Gịnị sere okwu n'etiti ụlọọrụ Dangote Refinery na ndị ọrụ mmanụ agbịdị PENGASSAN?

Ndị ọrụ PENGASSAN alọghachitela n'ọrụ ha dịka kagburu abụbụọrụ ha mgbe gọọmenti Naịjirịa wetere nkwekọrịta udo n'etiti ha na ụlọọrụ Dangote.

Ebe foto si, Getty Images/ PENGASSAN/X

    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Kemgbe izuụka gara aga ka akụkọ banyere esemokwu dị n'etiti ụlọọrụ nrụpụta mmanụ ụgbọala Dangote Refinery na ndị ọrụ mmanụ agbịdị Naịjirịa a kpọrọ Petroleum and Natural Gas Senior Staff Association of Nigeria (PENGASSAN), na-efegharị ebe niile.

Esemokwu a mere ka otu ndị ọrụ ahụ gbaa abụbụọrụ ihe karịrị abalị abụọ ebe otu ndị ọrụ Naịjirịa dọkwara aka na ntị na ha ga-esonye n'ịgba abụbụọrụ ahụ ma ọ bụrụ na emeghị ihe ọbụla banyere ya.

Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ PENGASSAN alọghachitela n'ọrụ ha dịka ha kagburu abụbụọrụ ha mgbe gọọmenti Naịjirịa wetere nkwekọrịta udo n'etiti ha na ụlọọrụ Dangote.

Ụlọmgbasa ozi BBC News Igbo amalitela nkesa ozi n'ọba ozi WhatsApp Chanelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo WhatsApp Chanelụ

Etu esemokwu ahụ siri bido

Nchọpụta anyị mere gosiri na esemokwu malitere n'etiti ndị ọrụ na ụlọọrụ Dangote mgbe ụfọdụ ndị ọrụ sonyere n'otu ndị ọrụ mmanụ agbịdị Naịjirịa, bụ nke megidere iwu nke ụlọọrụ ahụ.

Ụlọmgbasaozi ndị e nwere na Naịjirịa kwuru na ndị ọrụ Dangote sonyere otu PENGASSAN n'ihi ọtụtụ afọ mmụọ ịjụ oyi n'ihi ọnọdụ ọrụ a dịghị mma na ụgwọ ọnwa a naghị agbanwe agbanwe.

E kwuru na ọtụtụ ndị isi ụlọọrụ Dangote na-ezere isonye n'otu ahụ n'ihi na ha binyere aka na nkwekọrịta megidere ịbanye n'otu ọbụla tupu ha amalite ọrụ.

Mana n'ihi nkwekọrịta nke wepụrụ mmachi dị etụ ahụ, otu PENGASSAN gakwuuru ha ọzọ ka ha sonyere ya.

Dịka ndị otu ọrụ ahụ siri kwuo, ndị ọrụ mmanụ gụnyere gaasị nwere usoro ịkwụ ụgwọ mbaụwa nke ịbanye n'otu ahụ ga-enyere ha aka ịgba mbọ maka irite uru ndị ahụ.

E kwuru na ọ tụrụ ndị isi ụlọọrụ Dangote n'anya na mmadụ otu puku binyere aka isonye otu ahụ n'ihe ruru awa abụọ n'ụbọchị mbụ.

A sịrị na ọnọdụ ahụ kawanyere njọ mgbe akụkọ malitere ifegharị na ndị mba ofesi na-arụ n'ụlọọrụ ahụ na-eri ụgwọ buru oke ibu nke ụlọọrụ ahụ manyekwara ego na ya.

N'oge na-adịghị anya, ụlọọrụ Dangote chụrụ ndị ọrụ ruru narị asatọ n'ọrụ.

Ịchụ ndị ọrụ mmadụ narị asatọ n'ọrụ

Esemokwu dị n'etiti ụlọọrụ Dangote na ndị ọrụ mmanụ agbịdị PENGASSAN kawanyere njọ mgbe ụlọọrụ Dangote chụrụ ndị ọrụ narị asatọ n'ọrụ ma kwuo na ọ bụ maka ọdịmma nke ụlọọrụ ahụ.

N'ozi nke Onyeisi nchịkọta ndị ọrụ nke ụlọọrụ Dangote nyere ndị ahụ ha chụrụ n'ọrụ, o kwuru na ọrụ ha ga-akwụsị na 25 Septemba 2025 iji chekwaa ụlọọrụ ahụ ma hụ na ọ kwụsiri ike ogologo oge.

Femi Adekunle kwuru na ọ ga-echekwa ụlọọrụ a na-arụpụta mmanụ ụgbọala site na aka ndị chọrọ imejọ ya na ụdị nwereike ịkwalite nsogbu nchekwa ma mebie arụmọrụ nke ụlọọrụ ahụ.

