Lee ụbọchị a ga-ekpe ikpe Nnamdi Kanu na Ọkaikpe ga-ekpe ya

Kanu na ndị ọkaiwu ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Ngala ụlọikpe Naịjirịa ehiwela ụbọchị ha ga-amalite ọzọ n'ileba anya n'ikpe dị n'etiti onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na Gọọmentị etiti.

Cheta na gọọmentị boro Kanu ọtụtụ ebubo gbadoro ụkwụ n'iyi ndụ egwu nakwa ibuagha megide ọchịchị.

Ikpe a ga-amalite na Fraịde ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị, afọ 2025 n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja dịka akwụkwọ ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor nwetere n'aka ụlọikpe si kwuo.

Nke a na-abịa dịka Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa Kudirat Kekere-Ekun nyefere ikpe ahụ n'aka ọkaikpe ọzọ mgbe Nnamdi Kanu gbara isiakwara na ọkaikpe Binta Nyako agaghị ekpe ikpe ya ọzọ maka na ọ dịla mbụ sepụ aka n'ikpe ahụ n'afọ 2024

Onye bụ Ọkaikpe ga-ekpe ikpe a?

Ọkaikpe James Kolawole Omotosho

Ebe foto si, Judges Federal High Court

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ onye bụ ọkaikpe ọhụrụ a ga-ekpe ikpe Nnamdi Kanu maka na akwụkwọ ozi ndị ụlọikpe wepụtara, o nweghị ọkaikpe a kpọrọ aha.

Mana kepụkepụ na-ekwu na ọ bụ Ọkaikpe James Kolawole Omotosho nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ga-amalite ikpe Kanu nke ọhụrụ a.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọkaiwu Aloy Ejimakor, o kwuru n'ezie na ọ bụ Ọkaikpe James Kolawole Omotosho ga-ekpe ikpe ahụ.

  • A mụrụ Ọkaikpe Kolawole Omotosho n'ụbọchị 21 nke ọnwa Julaị, afọ 1966 n'obodo Ajegunle dị na Legọs Steeti.
  • Ọ bụ onye obodo Ijemo-Abeokuta nke Ogun Steeti.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Olabisi Onabanjo dị n'Ogu Steeti na ngalaba iwu.
  • Ọ gụkwara akwụkwọ otu afọ n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu nke Naịjirịa dị na Legọs site n'afọ 1996 ruo 1997, tupu e duo ya n'iyi ọrụ dịka ọkaiwu.
  • Ọkaikpe Omotosho ekpeela ọtụtụ ikpe ndị dị elu na Naịjirịa nke gụnyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mpụ ego, nrụrụaka nakwa iyi ndụ egwu.

"Ọkaikpe John Tsoho ewezugaghị onwe ya n'ikpe Kanu"

Ọkaikpe John Tsoho na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Federal High Court/Getty Image

Nkọwa foto, Ọkaikpe John Tsoho na Nnamdi Kanu

Ọkaiwu Onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu, ekwuola na ọ bụghị eziokwu na Ọkaikpe John Tsoho wezugara onwe ya n'ikpe Nnamdi Kanu.

Aloy Ejimakor kwuru nke a oge BBC Igbo gbara ya ajuju ọnụ n'ekwenti banyere akụkọ na-efegharị na soshal midia na ọ bụ Ọkaikpe John Tsoho ka ikpe Nnamdi Kanu dị n'aka ugbu a, mana ya bụ Ọkaikpe ahụ wezugara onwe ya n'ikpe ahụ.

Akụkọ ahụ na-efeghari na-ekwu na "John Tosho sepuru aka ya n'ikpe Nnamdi Kanu ma kwuo na ọ ga-emetọ aha ya ma ya tinye aka na ya".

N'okwu Ejimakor " Akukọ ahụ bụghị eziokwu; ọ bụ ihe na-efegharị na soshịa midia, o nweghị akwụkwọ mgbasa ozi a ma ama buru akụkọ ahụ".

O kwuru na ndị mmadụ kwasịrị ịma na ya bụ akụkọ abụghị eziokwu maka na ọ bụrụ eziokwu, na ya onwe ya bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu ga-eji aka ya ekwupụta ya.

Ejimakor gara n'ihu kwuo na onweghị onye ọkaikpe nwere ike ikwu ihe ahụ akụkọ ahụ na-efegharị kwuru na onye Ọkaikpe Tsoho kwuru.

O kwuru na ya ma onye ọkaikpe enyefere ikpe Nnamdi Kanu n'aka, mana ya agahị agwa BBC aha ya maka irubeisi n'ihe ụlọikpe kwuru.

Ikpe Nnamdi Kanu ga-ebido n'isi ugbua e nyefere ya Ọkaikpe ọhụrụ - Aloy Ejimakor

Ikpe Nnamdi Kanu ga-ebido n’isi ugbua e nyefere ya n’aka Ọkaikpe ọhụrụ - Aloy Ejimakor
Nkọwa foto, Aloy Ejimakor na Nnamdi Kanu

Ọkaiwu onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Aloy Ejimakor ekwuola na ikpe Nnamdi Kanu ga-ebidogharị n'isi ugbua e nyefere ya n'aka Ọkaikpe ọhụrụ.

Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo kpọtụụrụ ya iji chọpụta ọnọdụ ikpe ahụ ugbua e nyefere ya n'aka Ọkaikpe ọhụrụ, Ejimakor sịrị "ikpe ahụ ga-amalite n'isi."

Ka ọ dị ugbua, o dobeghị anya ma ikpe ahụ ọ ga-ebido site n'oge Ụlọikpe Mkpegharị nyere iwu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu ka ọ bụ site n'oge mbụ e wepụrụ akwụkwọ n'ụlọikpe megide nwaamadị ahụ.

Ka o sinadị, anyị ka na-agba mbọ inweta ozi rijuru afọ gbasara ọnọdụ ikpe ahụ.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde 8 Maachị 2025, ka Ọkaiwu Aloy Ejimakor gwara anyị na e nyefeela okwu onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdị Kanu n'aka Ọkaikpe ọzọ.

E nyefeela okwu Nnamdi Kanu n'aka Ọkaikpe ọzọ

E nyefeela okwu Nnamdi Kanu n'aka Ọkaikpe ọzọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor kwuru na e nyefeela okwu onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) ahụ ọ na-anọchite anya ya n'aka Ọkaikpe ọzọ.

Nke a dị n'ozi Ejimakor binyere aka na ya ma mee ka o rute ndị ntaakụkọ BBC Igbo aka.

"Ụnyaahụ ka anyị nwetara akwụkwọ ozi leta abụọ gbasara ikpe Nnamdi Kanu. Otu bụ nke sitere n'aka Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa, bụ nke o jiri zaghachi akwụkwọ anyị degaara ya na nso nso a ka ọ hụ na e kpere Nnamdi Kanu ikpe ngwangwa".

"Ozi nke ọzọ bụ nke sitere n'aka Nnukwu Ọkaikpe nke Ụlọikpe ukwu etiti Naịjirịa, bụ nke o jiri gwa anyị na e nyefeela okwu Nnamdi Kanu n'aka Ọkaikpe ọzọ," ka Ejimakor kwuru.

Ọ sịrị na Nnamdi Kanu gwara ndị Ọkaiwu ya ka ha keleere ya Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa maka ige ntị n'arịrịọ ya ma kelekwaa ọhanaeze maka nkwado niile ha na-enye ya.

Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe ka e kpee ikpe ya ngwa ngwa maọbụ a tọhapụ ya

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyendu ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu agbaala ụzọ akwụkwọ abụọ n'ụlọikpe banyere ikpe ya na gọọmentị Naịjirịa.

N'akwụkwọ ozi ọkaikpe ya bụ Aloy Ejimakor wepụtara kwuru na ha ndị ọkaiwu ya gbara akwụkwọ abụọ dị iche iche n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde 4 Maachị, 2025, ka gọọmentị nwee ike rubeisi n'iwu n'usoro ikpe banyere Kanu.

O kwuru na akwụkwọ nke mbụ ha gbara n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja kwuru ka a manye iwu ikike dịịrị Nnamdi Kanu n'ikpe ziri ezi, ka e nwee ike kpee ike ya n'oge maọbụ a tọhapụ ya.

N'akwụkwọ nke abụọ, ha kwuru ka ụlọikpe manye ndị ọrụ gọọmentị n'isoro ụzọ iwu n'ikpe a na-ekpe Kanu, nke gụnyere ibuga ikpe ya na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ebe ha sị na o kwesịrị ịmalite.

O kwuru na ha chọrọ ime ka o doo anya na kamgbe Ọkaikpe Binta Murtala-Nyako wezugara onwe ya n'ikpe ahụ n'ọnwa Sepụtemba 2024, na usoro ikpe ahụ abụrụla ihe so ụzọ megidere iwu.

O kwuru na nke gụnyere ọjụjụ a jụrụ inyefe Ọkaikpe ọzọ ikpe ahụ, nakwa inyeghachị ikpe ahụ n'aka Ọkaikpe jụrụ ikpe ahụ na mbụ, ọjụjụ a jụrụ iburu ikpe ahụ gawa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa ọjụjụ a jụrụ ịmalite ikpe ahụ n'oge kwesịrị ekwesị dịka iwu si kwuo.

Ọ rụtụrụaka na ihe ndị a niile megidere ikike dịịrị Nnamdi Kanu, tinyere mkpọchi a ka kpochiri ya n'ụlọ nga kamgbe afọ anọ gara aga na-enweghi ikpe ziri ezi e kperela.

Kanu gbara isi akwara na Ọkaịkpe Binta Nyako agaghị ekpe ikpe ya ọzọ

Nnamdi Kanu na Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor

Aloy Ejimakor nọ n'isi ya, akagbuola nyigharị ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abụja yigharịrị ikpe onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu ruo oge amaghị.

Nke a na-abịa dịka Nnamdi Kanu kwusiri okwu ike banyere nyigharị Ọkaikpe Binta Nyako yigharịrị ikpe ya ụbọchị Mọnde 10 Febuwarị 2025 ruo oge amaghị.

