Ana m akwado emume ịgbape ụlọahịa m n'ụbọchị Mọnde, ọkụ agbarie ya n'ụbọchị Sọnde

Otu onye n'ime ndị ọkụ gbara ụlọahịa aha na 36 New Umuahia Road, dị n'Ogbor Hill, Aba, Abịa steeti bụ Maazị Prosper Ukoha akọwaala etu ọkụ siri bibie ngwaahịa ya niile n'ụbọchị Sọnde 28 Septemba, 2025.
Ọ gwara onye ntaakụkọ BBC News Igbo na ngwongwo niile dị n'ụlọahịa ya, nke o ji ihe karịrị nde naịra iri abụọ na asaa malite, lara n'iyi n'ọkụ ahụ.
Maazị Ukoha kwuru na ọ na-akwado ime mmemme mgbape ụlọahịa ọhụrụ ya ahụ n'ụbọchị na-esote ụbọchị ahụ ọkụ gbara bụ Mọnde, ebe ọ kpọọlarị ndị enyi na ndị ọma ya ka ha bịa soro ya mee mmemme ahụ, tupu ajọ ọdachi a emee n'ụbọchị Sọnde.
Ọ kọwara ihe merenụ dịka ihe na-agbawa obi ma karịkwa ike ya na ndị ọzọ ọ dakwasịrị ma ọ bụrụ na gọọmentị etinyeghị aka.
Ndị ahụ ọdachi dakwasịrị rịọsiri Gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti, na ndị ọzọ nwere ezi obi ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka, na-agbakwụnye na ọ gaghị adịrị ha mfe ibilighachi ọzọ ma ọ bụrụ na enyemaka abịaghị.
Ndị bi n'ogbe ahụ kpọkukwara gọọmentị ka ha mesie iwu gbasara nchekwa ọkụ ọgbụgba ike ma kwalite usoro ịgbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka n'Aba, iji gbochie ihe dị etu a ime ọzọ n'ọdịnihu.

Etu ọkụ siri bibie ngwaahịa ruru ọtụtụ nde naịra n'Aba
Ọkụ gbariri ọtụtụ ụlọahịa na 36 New Umuahia Road, dị n'Ogbor Hill, Aba, Abịa steeti ma bibie ngwaahịa ruru nde kwuru nde naịra.
Ọdachi ahụ mere n'ụbọchị Sọnde 28 Septemba 2025.
Nnukwu ọkụ a, nke ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na ọ malitere n'ihe dịka elekere abụọ nke ehihie bụ nke e chere na o si na ngwaọrụ ji ikike anyanwụ emepụta ọkụ latrik dị n'otu n'ime ọnụụlọahịa ndị ahụ malite tupu o gbasaa ọsịịsọ n'ụlọ ahụ niile.
Ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ mechara rute ma menyụọ ọkụ ahụ, mana ọkụ ahụ emebiela ọtụtụ ihe tụpụ ha erute, ebe akụnaụba na ngwongwo ruru ọtụtụ narị nde naịra rekpọrọ ma ghọọ ntụ.
Ndị ọdachi ọkụ ọgbụgba metụtara ụlọahịa ha na 36 New Umuahia Road, dị n'Ogbor Hill, Aba, akpọkuola Gọọmentị Abịa steeti na ndị nwere ezi obi ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ngwa ngwa iji nweeike bidoghachi azụmahịa ha.











