Bọjetị: Enugwu steeti ekewapụtala ijeri naira 103 maka 2018

Eucharia Uche Offor na ndị omeiwu Enugwu steeti
Nkọwa foto, Kọmishọna na-ahu maka okwu ego na nkwalite akụ na ụba na Enugwu steeti, Eucharia Uche Offor, mgbe ọ na-akọwa Bọgetị ụnyaahụ n' Enugwu

Gọọmenti Enugwu steeti akọwaputala ka ha ga-esi were ego gbakọtara N103,563,500,000 wee ruo ọrụ n'afọ a bụ 2018.

Onye Kọmishọna na-ahụ maka okwu ego na nkwalite akụ na ụba nke Enugwu steeti bụ Eucharia Uche Offor kọwara na ya bụ ọkpụrụkpụ ego ọrụ bụ nke e nwere olileanya na ọ ga akwalite akụ na ụba Enugwu steeti na ebe o di ukwuu.

Ego ọrụ afọ 2017 ji obere ihe were karia nke 2018.

Gọọmeti kọwara na nke a ga-enyere gọọmenti aka iji usoro mkpachapụanya were kewasia ego ọrụ nke afọ a.

Enugwu steeti na- ele anya ị nweta ego karịrị ijeri naira iri ise na otu site n'aka gọọmenti etiti, ebe ha na-elekwa anya na ego a ga-enweta na steeti nke a kpọrọ 'internally generated revenue' ga-eru ijeri naira abụọ kwa ọnwa.

Ọ gbariri ya bụ nkọwa ọzọkwa kwa wee sị na mịnịstrị dị icheiche ga-eketa ego ọrụ a ma were ya rụọ ọrụ dịka gọọmenti steeti Enugwu siri kwado.

Ihe dika ndi ọrụ aka nọọrọ onwe ha nke a na-akpọ SMEs n'aha ịchafụ bụ nke gọọmenti ga-enyere aka ka ha wee gbaa mgbọrọgwu.

Ndị Kọmishọna dị icheiche nọ n'ọgbakọ ahụ zara ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ gbara ha banyere ka ha ga-esi were ego e nyere mịnịstrị ha rụọ ọrụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Onye Kọmishọna na-ahụ maka mmiri bụ Ọkaikpe COC Egungbe kwuru na kemgbe Governor Ifeanyi Ugwuanyi batara na ọchịchị, na ụlọ ọrụ ya na-agba mbọ ka mmiri na-agba ebe ọbụla n'ime Enugwu steeti.

Egumgbe gwara ndị Enugwu ka ha nwe ndidi maka na oge na-adịghị anya mmiri ga na-agbazi ebe ọ naghị agba na mbụ.

Kọmishọna na-ahu maka azụmahia na mmepụta ihe bụ Ogbu Nwobodo kwuru na Enugwu bụ steeti kacha dị mma mmadụ iguzobe ụlọ nrụpụtaihe nakwa azụmahia na Naijiria.

Ndị ọzọ zakwara ajụjụ ma kọwaa maka mịnịstrị nke ha.

Ihe Kọmishọna Uche Offor kwuru:

Kọmishọna Uche Offor gwupụtara na ha nwere olileanya na gọọmenti Enugwu steeti ga-eji Bọgetị afọ 2018 were nweta uru ndị a:

  • Akụrụngwa ụlọ na ụgbọala dịka o si dị naa mba mepere emepe.
  • Agụmakwụkwọ kacha mma, ahụike na ndị mmadụ na-arụpụta ihe ọrụ aka.
  • Ndị mmadụ na-enweghi nsogbu na-egekwanu goomenti nti.
  • Gburugburu ịdị ọcha.

•Ndị ọrụ oyibo mara ọrụ ha.

•Nakwa ime Enugwu ka ọ bụrụ ebe ndị jiegoachụego na-agbata, ndị azụmahia kwụrụ onwe ha na-abia ma nwetakwa ọmụrụnwa na usoro eji azụ ahịa dị mma.