Dino Melaye: Ndị uweojii akpọgala ya Lokoja

Dino na ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images/Dino Facebook

Nkọwa foto, Ndị uweojii kwuru na ndị interpol bụ ndị na-enyocha Dino
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Okwu dị na-etiti ndị ọrụ nchekwa na Sinetọ na-anọchite ndị Kogi-West bụ Dino Melaye abala abali abụọ.

Taa bụ Tuusde, Melaye bụ ọbịa ngalaba ndị uweojii pụrụ iche na-ahụ maka mgbochi iji egbe ezu nke a kpọrọ SARS n'aha ịchafụ ndị kpachiri ya.

N' abalị Monde, BBC wetara ụnụ akụkọ na ndị uwe ojii wakporo ụlọ Melaye dị na Maitama dị n'Abuja ma gbochie ya.

Onwebeghị onye ma ebe egwu a gwara ọgwa a Melaye na ndị ọrụ nchkwa na-agba ga-ebi, mana otu onye ọrụ Melaye bụ Gideon Ayodele gwara BBC na ya bụ nwa amadi kwọrọ onwe ya ga n'ogige ndị uweojii taa bụ Tuusde.

"Ndị uweojii ruru nari abụọ wakpọrọ ụlọ Dino Melaye ma e kweghị ha bata n'ihi n' onweghị akwụkwọ ikike iji nwụchie ya.

Melaye kwụpụtara nke a n'igwe okwu Twitter.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'ụtụtụ taa, o jiri ụgbọala kwọrọ onwe ya ga na'ogige ndị uweojii iiji mata ihe ha na-ahụgharịrị ya n'ihi na onweghi ihe doro anya ha kwuru na o mere." ,

Cheta n' ụtụtụ Monde, a nwụchciri Melaye n'ọdọ ụgbọelụ dị n'Abuja oge ọ na-achọ ịga mba Moroko mana emechara hapụ ya.

Ihe onyonyo a na-egosi ebe Dino Melaye na ndị uweoji na-eme ihe

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

O kwuru na ndị uweojii gbochiri ụzọ niile e si abata maọbụ pụọ be ya.

O kwukwara na ndị uweojii juru na ọ gaghị eme njem ahụ mana akụkọ pụtara oge na-adịghị anya na ha ahapụla ya.

Ndị uweojii kwuru na a na-enyocha Dino maka na ndị gbapụrụ n'aka ha maka iwakpo Dino kpọrọ aha ya na ya bụ ihe mere.

Ndị uweojii atọhapụla Dino Melaye

Dino Melaye

Ebe foto si, Charles Mgbolu

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