Buhari: Ihe m ji kagbuo ije maka nkwekọrịta mba Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bu Muhammadu Buhari kagburu njem ọ kwadoburu ịga na Rwanda taa.
Njem ahụ bụ maka ịnọchịte anya Naịjirịa na ngalaba na ọgbakọ mba dị na Afrịka nke a na-akpọ, 'African Union' maọbụ AU na asụsu Bekee, maka ọgbako pụrụ iche na Tuesdee bu ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị, afọ 2018.
Ọgbakọ a ebe Buhari kwesiri ị nọ binye aka na nkwekọrịta a ga-eji bido ihe akpọrọ "African Continental Free Trade Area" na asụsụ bekee, nkwekọrịta kwesiri ime ka mba niile binye aka ị na-azụ ma na ere ahịa na enweghi mgbochi ọbụla.
Na ajụjụọnụ Rebecca Kesby, onyeọrụ BBC gbara Femi Adeshina bụ ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị kwuru na mkagbu njem ahụ bụ iji nye gọọmenti ohere ka na ndị ihe ahụ metụtara nwe mkparịtaụka.
Adeshina kwuru: "Otu jịkọrọ ndịọrụ ekwugidela Naijiria itinye aka n'akwukwọ nkwekọrịta azụmahịa mba Afrịka ahụ. Ihe ndị a nile bụ etu ọ ga-esi dịrị ndị mmadụ mma. Ọ bụ iji lebanye anya n'ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ maka etu nkwekọrịta ahụ ga esi metụta ha. Ọ bụghị na Naijiria akagbuola ibinye aka n'a akwụkwọ nkwekọrịta ahụ."
Ngalaba gọọmentị Naịjiria na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi zipụrụ ozi onye na-ekwuchitere ha bụ Tope Elias-Fatile binyere aka oge ụka, wee kwuo na ihe Buhari jiri kagbuo njem ya bu "ka ọ nụta n'aka ndị ọnu na eru n'okwu".
Agbanyeghị na nzukọ ndị na-achị Naịjirịa a kpọrọ Federal Executive Council (FEC) kwenyere na Naịjirịa ga-ebinye aka na nkwekọrịta a, otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ "Nigeria Labour Congress" (NLC) sị na ha ekweghị na Naịjirịa ga-eso na nkwekọrịta ahụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a
NLC kwuru na nkwekọrịta a ga-enye ndị ọrụ Naịjirịa nsogbu, ọkachasị ibute ịchụ n'ọrụ ụfọdụ.
Ndị na-ahaziri Buhari ụzọ anọdịela na Kigali bụ isi obodo Rwanda kemgbe Fraịdee, mana a gwaala ha lọghachite Naịjiria.
Onyeisi otu na-ahụ maka ikike dịrị onye n'ihe gbasara akụ na ụba nke a kpọrọ SERAP n' aha ichafụ bụ Adetokumbo Mumunu kwuru na o ji na-aka na gọọmenti chebara echiche iji ma uru na ọghọ dị na-iwepụ Naijiria na nkwekọrịta azụmahịa mba nọ n'Afrịka tupu ha kagbuo ya.
" E ji m n'aka na gọọmenti Naijiria ugbua chebara ime uru na ọghọm dị na ịkagbu itinye aka n'akwụkwọ maka nkwekọrita azụmahịa mba Afrịka. Na mmekọrịta mba na na ibe ya, e nweghị onye bụ onyeilo ebeebe onyeghi onye bụ enyi ebebe."
N'okwu ya,Bisi Iyaniwura gosiri obi mwute na Naijiria sepụrụ aka na nkwekọrịta ahụ na agbanyeghị na ọ dọnyere ukwu n'ebe ọ dị ukwu na mkparịtaụka iji nwe nkwekọrịta maka ịzụ ma ere ahịa n'Afrịka na enweghị mgbochi ọbụla.
"O dị m nnukwu obi mwute n'ihi Naijiria tunyere nnukwu ihe n'okwu nwe nkwekọrịta maka ịzụ ma ere ahịa n'Afrịka nke gara inwetara anyị ezi ego. "
Mana ọ gara n'ihu kwuo na ihe ọghọm dị na ya bụ nkwekọrịta bụ na Naijiria enweghị akụrụnkwa na-akwalite akụnaụba dịka ọkụ latrik, ego a na-akwụ iji gbazite ego n'ụlọakụ wdg., ga-enyere ala anyị aka inweta uru gara esi na nkwekọrịta ahụ pụta, ebe mba dịka Rwanda, Saụt Afrika nwere ihe ndị a.