Kedụ ihe ndị ọrụ PENGASSAN mere maka ndị otu ha a chụrụ n'ọrụ?

Mgbe ụlọọrụ Dangote chụchara ndị ọrụ ya, PENGASSAN gwara ndị otu ha ka ha kpasasịa ọrụ ụlọọrụ Dangote Refinery site n'igbochi ibunye ha mmanụ gaasị na ịgba abụbụọrụ.

Ndị ọrụ a gbara abụbụọrụ ihe dịka abalị atọ, kwuru na mkpebi ha bụ nzaghachi maka mkpebi ụlọọrụ Dangote nwere ịchụ ụfọdụ ndị ọrụ bụ ndị otu ha n'ọrụ.

Otu ahụ boro ụlọọrụ Dangote ebubo ịgbasa ozi na-ezighi ezi iji kwado omume ya.

Ụlọmgbasaozi ndị e nwere na Naịjirịa kwukwara na ndị otu PENGASSAN boro ndị isi ụlọọrụ Dangote ebubo ịkpa oke megide ndị ọrụ bụ ụmụafọ Naịjirịa.

Na nzaghachi, ụlọọrụ Dangote kwuru na o nweghị ikike iwu kwadoro PENGASSAN ịkpaghasị maọbụ itinye aka na nkwekọrịta nke ụlọọrụ ahụ na ndị ọzọ na-ere mmanụ agbịdị gaasị nwere.

Ụlọọrụ Dangote gakwara n'ihu kpọọ gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa oku ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ma dozie ndị ọrụ PENGASSAN olu.

Gịnị ka gọọmenti etiti mere maka okwu a?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Tupu ndị ọrụ ahụ amalite ịgba abụbụọrụ n'ụbọchị Mọnde 29 Septemba 2025, ndị otu kọmitii na-ahụ maka ngwupụta mmanụ ala 'Downstream' n'ụlọ nnọchiteanya kpọrọ PENGASSAN ka ha kwụsịtụ oku ịkwụsị ibuga gaasị na mmanụ agbịdị n'ụlọọrụ Dangote.

N'aka nke ọzọ, Gọọmenti Etiti kpọkwara oku ka ndị ọrụ ahụ ghara ịgba abụbụọrụ nke ha chọrọ ịmalite.

Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Muhammad Dingyadi, kwuru na mịnịstrị ya na-agba mbọ iji mee ka e gbochie nsogbu ahụ.

N'agbanyeghị mbọ ndị a, PENGASSAN malitere ịgba abụbụọrụ n'ụtụtụ Mọnde 29 Septemba 2025, mechie ebe esi abanye ụlọọrụ nke Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPC Ltd), Nigerian Midstream na Downstream Petroleum Regulatory Authority (NMDPRA), na Nigerian Upstream Petroleum Regulatory Commission (NUPRC).

N'ihi nke a, ụlọọrụ Dangote weere okwu a gaa ụlọikpe na-ahụ maka ndị ọrụ n'Abuja ụbọchị Mọnde inwete ikike iwu ga-akwụsị PENGASSAN ịga n'ihụ na-agba abụbụọrụ megide ụlọọrụ ya.

Ụlọikpe ahụ gbochiri PENGASSAN ịga n'ihu kwụsị ibuga mmanụ agbịdị na gaasị n'ụlọọrụ Dangote Refinery.

Mana ka abalị abụọ gachara, ndị ọrụ PENGASSAN kwụsịrị ịgba abụbụọrụ ahụ dịka ha na ụlọọrụ Dangote nwere nkwekọrịta na nzukọ Gọọmenti Etiti Naịjirịa haziri.

Gịnị dị n'ime nkwekọrịta ụlọọrụ Dangote na PENGASSAN nwere?

Ndị ọrụ mmanụ agbịdị na ụlọọrụ Dangote kwekọrịtara na isonye n'otu ndị ọrụ bụ ikike ndị ọrụ dịka iwu Naịjirịa siri dị ma kpebie na a ga-asọpụrụ ikike ahụ.

Ha kpebikwara na ụlọọrụ Dangote ga-amalite ozugbo, usoro ịkpọga ndị ọrụ a chụrụ n'ọrụ n'ụlọọrụ ndị ọzọ Dangote nwere.

Ha kwukwara na a gaghị ewepụ ụgwọọrụ maọbụ megbuo ndị ọrụ n'ihi esemokwu dị n'etiti Dangote na PENGASSAN.

Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ ahụ kwuru na ha ga-amalitekwa ịgba abụbụọrụ na-adọghị aka na ntị ma ọ bụrụ na ụlọọrụ Dangote emezughị ihe dị n'akwụkwọ nkwekọrịta ahụ.

Onyeisi otu ndị ọrụ ahụ bụ Festus Osifo, dọrọ aka na ntị a mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu banyere nkwụsị ịgba abụbụọrụ n'ụbọchị Wenezde abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.