ICSC chọrọ ịkpụpụ gọọmentị n'ụlọ ịkpe maka 'ajọ ọchịchị'

Otu jikọtara ndị gbanụ gbanụ n'ala Igbo bụ Igbo civil society coalition agwala gọọmentị na-achị ugbua na ha anaghị erubeisi n'usoro ọchịchị nke a kpọrọ 'True Ferderalism'.
Onyeisioche ndi otu a bụ Maazi Bismark Oji, kwara arịrị na President Muhammadu Buhari ka na-agakwa n'ihu na-akpachapụ Ndigbo n'ike ọkwa ọbụla na gọọmentị ya.
Ọ sị n'agbanyeghị na agwara ya ka ọ gbanwee, ihe na-ebe ka na-ebekwa.
Onye ji ọkwa "national coordinator" otu a bụ Ọkammuta Obasi Igwe kwuru na oge eruola mgbe Ndigbo ga-ejikọ aka onụ napụta oke ruru ha.
Ndi otu a katọrọ ogbugbu ndị na-achị ehi na-egbu ndị mmadụ n'ala anyị, ma gwa gọọmentị na oge eruola ijide ndị niile na-akpa ike ọjọọ a, ma taa ha ahụhụ dịka iwu obodo sịrị kwuo.
Ndị bịara na ya bụ nzụkọ otu Igbo Civil Society Coalition (ICSC) bụ ndị isi otu ndị ọzọ na-ahụ maka ọnọdụ Ndigbo na Naịjirịa.
Bismark Oji kwuru na ndị otu ha niile amalitela izisa ozi n'ala Igbo niile ka ndị mmadụ gaa nweta akwụkwọ ntuliaka bụ PVC maka ntuliaka nke na-abịa n'ọnwa ole na ole.
Ozi ha wepụtara na-ekwukwa na ha adịla njikere ịgba gọọmentị Buhari na otu ọchịchị APC akwụkwọ maka ụdịrị ntaramahụhụ ụmụ Naịjirịa nọ n'ime, ogbugbu ndị na-achị ehi na egbu ndị mmadụ, nakwa mmegbu ha na-emegbu Ndigbo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










