Etu ndị uweojii siri wakpoo ogige mkporindụ m - Onye hibere De Latinos Concept Ụmụahịa

Ebe foto si, Mazi Emmanuel Okenini, CEO DE LATINOS Lounge
Onye hibere ogige mkporindụ De Latinos Concept bụ Maazị Emmanuel Okenini akọwaala ihe mere n'ụbọchị ahụ ndị uweojii wakporo ụlọahịa ya.
Okenini kwuru na ya nọ n'ime ụlọ nụ ka a na-eme mkpọtụ n'ezi nke mere ka ọ malite ịjụ ase gbasara ihe na-eme.
Dịka o siri kwuo, ọ chọpụtara na ndị ọrụ ya jụrụ inye onye uweojii yi uwe nkịtị ohere ịbanye n'ogige mkporindụ ha maka na o ji anụ 'suya', bụ nke megidere iwu ha.
Ọ sịrị "ndị ọrụ m gwara onye uweojii ahụ na anaghị eji ihe oriri maọbụ ihe ọṅụṅụ abata n'ogige mkporindụ anyị mana ọ jụrụ ige ntị".
"Ọ mara onye nche m ụra oge o gbochiri ya ịbata, onye nche m amagwara ya, ha amalite ịlụ ọgụ."
Okenini sịrị na oge ha lụchara ọgụ, onye uweojii ahụ kpọrọ ndị otu ya si na ngalaba "Operation Crush" ha bịa kpụrụ onye nche ya wee gawa n'ụlọọrụ ndị uweojii, ebe ọ sị ha nọọrọ tie ya ihe ma kpọchie ya n'ụlọnga.
"Ka e mesịrị ha bụ ndị uweojii buuru ụgbọala atọ lọghachi ma malite ịgba ndị mmadụ anwụrụ ose," ka Okenini kwuru.
Etu a sị ndị uweojii siri wakpoo ogige mkporindụ De Latinos Concept dị n'Ụmụahịa

Ebe foto si, Mazi Emmanuel Okenini, CEO DE LATINOS Lounge
A wakporo ogige mkporindụ a ma ama bụ De Latinos Concept dị n'Ụmụahịa isi obodo Abịa steeti n'abalị Sọnde 9 Maachị 2025.
Ọnọdụ ọgbaaghara ahụ mere ka e bibie ọtụtụ ngwongwo ma merụọ ụfọdụ mmadụ ahụ.
Akụkọ sịrị na nsogbu malitere oge a jụrụ inye onye uweojii yi uwe nkịtị ohere ịbanye n'ogige mkporindụ ahụ maka na o ji anụ 'suya'.
Ha kwuru na iwu ha megidere mmadụ iji ihe oriri maọbụ ihe ọṅụṅụ abanye n'ogige mkporindụ ahụ.
Akụkọ ahụ gara n'ihu kwuo na iwe were onye uweojii ahụ dịka a sị na ọ kpọrọ ndị otu ya, bụ ndị wuchiri n'ogige ahụ, malite iti ndị nche ha ihe ma na-agbakwa onye niile nọ ebe ahụ anwụrụ ose.
Ndị niile aka ha dị na mwakpo e mere De Latinos Concept ga-anata ntaramaahụhụ - Gọvanọ Otti

Ebe foto si, Alex Otti/X, Mazi Emmanuel Okenini, CEO DE LATINOS Lounge
Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela iwu ka kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ chọpụta ndị aka ha dị na mwakpo e mere n'ogige mkporindụ De Latinos Concept dị n'Ụmụahịa.
Oge ọ na-ekwu okwu gbasara ọnọdụ ahụ site n'ozi onye enyemaka ya pụrụ iche maka mgbasaozi bụ Ferdinand Ekeoma, Gọvanọ Otti ṅụrụ iyi ịhụ na e kpere mmadụ niile aka ha dị na mwakpo ahụ ikpe iji bụrụ ihe mmụta nye ndị ọzọ.
Ekeoma sịrị "Gọvanọ Otti chọrọ ikweghachi ndị Abịa nkwa na gọọmenti ya dị njikere ikepụta gburugburu dị mma maka ndị na-azụ ahịa n'ụzọ iwu kwadoro. N'ihi ya, ọ gaghị afanye aka n'ụkwụ na-ele ka ndị ebughị ọdịmma steeti anyị n'obi na-etinye ụjọ n'ime obi ndị nwere ụlọahịa nakwa ndị bi na steeti a."
Gọvanọ Otti zigakwara Osote Gọvanọ bụ Ikechukwu Emetu ka ọ gaa leta ma kasie ndị isi na ndị nlekọta De Latinos obi n'aha ya onwe ya na gọọmenti Abịa steeti.
Ihe ndị uweojii kwuru maka mwakpo onye ọrụ ha mere De Latinos Concept

Ebe foto si, @PoliceNG/X, Mazi Emmanuel Okenini, CEO DE LATINOS Lounge
N'okwu nke ya, kọmịshọna ndị uweojii Abịa steeti bụ Danladi Isa gosiri nchegharị maka ihe ahụ merenụ ma kọwaa ya dịka nke a pụrụ igbochinwu.
O kpuhere na anwụchiela ndị uweojii aka ha dị na mmetọ ahụ dịka a na-agba ha ajụjụ n'ụlọọrụ ndị uweojii.









