Onyeisi ndị uweojii: Mepe ọdọ ehi tupu ị machie ịchịgharị ha

Ebe foto si, @PoliceNG
Onyeisi ndị uweojii kwuru nke a ụnyaahụ na kaduna na nzukọ ndị nchekwa obodo metụtara sịrị na ọ ga-enye aka igbara nsogbu na adapụta n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi.
Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu dapụtara na Benue bụ maka na gọọmenti steeti ahụ ehibeghị ọdọ ehi tupu ha machie ịchịgharị ehi
Na nzukọ ahụ nke isi okwu ya bụ, "Nkwalite obodo: Nsogbu nchekwa na mkpa ọ dị ịchọta ụzọ zuru oke ịkwụsị ya,"nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi ebidoghị n'oge ọchịchị onyeisiala bụ Muhammdu Buhari.
Idris kwuru sị:"N'uche m, iji belata ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi, gọọmenti steeti ga-agba mbọ wuo ebe ọzụzụ ehi na steeti ha tupu ha eme iwu ikwụsị ịchịgharị ehi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






