Gịnị mere akwụkwọ eji amaonye ndị Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Iwu pụtara n'afọ 2007 kwuru na onye Naịjiria dị afọ iri na isii were gawa ga-enwe akwụkwọ njiamaonye.
Maka ihe a, gọọmentị etiti mapụtara ngalaaba a kpọrọ National Identity Card Commision na bekee, maka ihu na onye ọbụla bụ nwaafọ Naịjiria nwere akwụkwọ njiamaonye a.
Mana kemgbe e wepụtara ụlọọrụ a, ọtụtụ ndị Naịjirịa enwebeghị akwụkwọ a.
Mgbọ nịịle BBC mere ịkpọ ụlọọrụ amịpụtaghị mkpụrụ makana akara ha anaghị agaaga.
Ihe ndị Naijirịa na-ekwu

Ebe foto si, Getty Images
BBC Igbo na ụfọdụ ndị Naịjirịa nwere mparịta uka, ha gwara anyị ihe agabigara oge a na-achọ ị nweta akwụkwọ eji amaonye a.
Bridget Chigbufue biri na Lagos gwara anyi na ya ata ezigbo ahụhụ. O kwuru na: "Mgbe m dere aha m, n'akwụkwọ a, a gwara m, na o ga-eru ọnwa abụọ, mana o ruola afọ ise enwebeghị m akwụkwọ a"
Oluchi Okwuone biri na Bini kwuru na ha enwebeghị ọtụtụ ụlọọrụ National Identity Card Commision na steetị ha. N'ọnụ okwu ya: "Oge ọbụla ị bịara ụlọọrụ ha, ị ga-ahụ ọtụtụ mmadụ ka nkụ, ihe a na-bọọ ụme."
Nnamdi Ojiego biri na Owerri gwara anyị na mpụ na aghụghọ ebieela omume a. O kwuru na: "ọtụtụ n'ime ndị a, na-echọ onye ga-enye ha ego"
O kwukwara na enweghị ọkụ bụ ihe ọzọ na-ebute nsogbu na ọrụ a. Ojiego kwuru na: "ọtụtụ oge ị bịara ebe a, anaghị enwe ọkụ, ịhea na-eme ka ị denye aha n'akwụkwọ anaghị aga ọsịsọ."
Isi ruo ọdụ n'akụkọ akwụkwọ eji amaonye a
Ọ bụ na n'afọ 1977 ka echiche ị mụpụta akwụkwọ eji amaonye buru isi bata n'obi gọọmentị.
N'afọ 2003, ụlọọrụ akporo National Civic Registration na bekee bidoro ị debe aha mmadụ n'akwụkw. Ha kwuru n'oge ahụ a dere aha mmadụ nde 54. Mana ebubo mpu na aghụghọ mebi omume a.
Ọ bụ n'afọ 2010, ka ngalaaba ọhụrụ a akpọrọ National Identity Card Commision bidoro ọrụ nke ha.
Onye na onye derela aha ha n'akwụkwọ a
Ugbua, dịka ozi NIMC wepụtara n'ọnwa Maachị 2018 si kwu, e debanyela aha mmadụ nde iri atọ n'akwụkwọ njiamaonye.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










