Etu agha Amerịka na Izrel na-ebuso Ịran si emetụta ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa

Kemgbe mba Amerịka na Izrel bidoro ibuso ndị Ịran agha, akụnụba mba ụwa bidoro na-agbanwe ọkachasị ọnụahịa mmanụ ụgbọala.
Na Naịjịrịa, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bidoro na-arị elu. Nke a bidoro igosipụta n'ihe dịka abalị nke ise maọbụ asaa agha Amerịka na Izrel na-ebuso mba Ịran malitere.
N'ime akụkọ a, ụlọmgbasaozi BBC News Igbo nnyochara ọnụahịa mmanụ ụgbọala na steeti dị iche iche na Naịjirịa ugbu a nakwa etu o si arị elu.
Ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịala n'Enugwu mana ọ dịghị ụkọ

N'Enugwu steeti, ọnụahịa a na-ere mmanụ ụgbọala tinyere ego ugbua. Nke a bidoro n'abalị garaaga na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ.
BBC News Igbo gara n'ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'ebe Independence layout nakwa Ogui ma chọpụta na ha na-erezị mmanụ ụgbọala narị naịra itoolu na iri asatọ (N980) maọbụ narị naịra itoolu na iri asaaa (N970).
N'oge akụkọ a na-apụta, enweghị ihe dịka ụkọ mmanụ ụgbọala n'Enugwu Steeti.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala dị na Riva steeti ugbua

Nnyocha BBC News Igbo mere na Riva steeti gosiri na oge gara aga, na a na-ere mmanụ ụgbọala na steeti ahụ ihe dịka narị naịra asatọ na iri isii na anọ na ụma (N864.9).
Mana ihe a na-ere ya ugbua bụ narị naịra itoolu na iri anọ na itoolu na ụma (N949.9).
Ihe dị iche bụ na ego manyere n'elu ya bụ narị iri asatọ na ise (N85).
Mpaghara ebe anyị mere nnyocha gụnyere n'ebe a na-ere mmanụ ụgbọala na Pọtakọt ọkachasị mpaghara ebe a na-akpọ Station Road.
Ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala dị na Kano Steeti

Na Kano steeti, BBC News Igbo chọpụtara na a na-erebu mmanụ ụgbọala ọnụahịa narị naịra asatọ na iri asatọ mana ugbua, a na-erezi ya ọnụahịa narị naịra itoolu na iri asatọ.
Nke a, gosiri na ọnụahịa mmanụ ụgbọala tinyere otu narị naịra na steeti ahụ.




























