"Ana m ekele Gọvanọ Soludo maka ịmachi ndị 'okeite' na 'ezenwaanyị n'Anambra Steeti"

Aha onyonyo, Etu ị ga-esi chọpụta nke bụ ndị amụma ụgha - Onye oziọma Ebuka Obi
"Ana m ekele Gọvanọ Soludo maka ịmachi ndị 'okeite' na 'ezenwaanyị n'Anambra Steeti"
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter & Video Journalist

Onye oziọma a ma ama nke nwe ụlọekpere Zion Ministry dị na Legọs bụ Ebuka Obi ekwuola ihe mere ụfọdụ ndị okpukperechi Kraịst ji adabanye n'aka ndị amụma ụgha

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Onye oziọma Ebuka Obi kwuru na onye amụma ọbụla gwara gị weta ego tupu o kpere gị ekpere bụkwa onye dibia yiiri akwa ụka.

"Onyinye Chukwu bụ n'efu ka anyị nwetara ya, ọ bụkwa n'efu ka anyị ga na-enye ndị ọzọ."

Ọ katọrọ ndị na eme bi aha ụka site na "ime Assignment", ha na-aga achụ aja na mmiri, na asa ụmụ nwaanyị ahụ maka ịchụ ajọ mmụọ, o kwuru na ndị n'eme nkea abụghị ndị ụka.

Ebuka Obi
Nkọwa foto, Ebuka Obi

"Ana m ekele Gọvanọ Soludo maka ịmachi ndị 'okeite' n'Anambra Steeti"

Onye ekpere ama ama bụ Evangelist Ebuka Obi ekwuola na obi dị ya nnukwu ụtọ maka agha Gọmenti Anambra n'ebuso ndị ajọ Dibia ugbua, n'ihi na Okeite ha na-agwọ emebisiela ala Igbo.

Ebuka Obi kwuru ihe ndị a n'oge anyị na ya nwere mkparịtaụka n'ụlọ ekpere ya bụ Zion ministry.

"N'ezie ọ bụrụ na m nwere akara ekwe ntị Gọvanọ Chukwuma Soludo, agara m akpọ ya , kelee ya , kwe ya n'aka maka atụmatụ oma o wepụtara ịjide ndị niile n'agwọ okeite na ajọ ọgwụ ndị ọzọ.

"Mụ onwem bụ onye izizi malitere ọgụ a megide ndị ọgbara ọhụrụ dibia niile jiri soshal midia aghogbu ndị ntorobia ka ha bia gwọọ ọgwụ maka ibuta ego mbute." Nkea mere m gi agba ọgwụ ọkụ kwa izuka na Zion Ministry."

Ebuka Obi katọrọ ụfọdụ dibịa na-eburu ozu mmadụ dọba n'ụlọ arụsị sị na ọ bụ arụsị ha gburu ya.

"Arọrọ m nrọ ebe a tọhapụrụ Nnamdi Kanu"

Ebuka Obi
Nkọwa foto, Ebuka Obi

"Mụ onwe m so na ndị na-eti mkpu kemgbe ma n'elu altar sị tọhapụ nwaamadị a bụ Mazi Nnamdị Kanu n'ihi na a hapụ ya udo tọrọ atọ ga-alaghachitekwa n'ala Igbo."

"O nwere oge m rọrọ nrọ hụ Mazi Nnamdị Kanu ka ọ si na mkpọrọ pụta. A nọ m na pulpiti gwa ndị mmadụ maka ya bọ nrọ."

Ihe banyere ala ụlọekpere Zion Ministry zụrụ n'obodo Ngor Okpala, Imo Steeti

Oge a jụrụ ya ma ọ bụ eziokwu na ọ napụrụ ụfọdụ mmadụ ala nna nna ha na Ngor Okpala nke mere ka ha mee ngagharịiwe, Evang. Ebuka Obi sịrị "Nke a bụ okptokpo asị ka ha na-asị.

"Ala Zion Ministry nwetara na Ngor Okpala bụ ala gọọmenti Imo Steeti nwe. Ha zụpụtara ya site n'aka ndị obodo kamgbe afọ iri na asatọ"

Ebuka Obi gara n'ihu kọwaa na ha zụtara ala ahụ n'uzọ iwu obodo na nke gọọmentị kwadoro, wee kọwaa na ndị na-enye nsogbu bụ ndị gara na-ere ala gọọmenti n'ụzọ adigboroja.

O kwesiri ka nwoke na nwaanyị mata onwe ha n'ụdị "courtship" tupu ha alụọ di na nwunye?

"Nwoke na nwaanyị ịmata onwe ha tupu ha alụọ bụ ihe mara mma nke ukwuu, mana ha agaghikwa enwe mmekọ nwoke na nwaanyị maka na o megidere iwu nke chukwu.

Mmata onwe n'ụdị nke ụmụ chineke mara mma, oge ahụ bụ mgbe ị ga-eji mata ihe gbasara onye ịchọrọ ịnụ, nyochaa ezi na ụlọ ya ma mụta omume ya mara ma unu abụọ a ha ebili n'ụlọ.

"Ndị ntorobịa kwesiri ịṅomi Mary na Joseph n'akwụkwọ nsọ, ha emetụghị onwe ha aka n'agbanyeghị na ekwuola na ha ga-alụ di na nwunye.