N'akwụwkọ ozi o wepụtara, ọkaiwu Aloy Ejimakor kwuru na nyigharị ahụ enweghị ikike ọbụla maka na Ọkaikpe Binta Nyako ewezugala onwe n'ikpe Nnamdi Kanu site n'usoro iwu kwadoro.

Akwụkwọ ozi Ọkaiwu Aloy Ejimakor wepụtara maka nyigharị ikpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/Facebook

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi Ọkaiwu Aloy Ejimakor wepụtara maka nyigharị ikpe Nnamdi Kanu

Ejimakor mere ka o doo anya na Ọkaikpe Nyako enupula isi nye mkpebi ụlọikpe kachasị nyere maka ntọhapụ beelu Nnamdi Kanu.

Ọ kọwara na nke a gosiri na Ọkaikpe Binta Nyako enweghị atụmatụ maọbụ ebumnobi ikpe ikpe ahụ n'ụzọ iwu kwadoro.

Ka ọ dị ugbua, Ọkaiwu Aloy Ejimakor kwuru na ọ bụrụ na enweghị Ọkaikpe ọzọ nọ n'Abuja chọrọ ikpe ikpe Nnamdi Kanu, na ihe e kwesịrị ime bụ inyefe ikpe ahụ n'aka ọkaikpe ụlọikpe ukwu etiti dị na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa.

O kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti enweghị ike ikpe Nnamdi Kanu ikpe, o kwuru ka a tọhapụ ya ruo oge gọọmenti nwereike ịchịkọta onwe ya ọnụ maka ikpe ahụ.

Ọkaiwu Aloy Ejimakor mere ka o doo anya na iwu kagburu mkpọchi a kpọchiri Nnamdi Kanu kemgbe.

Lee akwụkwọ ozi ahụ Ọkaiwu Aloy Ejimakor wepụtara na ihe ndị ọzọ o kwuru:

Akwụkwọ ozi Ọkaiwu Aloy Ejimakor wepụtara maka nyigharị ikpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Aloy Ejimakor/Facebook

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi Ọkaiwu Aloy Ejimakor wepụtara maka nyigharị ikpe Nnamdi Kanu

E yigharịrị ikpe Nnamdi Kanu ruo oge amaghị

E yigharịala ikpe Nnamdi Kanu ruo oge amaghị
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor

Ọkaikpe Binta Nyako nke Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abụja eyigharịala ikpe onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu ruo oge amaghị.

Nyako kwuputara nke a oge Nnamdi Kanu kwuchara na ya achọghị ka Ọkaikpe ahụ gaa n'ihu na-ekpe ya ikpe.

Kanu siri na ya nwere mkpebi ahụ n'ihi na o nweghịzi ntụkwasaobi na Ọkaikpe Binta Nyako ga-ekpe ikpe ziri ezi.

Nnamdi Kanu awuchiela n'ụlọikpe ka ikpe ya malitere

Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya n'ụlọikpe dị n'Abuja
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya n'ụlọikpe dị n'Abuja

Nnamdi Kanu, ndị Ọkaiwu ya, ndị Ọkaiwu Gọọmenti etiti na ndị nwere mmasị ige ikpe ka ọ na-aga batara n'Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja.

Ikpe ahụ malitere n'ime obere oge Ọkaikpe Binta Nyako batara ụlọikpe.

Ka ikpe malitere, Nnamdi Kanu; onye ndu ndị Ipob kwụụrụ ọtọ sị:

"Arịrịọ m rịọrọ ụlọikpe si ka ha wepụ Ọkaikpe Binta Nyako ka kwụ ọtọ."

"Enweghị m ntukwasị obi na Ọkaikpe a ga-ekpe nke bụ eziokwu n'ikpe m a."

Foto mgbe BBC gbara Nnamdi Kanu ajụjụọnụ n'afọ 2018 na Lọndọn
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu: Ihe a na-atụ anya ga-eme n'ikpe ya taa

A ga-ekpe ikpe Nnamdi Kanu n'Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja n'ụbọchị Mọnde 10 Febụwarị 2025.

N'ime ọnwa Septemba, afọ 2024 ka Ọkaikpe Binta Nyako wezugara onwe ya n'ikpe Nnamdi Kanu oge nwaamadị ahụ bochara ya ebubo enweghị ikike ilebara ikpe ya anya.

Mana Nnukwu Ọkaikpe na-elekọta Ụlọikpe Ukwu na Naịjirịa mechara nyeghachi Nyako ikpe ahụ ka ọ gaa n'ihu na-elebara ya anya.

N'ime izuụka gara aga ka ndị Ọkaiwu Nnamdi Kanu wepụrụ akwụkwọ n'ụlọikpe ka e bugaa ikpe ahụ n'ala Igbo mana apụghị ilebara ya anya oge ahụ.

Dịka Ụlọikpe ga-amalite ilebara ikpe Nnamdi Kanu anya n'ụbọchị Mọnde, ndị Ọkaikpe ya ga-ewelitekwa okwu ahụ ọzọ iji mara ma a ga-anabata ya.