Nnamdi Kanu ahapụghị okwu nnwereonwe Biafra, ọ ga-agba ụtụ n’ụlọmkpọrọ - Primate Ayodele

Ebe foto si, Primate Elijah Ayodele X/Getty
Onye hiwere ụlọụka INRI Evangelical Spiritual Church bụ Primate Elijah Ayodele ekwuola na ọ bụrụ na onye ndu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu ahapụghị nnwereonwe ọ na-achọ, ọ ga-agba ụtụ n’ụlọmkpọrọ.
Ayodele kwuru nke a ụbọchị Mọnde oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ya ajụjụ n'ekwentị banyere amụma o buru sị na Nnamdi Kanu ga-anwụ n’ụlọmkpọrọ ma ọ bụrụ ma ọ rịọghị gọọmenti Naịjirịa mgbaghara.
O kwuru sị, “mgbe oge Chukwu ruru, a ga-ekewa Naịjirịa. A hụrụ m ebe e nwere ntụliaka 'refarandum' na Naịjirịa nke nkwafu ọbara na-adịghị”.
Ayodele kwuru sị, “Ọ bụ onye Mgbago Ugwu ga-ekewa Naịjirịa, ọ bụghị Nnamdi Kanu, Ọ bụghị Sunday Igbogho. Nnamdi Kanu na-achọ ime ihe Chukwu edunyeghị ya”.
Ọ sịrị "ihe m buru bụ amụma. Abụghị m onye na-egwu ndọrọndọrọ ọchịchị, a bụ m primate."
Ihe ezinaụlọ Nnamdi Kanu kwuru gbasara amụma Primate Ayodele

Ezinaụlọ Nnamdi Kanu agwala onye amụma bụ Primate Ayodele ka o wezuga onwe ya n’ihe ọbụla metụtara onyendu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu.
Nwanne Nnamdi Kanu nke obere bụ Kanunta Kanu nyere ya bụ ịdọ aka na ntị n’ozi o wepụtara n’ụbọchị ụka Sọnde oge ọ na-ekwu gbasara amụma Primate Ayodele buru banyere ikpe a na-ekpe nwanne ya nwoke.

Ezinaụlọ Kanu kwuru na amụma Ayodele esiteghị na Chukwu dịka ha gwara Ụkọchukwu ahụ ka o wepụ aka n’iji aha nwa ha nwoke akọ ihe na-enweghị isi.
Cheta na Primate Ayodele nọọrọ n’ụbọchị Satọde dọọ Nnamdi Kanu aka na ntị ka ọ rịọ Gọọmenti Naịjirịa mgbaghara maka nnwereonwe ya.
Dịka o siri kwuo oge ọ na-ahazi otu mmemme n’ụlọụka ya dị na Legọs, Nnamdi Kanụ ga-anwụ n’ụlọnga ọ bụrụ ma ya jụ ịrịọ Gọọmenti Naịjirịa mgbaghara maka ntọhapụ ya.