Di m akwadoghi nkatọ a na-eme Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor - Uche Kanu

Ihe Nnamdi Kanu gwara m mgbe m gara zute ya n'aka ndi DSS – Uche Kanu

Ebe foto si, BBC/NGR Government
Uchechukwu Okwu Kanu bụ nwunye Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ mwereonwe akpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuputala okwu gbasara nleta ọ gara hụ di ya.
Uchechukwu kwuputara nke a n'ozi ọ gbasara na soshal midia n'ụbọchị ise nke ọnwa Mee ebe o ziri ndị mmadụ ozi ọ sị na "di ya sị ya zie".
Nwunye Kanu kwuru na ọ bịara Naịjirịa ịhụ di ya n'ebe ọ nọ n'aka ndị uweojii pụrụiche a kpọrọ DSS nke mere ya mbụ ha na-ahụ onwe ha kemgbe afọ 2021 mgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya.
N'ozi ahụ ọ gbasara, ọ bitụrụ aka n'ụfọdụ ihe gụnyere ihe banyere ndị okaiwu nọchitere anya di ya n'ụlọikpe ebe ikpe ya ka na-aga ihu.
Ihe ọzọ okwu ya bitụrụ aka bụ okwu banyere ahụike di ya bụ onye ọ sị na-arịa ọrịa mkpụrụ obi.
Ihe o kwuru banyere ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu
N'ihe gbasara ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu, ọ sị na Kanu gwara ya na o nweghi ihe ọjọọ o bu n'uche n'ebe Mike Ozekhome nakwa Ifeanyi Ejiofor nọ.
Kama ọ sị na o nwere ndị aghụghọ na-agagharị akpalite esemokwu n'etiti Kanu na ndị ahụ bụbu ọkaiwu ya site n'ịjụ ime ihe Kanu gwara ha mee.
"Ndị ahụ nupuruisi n'okwu Nnamdi Kanu kwuru, ọ sị ha kwụsị ịkatọ ndị ọkaiwu ya mana ha egeghị ntị" ka ọ sị.
Okwu Kanu na onwe ya kwuru na ọ gara leta Mike Ozekhome ma kelee ya maka aka o nyeere di ya mgbe ọ ka bụ ọkaiwu ya.
"Ozekhome gbara mbọ dị ukwu n'ikpe di m nke ọtụtụ mmadụ amaghị
"Ozekhome tinyere onwe ya n'ọnọdụ oke nkatọ nakwa okwu ọjọọ n'ihi na o kwetara ịnọchị anya di m n'ụlọikpe" ka Okwu Kanu kwuru.
Ọ kwukwara hoo haa na di anaghị akwado nkatọ nakwa okwu ọjọọ a na-eme Ejiofor na Ozekhome.
"O nwere onye na-agaghari achọkọta ndị ilo ebe niile ma tụgharịa sị na ndị ahụ bụ ndị ilo Nnamdi Kanu.
Ọ dọkwara onye ahụ aka na ntị sị ya kwụsị ịme ihe ọ na-eme maọbụ ọ kpọpụta aha ya n'ọha mmadụ.
Ihe ndị isi ndị Igbo na-emere Kanu

Okwu Kanu kelere ndị isi na ndị ọchịchị Igbo di icheiche maka mbọ ha na-agba ịhụ na agbahapụrụ di ya dịka ụlọikpe si kpebie.
Otu onye ọ kachasị kelee bụ Ifeanyi Ubah maka etu o si gbaa mbọ ịme ka ya bụ Okwu Kanu hụ di ya anya.
N'ozi ahụ ọ gbasara, ọ sị "a na m ekele gị Ifeanyi Ubah maka etu ị sị mee ngwa ngwa ma gbaa mbọ ka m hụ di m, ekelee m gị".
Maka ndị ọzọ na-agba mbọ ọ sị "ụfọdụ ndị ọchịchị Igbo ka njichi di m na-echekasị, ha niile na-agba mbọ iwelite mkparịtaụka gbasara okwu ya (Kanu), e kelere m ha niile"
Ọ sị kwa na ọtụtụ ndị ahụ achọghị ka akpọọ ha aha mana ọ kwụsịghị ha ịgba mbọ ịhụ na atọghapụrụ Kanu ebe e ji ya.









