Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ ka gọọmenti kwụsị ikpe ya maka enweghị ikike

Nnamdị Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe bụ Ipob agbaala gọọmentị etiti akwụkwọ ọhụrụ.
N'ime ya nke ọ rịọrọ ụlọikpe mkpegharị ka ha kwụsị ụlọikpe dị elu ikpe ya ikpe maka ebubo dị icheiche e boro ya ọ kachasị ebubo iyi ndụ egwu.
Ọkaiwu Nnamdị Kanu bụ Aloy Ejimakor bụ onye gbara akwụkwọ ahụ n’ụlọikpe mkpegharị ji soshal mịdịa-X ya mee ka amata nke a.
Ejimakor gwara ụlọikpe mkpegharị ọtụtụ ihe were na-arịọ ka atọhapụ Nnamdi Kanu ma kwụsị ikpe ya ikpe.
Otu n’ihe Ejimakor kwuru bụ na ụlọikpe dị elu enweghị ikike ikpe Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu bụ otu n’ime ebubo gọọmenti etiti jị kpụpụ ya ụlọikpe.
Ha na-ajụ ihe kpatara a ga-eji iwu Naịjirịa pụtara n’afọ 2022 were na-ekpe mmadụ ikpe maka ebubo e boro ya ma ọ bụ ịwụ a sị na ọ dara oge Naịjirịa enwebeghị ịwụ ahụ.
Cheta na ụlọikpe kachasị ekwubuola ka atoghapụ Nnamdi Kanu mana rue ugbua ọ ka nọ 'aka DSS bụ ndị uweojii pụrụiche.
Okaiwu ya kwukwara na Kanu na-arịa ọrịa mkpụrụ obi nke mere o ji anata ọgwụgwọ.
"DSS emechaala kwe ka dọkịta Kanu nyocha ya ahụ mana e kwesịrị ịkpọga ya n'ụlọọgwụ"

Ebe foto si, DSS/Aloy Ejimakor
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) emechaala nye Nnamdi Kanu bụ onyendu IPOB ohere ka dọkịta nke ya nyochaa ya ahụ.
Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor kwuru nke a n’ozi o wepụtara n’akara sosha midia X na mgbede Wenezde 17 Julaị, 2024.
O kwuru na nyocha ahụ dọkịta ahụ nyochara Kanu gosiri na e nwere nnute ọrịa na-agbagwoju anya na-arịa Kanu nke kwesịrị na a kpọgara ya n’ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.
Ejimakor bụ onye na-akpọghị aha ihe na-arịa Kanu kpọmkwem gara n’ihu kwuo na dọkịta Kanu ga-edegara ndị DSS akwụkwọ maka nke a.
N'ozi Ejimakor wepụtaburu na mbụ, o kwuru na ndị DSS jụrụ ka dọkịta ahụ lee Kanu ahụ n'ụbọchị Tuzde a kpọgara ya.
"Anyị gara lets Nnamdi Kanu ụnyaahụ (ụbọchị Monde) ma hụ na ahụ adịghị ya, ọ na-eku elu elu, BP ya gbadara agbada.
O doro anya na o kwesiri ịhụ Dọkịta. Nke mere ka anyị degara edemede nye ndị isi DSS, mana mgbe o ruru ịhụ ya, DSS ekweghi ka ọ hụ ya".
Mgbe BBC gbara mgbọ ịnweta ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunanya n'ekwentị ya ọ zaghị.
Afuanya mechara kwo ka e zitere ya ozi mana ọ zabeghị mgbe ezigaara ya.









