Onyeisiala Buhari amachiela mba ofesi ịnapụ ndị Naịjirịa ọrụ

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari amanyela iwu ga-egbochi ndị mba ofesi inwete ọrụ ọbụla na Naịjirịa ma ya bụrụ na o nwere onye Naịjirịa maọbu ụlọọrụ Naịjirịa so achọ ya bụ ọru na Naịjiria, ọkachasi maọbụrụ na ndị Naijirịa nwere ikike iji arụ ọrụ ahụ.
Iwu a Buhari binyere aka so na ihe a na-akpọ Executive Order 5 n'asụsụ bekee. Ọ ga-enye aka hụ na ndị Naịjirịa nọ na mpaghara technụzụ ga-aracha elele kwesịrị iruru ha.
Onye na-ekwuchitere Buhari bụ Garba Shehu sị na iwu a ga-eme ka Naịjirịa kwusie ike n'ihe gbasara ọganiru obodo.
Iwu executive order a gbochikwara ndị mịnịstrị ndị nlekọta ụlọ inye ndị ọrụ si mba ofesi visa, maọbụrụ na ndị Naịjirịa ga-arụnwu ya.
Kama ọ hapụrụ ohere ka otu ndị si mba ofesi nwee ike irụ ọrụ ma ọ bụrụ na onweghi ndị Naịjirịa nwere ikike iji arụ ya, mana ha ga-enwe atụmatụ tinyere ọganiiru ndị Naịjirịa n'uche, tupu enye ha ọrụ a.
Buhari gwakwara ndị ministrị na ndị ngalaba na-ahụ maka sayensị na teknụzụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha tinyere ndị ọkachamara si Naịjirịa n'ime ọrụ ndị dị ka itụatụmatụ na ịwepụta ebumnuche projetị ndị ncheobodo.





