'Ụgbọmmiri ha kpuru mgbe ọ kụrụ ihe dịka 8:30 nke abalị oge ha na-aga Ugwunagbo maka mbọmchi'

Ọ kọwara na ụgbọmmiri ha nwere oghere n’okpuru, dịka mmiri si ebe ahụ banye n’ime ya, nke mere ka o kpuo.
Nkọwa foto, Chimgozirim Benson bụ nwanne Chikezie, onye bụ otu n'ime ụmụokoroọbịa ndị nwụrụ oge ụgbọmmiri ha kpuru n'Abịa steeti.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị obodo Umuejea, Okuenyi na Akpaa Mbato dị n'okpuru ọchịchị Obingwa n'Abịa steeti agaala n'ihu na-eru uju maka ụmụokoroọbịa ha ise nwụrụ n'osimiri oge ha na-aga nche abalị n'Ugwunagbo.

Oge onye ntaakụkọ BBC garuru n'obodo ahụ, ụfọdụ ndị ọdachi ahụ metụtara kọọrọ ya ihe ha maara gbasara ya bụ ọnọdụ.

Chimgozirim Benson kwuru na nwanne ya bụ Chikezie so n'ime mmadụ asaa ndị na-aga ịmụ anya abalị maka akwamozu nwanne ha nwaanyị a lụrụ n'Ugwunagbo tupu ụgbọmmiri ha ekpuo n'osimiri.

"Ha si ụzọ mmiri mee njem ahụ ka ije ha nweeike dị mfe, mgbe o jiiri ihe dịka ọkara gaa elekere asatọ nke abalị," ka Chimgozirim kọọrọ BBC

Ọ kọwara na "ụgbọmmiri ha nwere oghere n'okpuru, dịka mmiri si ebe ahụ banye n'ime ya, nke mere ka o kpuo."

"Mmadụ abụọ maara ka e si egwu mmiri mapụrụ, nke mere ka a napụta ha na ndụ. Aha ha bụ Uzoenyi Nwankoba Omenazu na Enyinwoke Enyinwoko," ka o kwuru.

Ọ sịrị na Chikezie, onye Akpaa Mbato, lụrụ nwunye ma mụta ụmụ ise tupu ọnwụ ya.

Ọ kọwara na ndị obodo mere ụfọdụ omenala oge e bupụtara ozu mmadụ ise ahụ n'osimiri ma liekwa ha n'akụkụ mmiri dịka ọdịnaala siri dị.

'Di m amaghị na ha ga-esi ụzọ mmiri aga mbọmchi'

O kwuru na ya na di ya ebiela afọ iri na atọ ma mụtakwa ụmụ ise. Dịka o siri kọwaa, nwa ha nke mbụ dị afọ iri na atọ ebe nke obere dị otu afọ na ọnwa isii.
Nkọwa foto, Ngozi Chikezie bụ nwunye otu n'ime ụmụokoroọbịa ndị nwụrụ n'osimiri oge ha na-aga mbọmchi n'Abịa steeti

Nwunye otu n'ime ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ Ngozi Chikezie boro ebubo na ọ bụ otu n'ime ndị ha na di ya sooro banye ụgbọmmiri mere ka ụgbọ ha kpuo n'osimiri.

O kwuru na a chọtara ọtụmọkpọ n'ime akpa nwoke ahụ oge e bupụtara ozu ha n'osimiri.

Ngozi kọwara na di ya amaghị na ọ bụ ụzọ mmiri ka ha ga-esi mee njem ahụ maka na e nwere onye ndị obodo nyere ego a ga-eji gbaara ndị na-aga mbọmchi ahụ ụgbọ.

"Di m gwara m na a sị a ga-ewepụtara ha ego ụgbọ mana oge ha gbakọrọ, ndị e nyere ego ekweghị ewepụta ya. Ọ bụzi otu nwata nwoke so ha eme njem ahụ kwupụtaziri na ha ga-eji ụgbọmmiri gaa.

O kwuru na ya na di ya ebiela afọ iri na atọ ma mụtakwa ụmụ ise. Dịka o siri kọwaa, nwa ha nke mbụ dị afọ iri na atọ ebe nke obere dị otu afọ na ọnwa isii.

Ọ rịọrọ gọọmenti na ọhanaeze ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka iji nyere ya aka zụọ ụmụ ya ise n'ihi na e nweghị ihe bara uru ọ na-eme e wezuga ịkọ ugbo.

Ụmụokoroọbịa ise anwụọla oge ha na-aga mbọmchi n'Abịa steeti

Dịka ozi anyị nwetara siri kọwaa, ụmụokoroọbịa ahụ nwụrụ oge ụgbọmmiri ha kpuru n'osimiri.

Ebe foto si, Maxwell Nwadike

Nkọwa foto, Dịka ozi anyị nwetara siri kọwaa, ụmụokoroọbịa ahụ nwụrụ oge ụgbọmmiri ha kpuru n'osimiri.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nnukwu ihe anyammiri mere n'obodo Umuejea, Okuenyi na Akpaa Mbato dị n'okpuru ọchịchị Obingwa n'Abịa steeti n'ihi ụmụokoroọbịa ise nwụrụ n'obodo ha.

E kwuru na ha bụ ụmụokoroọbịa ise nwụrụ oge ha na-aga ịmụ anya abalị maka akwamoozu n'obodo Umunkamma dị n'okpuru ọchịchị Ugwunagbo na steeti ahụ.

Dịka ozi anyị nwetara siri kọwaa, ụmụokoroọbịa ahụ nwụrụ oge ụgbọmmiri ha kpuru n'osimiri.

Ihe ọdachi ahụ mere n'osimiri Aza n'ụbọchị Tọzde 29 Mee 2025 oge ụmụokoroọbịa ahụ chọrọ iji ụgbọmmiri gafee obodo Epomiri Ovom Ama Asaa dị n'Obingwa ma banye n'obodo Umunkamma dị n'Ugwunagbo.

Ụfọdụ kwuru na mmadụ abụọ n'ime ụmụokoroọbịa ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị obodo Umuejea, abụọ ndị nke ọzọ abụrụ ndị Okuenyi ebe otu bụ onye Akpaa Mbato dị n'Obingwa.

Ozi rutere anyị aka kwuru na ngwangwa ndị obodo nwetara ozi gbasara ihe ọdachi ahụ, ha gbapụrụ ọsọ gaa ịnapụta ha bụ ụmụokoroọbịa mana mbọ niile ha gbara amịtaghị mkpụrụ ọbụla.

Mana ndị ọrụ nnapụta ahụ mechara si n'ime osimiri bupụta ozu ha ka chi bọrọ.

Ka ọ dị, onye Mayor okpuru ọchịchị Obingwa bụ Maxwell Nwadike akọwaala ọnọdụ ahụ dịka eziokwu.

Nwadike kwuru sị "ihe a bụ ụmụokoroọbịa ọbara ndụ juru ahụ ma bụrụkwa ndị ọnwụ ha tinyerela ezinaụlọ ha na obodo ha na nnukwu iru uju."

Ọ kasiri ezinaụlọ mmadụ ndị nwụrụ anwụ obi tinyekwara ụmụafọ okpuru ọchịchị Obingwa niile ma kwee nkwa ịrọpụta enyemaka ndị o nwere ike ya n'oge nsogbu a.