọchịchị Udi chọrọ ịnọchite anya ndị Enugwu Westị n'ụlọomeiwu ukwu.

Chigbo Izundu

Ebe foto si, Chigbo Izundu

Ụlọomeiwu nke steeti

1) Ibenaku Harford Onoh dị afọ 31 bụ ọkaiwu.

Ọ bụ onye Enugwu Ngwo chọrọ ịnọchite anya ndị Enugwu nọ n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ibenaku Onoh

Ebe foto si, Ibenaku Onoh

2) Sochima Michael Ugwu dị afọ 31 bụ onye nkuzi.

Ọ bụ onye Amụtaenyi Obollo-afọ chọrọ ịnọchite anya ndị Udenu n'ụlọomeiwu nke steeti.

Sochima Michael Ugwu

Ebe foto si, Sochima Michael Ugwu

3) Chiedozie Confidence dị afọ 36 na-emepụta ihe nkiri ma bụrụkwa onye achụmnta ego.

Chiedozie bụ onye Ụmụaga chọrọ ịnọchite anya ndị Udi n'ụlọomeiwu nke steeti.

Chiedozie Confidence

Ebe foto si, Chiedozie Confidence

4) Onyebuchi Michael Chinonso dị afọ 30 bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara achụmnta ego.

Onyebuchi bụ onye Akwụ-Inyi dị n'okpuru ọchịchị Oji River chọrọ ịnọchite anya ndị Oji River n'ụlọomeiwu nke steeti.

Onyebuchi Michael Chinonso

Ebe foto si, Onyebuchi Michael Chinonso

5) Emeka Jideofor dị afọ 33 bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara mkpata na mmefu akụnaụba.

Jideofor bụ onye Oji River chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'ụlọomeiwu nke steeti.

Emeka Jideofor

Ebe foto si, Emeka Jideofor

Ị ga-akwado ndị a?

Akụkọ ga-amasị gị