Kedu ihe Ipob ji sị Igbo nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba?

Ebe foto si, Getty Images
Otu n'ime otu na-acho ka ekewa Naịjirịa were nweta mba ha kpọrọ Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola ka ndị niile bụ ndị Igbo na ndị ha kpọrọ "ndị Biafra" gharị ịga ọrụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 2018.
N'ozi onye ode akwụkwọ mgbasa ozi Ipob aha ya bụ Emma Powerful binyere aka, Ipob sị na ụbọchị bụ "oge abụbụ ọrụ na iru uju".
Ha sị na ọ bụ ụbọchị ahụ ka ndị agha Naịjirịa wakporo obodo Afaraukwu, nke dị n'Ụmụahịa, were gbuo ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.
Ipob gakwara n'ihu boro ndị agha Naịjirịa ebubo na ha liri ndị a nwụru na ili nzuzo.
"Ụlọ ọrụ niile, ahịa, ụlọ akwụkwọ nakwa ụgbọala eji eme njem ga-agbachi site n'ime abalị ụbọchị 13 nke ọnwa Septemba n'ala Biafra.
Ndị mmadụ ga-anọ n'ime ụlọ ha na-ekpere ndị nwụrụ ekpere nakwa na-eche maka ọnọdụ ala anyị dị," akwụkwọ ozi Ipob a kwuru.
Ha gakwara n'ihu kwuo na onye ọbụla a hụru n'ụzọ ụbọchị ahụ ga-eso na ndị ha na-ahụ ka ndi iro ha.
Ahụbeghi onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu n'ihe kemgbe ndị agha mechara Egwu Eke nke abụọ ha n'Umuahia n'afọ 2017.
Agbanyeghị na ndị Ipob sị na ọ bụ ndị agha ma ihe mere ya, ndi agha Naịjirịa na-agọ aka na ukwu na ha amaghị ihe ọbụla banyere Maazi Kanu.
N'ọnwa Ọgọst a, ndị agha kwukwara na ha na-ahazị ime atụmatụ Egwu Eke nke atọ n'ala Igbo, bụ ihe Ipob, Ohaneze, na ọtụtụ ndị ọzọ na-akatọ.









