Naijiria kachasị atụbata mmanụ n'ụwa niile

Ebe foto si, AFP
Naijiria bụ sọsọ mba nọ na otu mba na-egwupụta mmanụ n'ala nke a kpọrọ OPEC n'aha ịchafụ nke na-atụbata mmanụ ụgbọala ma bụrụkwa mba kachasị na ịtụbata mmanụ ụgbọala n'ụwa niile.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmanụ na Naijira bụ NNPC n'aha ịchafụ bụ Maikanti Baru kwuru nke a n'Abuja ụnyaahụ na ọgbakọ 'Oloibiri Lecture Series' nke afọ 2018.
Baru, onye kwuru nke a site n'ọnụ Bello Rabiu bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ngwuputa mmanụ mgbe ọ na-aza ajụjụọnụ ndị bịara ebe ahụ jụrụ ya sị: " Ka anyị- ekwu taa,Naijiria bụ sọsọ mba OPEC na-atụbata mmanụ ụgbọala. Anyị bụkwa mba kachasị na ịtụbata mmanụ ụgbọala n'ụwa niile."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ọ gara n'ihu sị: "Anyị na-atụbata otu nde tọn kwa ọnwa n'ala na-egwupụta mmanụ na gaas ma nwekwa ụlọ na-esi mmanụ. ọ bụ ihe ihere. Onweghị uche dị na ya. ya mere anyị na-agba mbọ ileba ya anya."
'Oloibiri Lecture Series' bụ otu ndị inginia a kpọrọ'Society of Petroleum Engineers (SPE),' nke Naijria na-ahazi ya iji cheta onunu mmanụ mbụ e gwuru na Naijiria.





