Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa
Ayatolla Khamenei: Ndị n'ọchị, ndị n'-akwa dịka e gburu onye ndu mba Iran na mwakpo Amerịka na Izrel mere Iran
Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị Iran na-akwa arịrị, ebe ụfọdụ na-enwe anwụrị dịka akụkọ kwuru na e gbuola Onyeisiala Mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei na mwakpo nke mba Amerịka na Izrel jikọrọ aka mee ụbọchị Satode.
Ihe onyonyo BBC Persia nyochara gosiri ndị mmadụ na-aṅụrị na-apị opi ụgbọala ha n'ọtụtụ obodo mepere emepe dị na mba Iran.
Ihe onyonyo ọzọ gosiri ebe ndị mmadụ gbakọrọ n'okirikiri ọkụ a mụnyere na-agba nọkawụtụ.
Ọtụtụ ndị ezinaụlọ e gburu ndị nke ha na ngagharịiwe na nsonso a nọkwa n''ụlọ ha enwe aṅụrị.
Onyendu kachasị n'Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei anwụọla na mwakpo Amerịka na Izrel wakporo Ịran
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ
mgbasaozi n’Ịran ekwuola na onyendu kachasị n’Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei
anwụọla na mwakpo mba Amerịka na Izrel wakporo Ịran n’ụbọchị Satọde 28
February, 2026.
Onyeisiala
Donald Trump kọwara Khamenei dịka ajọ mmadụ ma kpọ oku ka ndị mba Ịram weghara
mba ha.
Ka ọ dị
ugbua a, ọtụtụ ndị mba Ịran jupụtara n’ụzọ na-ene aṅụrị maka ọnwụ
Khamenei ebe otu onye gwara BBC na ọnwụ Khamenei pụtara na ‘ụwa adịla mma’.
Ụlọọrụ Red Crescent kwuru na ihe ruru mmadụ 200 anwụọla
n’Ịran ebe ihe ruru mmadụ 108 nwụrụ oge Amerịka na Izrel tụrụ ogbunigwe n’ụlọakwụkwọ
ụmụnwaanyị.
Ebe foto si, Reuters
Ebe foto si, Getty Images
Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ọma Igbo ndị ọma
Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 1 Maachi, 2026.
Ọfọ anyị bụka ọnwa ọhụrụ a mịtara gị ezi mkpụrụ.
Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.