2019 Election: E ji Ndigbo eme akaje
Na mkparịtaụka BBC Igbo na Goddy Uwazuruike, onye ọkaiwu nakwa onyebụbu onyeisi otu Aka Ikenga nwere, o kwuru na ikwe Ndigbo nkwa ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 ma ọ bụrụ na ha tụnyere Buhari akwụkwọ n'afọ 2019 bụ mkparị.
O kwukwara na Ndịigbo ekwenyeghị na ịmapụta ala maka ọdo-ehi, sị ọchị ehi chọrọ ala ga zụrụ.