Theresa May: Kedu ihe Igbo chọrọ n'aka Teri?
Onyeisiala mba Briten bụ Theresa May atụọla na Abuja taa dịka ọ ga-ebido nleta abalị abụọ ya na Naịjirịa.
Ụgbọelu bụ ya daturu na ọdọụgbọelụ nke Nnamdi Azikiwe taa tupu ọ malite ị ga Aso Rock.
Ọgbọ ya bụ Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari nọ n'ebe anabatara ya n'isi ụlọọrụ Aso Rock taa na nkwadobe nzụkọ imeụlọ ha ga-enwe.
Mgbe ọ gara na mba Saụt Afrika, Theresa May kwere nkwa na Briten ga etinye ihe ruru pound ijeri anọ n'ọrụ na mba Afrika nke ga-enyere ha aka ịnye ndị ntorobịa ọrụ.
Ụfọdụ n'ekwu na "ihe Naịjirịa chọrọ abụghị ego mmachiakpa kama na ha chọrọ ka Briten nye aka ime ka obodo a kwụsịike".
Njem a so na ihe May hibere iji mee ka mmekọ Briten na mba Afrịka siwanye ike dịka ha na-achọ ịkwụrụ onwe ha mgbe ha hapụrụ Europian Union na 2019.

Ụfọdụ na-ekwukwa na ọdịghị mbe pụrụ inye ibe ya aka nye ndị be ha ọrụ kama Briten nwere ike inye aka ka ọchịchị onye kwuo ụche ya kwuru chim na Naịjirịa.
Mana Theresa May na-ekwusi ike na n'ezie ego mmachịakpa mba na-enye mba na-enye aka nke ukwuu.
Leeka sụpirịsụpịrị ya ebe .
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ochie dike na ihe gbasara azụmahịa bụ Odilim Basil Enwegbara na-ekwu na ekwesiri ịkapị ọnụ ihe Briten chọrọ iji ya bụ ego mee na Naịjirịa.
Ma ọbụghị ya, "mara na ya bụ ego furu ọkpọrọ".
Ọ sịkwa na njem a ga-enyekwa aka ịme ka gọọmenti mba Afrika "meghe ụzọ ha maka azụm ahịa mba ụwa mana ha ga agbambọ hụ na etinye ndị ma maka teknụzụ na ọrụ ka ọwere dị nfe ịme ka mmụta tecknụzụ nke sị na mba fere mba dị ire".
N'ezia, azụmahịa mba Briten na Naịjịrịa malitere ịkpọ imi n'ala kemgbe nke bụ na ọ darụọla ijeri atọ na ụma asaa.

Ebe foto si, Getty Images
Ya mere ha jị achọ ụzọ abụla ụzọ aga esi mee ka ya bụ azụmahịa kporokwa ọkụ ọzọ.

Onye ọzọ BBC pidgin gbara ajụjụ ọnụ bụ Bongo Adi sị na ihe Briten ga-eme bụ inyere Naịjịrịa aka napụtacha ego ha ezupuru na mba ọzọ.
Bongo sịkwa na Briten na Naịjịrịa kwesiri ịtụkọ isi ọnụ ịmara ka a ga-esi kwọwa onye ụkwụ wara ka iji were kwe ọjịje na okwu gbasara mpụ na ngarị bụ nke na-achọ ịta isi obodo a.
Ọ sịkwa na-agbanyeghị na China ekwunyela na Naịjirịa n'ihe gbasara ọrụ mmepe obodo mana na ọnweghị ihe ọmere Briten ịgbakwa mbọ nke ha.
Ka a na-ekwu ka a na-ekwu, onye nọchite anya Briten na Naịjirịa ekwuola na Briten eweghachitala ego dị nde pound iri na asaa (£70,000,000) ezurupuru ezupu.









