Ihe ndị obodo kwuru gbasara nwoke mụnyere ezinaụlọ ya ọkụ n'Abịa steeti
Ụfọdụ ndị agbataobi na ndị obodo Asa Umudioka dị n'okpuru ọchịchị Osisioma Ngwa n'Abịa steeti akọwaala ihe ha maara gbasara Ugochukwu a sị mụnyere nwunye ya na nwa ya na-aṅụ ara ọkụ.
Ha kwuru na e nweela mgbe nwoke ahụ chọrọ igbu nwunye ya mana ha gbara mbọ napụta ya ma gwa ya ka ọ lakuru ndị mụrụ ya, mana Ugochukwu gara kpọghachite ya.
Otu nwoke sị na ụfọdụ mmadụ kwuru na Ugochukwu gwara ha na ihe mere ya na nwunye ya ji ese okwu bụ n'ihi na ọ na-ejikarị ekwentị aza oku nzuzo.
Ka o sinadị, ha kwuru na Ugochukwu a na-etu "Ude Papa" mechara nwụọ dịka nwunye ya na nwa ya nwụchara n'ihi ọkụ ọ mụnyere ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka Desmond sị na "nnyocha na-aga n'ihu".
Ihe anyị ma maka nwoke gbara nwunye ya na ụmụ ya ọkụ maka nri n'Abịa steeti

Arụ mere n'obodo Asa Umudioka dị n'okpuru ọchịchị Osisioma Ngwa, n'Abịa steeti ebe otu nwoke wụrụ nwunye ya na ụmụ ya mmanụ ụgbọala, ma mụnye ha ọkụ n'etiti abalị mgbe ha nọ na-ehi ụra.
Dịka ndị hụrụ ihe merenụ siri kọọ, nwoke ahụ ha kpọrọ Ugochukwu, onye a na-etu "Ude Papa", na-arụpụta akpụkpọụkwụ n'ahịa Arịarịa dị n'Aba.
Ha kọrọ na ọ bụ nwaafọ obodo Umuogbala, Ọnịcha Ngwa, nke dị n'okpuru ọchịchị Obingwa, Abia steeti ma biri n'obodo Umudioka ebe ọ nọrọ kpaa ya bụ arụ.

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'obodo ahụ, ndị agbataobi kọrọ na Udochukwu lọtara n'uhuruchi ụbọchị ahụ na-aba mba na nwunye ya bịara n'ụlọọrụ ya ma kpagharịa ya maka ego nri.
Ha kwuru na Udochukwu biliri n'etiti abalị wụọ mmanụ ụgbọala n'ime ụlọ ebe nwunye ya nwa ya nke obere dina ma mụnye ha ọkụ n'oge ha ka na-ehi ụra.
Ọkụ ahụ gbagburu nwa ya nke ntakịrị ka na-aṅụ ara nakwa nwunye ya.
Akụkọ kọrọ na ya onwe ya bụ Udochukwu mechara nwụọ ka chi bọrọ, ebe ihe kpatara ọnwụ ya bụ nke na-edochaghị anya.
Dịka ndị obodo siri kwuo, ọnọdụ ahụ ebuterela ha nnukwu mwute, ebe ha kwusiri ike na nwaamadị ahụ abụghị onye obodo ha, kama, na ọ bụ onye bịara abịa bi n'obodo ha.
Ha kwukwara na nwunye ya ahụ ọ gbara ọkụ bụ onye Ụmụahịa, bụ isi obodo Abịa steeti.
Oge BBC News Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka Desmond, ọ sịrị na "nnyocha na-aga n'ihu".










