Naịjiria eruola 200m n'ọnụọgụgụ

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ ndị mmadụ na Naijiria bụ Eze Duruiheoma, ekwuola na ala anyị fọrọ nde abụọ ka o ruola nde nari abụọ (200m) n'ọnụọgụgụ.
E wepụtara ọnụọgụgụ ọhụrụ na New York ụbọchụ Tuuesde na ọgbakọ gbasara ọnụọgụgụ na mmepe mba ụwa agba nke iri ise.
Duruiheoma kwuru na a na-ele anya na Naijiria ga-abụ mba nke atọ kacha n'ọnụọgụgụ na mba ụwa n'afọ iri atọ na-abịa.
N'ọnwa gara aga, onye nnọchite anya mba Briten na Naijiria bụ Paul Arkwright, kwupụtara atụmuche na a ga -enwere 'nnukwu nsogbu oke ọnụgụgụ' ọkachasị dịka e nwere ọtụtụ ndị ntorobịa e nweghị ọrụ na ndị agụghị akwụkwọ , ebe ọtụtụ enweghị ohere nlekọta ahụike.
N' ngukọ ọnụọgụgụ Naijira nwere n'afọ 2006, e kwuru na Naijiria nwere ọnụọgụgụ mmadụ nde otu nari na iri anọ(140m).
Ka ihe dịka afọ iri gachara, ọbụzị mba nke asaa kachasị n'ụwa, nke pụtara na mmadụ iri anọ na atọ ọbụla n'ụwa bụ onye Naijiria.

Akụkọ ga-amasị gị:






