Malaria: Ụzọ asaa ị ga-esi gbalahụ ọnwụ site n'ọgwụanwụ

Onye na-agba ọgwụ ọgbụ ahụhụ na oke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịgba ọgwụanwụ nwere ike igbu mmadụ ma e meghị ya ọfụma

Ọgwụanwụ na-egbu anwụnta na-ebute ọrịa ịba mana i were iwe anwụnta hapụ ime etu o kwesiri n'ihe gbasara ịchụ anwụ, ụchịcha na, ahụhụ ndị ọzọ, inwere ike hapụ igbochi ọrịa goro ọnwụ.

Na nsonso a, Ghana ebe ụmụaka atọ gụnyere ejima dị ọnwa itoolu nwụrụ ka ha kuruchara ọgwụanwụ ndị mụrụ ha gbara n'ụlọ ha.

Ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ọha na ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital(LUTH) bụ Dọkịta Ezekiel Oridota kwụrụ na emeghị ọgwụanwụ ka o kwesiri nwere ike ibute nsogbu dị icheiche dịka mgbaka akpụkpọahụ,ụkwara,azụzụ, ọrịa ebe e si eku ume na ọnwụ.

Lee ụzọ ise ị ga-esi gbalahụ iji aka gị gbuọ onwe gị ebe n'achụ anwụ:

1. Mara ụdị ọgwụanwụ ị na-ego

Ogwụanwụ ndị na-enyekarị nsogbụ na-abụkarị ọgwụ ndị ọrụugbo ji echekwa mkpụrụ ha kọrọ ka ọ ghara ịgba ụtụ. Ebe ụfọdụ bụ ọgwụanwụ gọọmentị mabidoro n'iwu mana ndị mmadụ gara n'ihu were ya egbụ ahụhụ.

Dọkịta Oridota dọrọ ndị mmadụ aka na ntị sị"Gba mbọ gụọ ihe e dere n' ahejiri mee ọgwụanwụ ịtupu ịzụ ya."

2.Zụụ naanị ọgwụanwụ e jiri flawa mebe

Dịka Dkta Oridota siri kọwaa, ọgwụanwụ ndị na-egbukarị ndị mmadụ bụ ndị nwere chemịcalụ a kpọrọ 'organophosphosphate' nakwa 'carbamate'.

Ọgwụanwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iji ọgwụ ndị ọrụugbo eme ọgwụ anwụnta ekwesighị ekwesị

Ọ sị: "Gbara ọgwụanwụ nwere chemicalụ ndị a na-akpọ 'organophosphosphate' nakwa 'carbamate' n'ihi na ihe ahụ dị n'ime ha mere ka ha na-egbunwu anwụ, ụchịcha na oke nwekwara ike igbụ mmadụ."

3. Yiri ihe n'aka na ị na-agba ọgwụanwụ

Ọgwụanwụ nwere ike ikuba n'ọnụ,n'imi nakwa metụta gị n'ahụ na ị na agba ya. Iji gbochi nke a, Oridota nyere ndụmọdụ ka ị yiri ihe n'aka, n'elu imi nakwa n'arụ gị oge ị na-agba ọgwụanwụ.

4. Nye ohere tupu ịlabanye n'ụlọ ị gbara ọgwụanwụ

Nyee ogologo oge iji chere ka ọgwụanwụ kusasịa tupu ịbanye hiee n'ụlọ ị gbara ọgwụanwụ.

Oridota dụrụ ọdụ ka, "Mepe windo gị na ma chee ogologo oge ma ịgbacha ọkwụanwụ tupu ịlaba ụra."

5. Edowela ihe oriri maọbụ ihe ọṅụụ na okpokoro ejibu tinye ọgwụanwụ

Ụfọdụ na-asa okpokoro ha ji debe ọgwụanwụ na kemikalụ ndị ọzọ were tinye mmanụ, mmiri na ihe ndị ọzọ a na-etinye n'ọnụ. Oridota kwuru: " Onwela ndị nwụrụ site n'ime ụdị ihe dị otu a."

6. Edowela nri, mmiri n'ebe ị na-edewe ọgwụanwụ

Oge ụfọdụ ndị mmadụ na hapụ nri na mmiri ha oghere mee ka ọgwụanwụ na hibanye na mmiri na nri a na-eri eri. Oridota kwukwara mkpa ọ dị ikuziri ndịọrụugbo ụzọ ha ga-eji chekwaa ihe ha kọrọ na-ejighị ajọ ọgwụ nwere ibanye na nri.

Akwa mgbochi anwụnta

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ịrahụ n'ime akwa mgbochi anwụnta bụ ụzọ kachasị mma igbochi ọrịa ịba

7. Jiri akwa mgbochi anwụta chụọ anwụ

Dịka ọkammụta Oridota siri kwuo, " Irahụ ụra n'ime akwa mgbochi anwụnta bụ ụzọ kachasị mma igbochi ọrịa anwụta."

Gee ihe Dkta Oridota kwuru na bekee:

Aha onyonyo, Dọkịta Ezekiel Oridota kọwara ụzọ aga-esi gbalahụ ọnwụịke site n'ọgwụanwụ

Akụkọ ga-amasị gị: