Gịnị mere ndị Igbo ji eli alọ nwa ha?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
N’omenala Igbo, nwa bụ ihe dị oke ọnụahịa nke pụtara na enweghị ihe ọbụla a pụrụ iji tụnyere nwa. Ọ bụkwa nke a mere onye Igbo ọbụla ji agba mbọ ịmụta nwa nke ya n’ihi na ha kwenyere na enweghị ihe pụrụ ịnọchi anya nwa.
Ọ bụrụ ma nwaanyị tụrụ ime, ọ na-abụ nnukwu ihe ọṅụ nye ezinaụlọ ya na ọha obodo niile n’ihi na e nwere onye ọhụrụ a na-atụ anya ya.
Nwaanyị buzuo nwa ya ọnwa itoli, ihe onye ọbụla ga na-echezi bụ ụbọchị ọ ga-amụpụta ya. Mana nwaanyị gaa ịmụ nwa, ọ bụghị naanị nwa ka ọ na-amụpụta.
E nwere ihe ndị ọzọ dị iche iche ha na nwa ọhụrụ so apụta nke gụnyere ichi na alọ.
Ichi bụ ebe nwata nọ n’afọ si enweta ihe oriri na ikuku ndụ ebe alọ bụ eriri jikọtara nwata na nne ya. Ọ bụ alọ na-enyeru nwa e bu n'afọ akụrụngwa ndị na-edozi ahụ na ikuku ndụ sitere na nne ya.
A mụpụta nwata, a na-achabi alọ ya ma lie ichi ya ozugbo ma chere ka alọ nke fọdụrụ ya n’otubo ree ma dapụ. Ozugbo nke ahụ mere, a na-elikwa ya n’ala maọbụ n’ukwu osisi.
N’omenala Igbo, alọ na ichi nwata bụ ihe a na-asọ nsọ nke mere e ji akpachapụrụ ha ezigbo anya. Ndị Igbo kwenyere na ọ bụ n’ezinaụlọ a mụrụ nwata ka a ga-eli alọ ya. Gịnị mere o ji dịrị etu a?
Ebe ndị Igbo na-eli alọ nwata

Ebe foto si, Getty Images
Iji chọpụta etu ndị Igbo si eli alọ nwa a mụrụ ọhụrụ nakwa ebe a na-eli ya, anyị gara kpọtụrụ onye nkụzi Igbo, omenala Igbo doro anya nke ọma bụ Maazị Chigozie Nnabuihe.
Na nkọwa ya, Maazị Nnabuihe kwuru na omenala Igbo akwadoghị ka e lie alọ nwata ebe ọzọ na-abụghị n’ezinaụlọ a mụrụ ya.
“E nwere ike lie alọ nwata n’ukwu nkwụ maọbụ n’ukwu osisi ọbụla na-enye ego. Osisi ọbụla e liri alọ nwata n’ukwu ya bụ nwata ahụ nwe ya.
“Mụ onwe m mụrụ ụmụ m anọ na Legọs steeti mana e welara m alọ ha ụlọ ma lie ya n’ezinaụlọ m. Ndị ụlọọgwụ enyeghị m ichi ha, ọ bụ naanị alọ ha ka e nyere m,” ka Maazị Nnabuihe gwara anyị.
Ihe mere ndị Igbo ji eli alọ nwata n’ezinaụlọ ya

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Maazị Nnabuihe kọwara na ihe mere ndị Igbo ji eli alọ nwa ha n’ezinaụlọ ha bụ n’ihi na ndị Igbo anaghị atọ na mba. Ha kwenyere na “ebe alọ nwata liri ka okpokoro isi ya ga-eli” nke pụtara na ọ bụ ebe e liri alọ nwata ka aga-eli ozu ya ma ọ nwụọ.
“Nwata ọbụla a mụrụ n’ezinaụlọ a mụrụ nna ya ma lụbata nne ya abatala n’ezinaụlọ ahụ. Ma ọ bụ nwa nwoke maọbụ nwaanyị, a ga-eli alọ ya n’ezinaụlọ ahụ,” ka Maazị Nnabuihe kwuru.
Dịka o siri kwuo, “ndị Igbo anaghị atọ na mba; ebe ahụ e liri alọ nwata ka nwata ahụ kụrụ mkpụrụ. Ọ bụ nke a mere ndị Igbo ji ebulata ozu nwaọkpụ ha nwụrụ anwụ n’oge gboo n’ihi na ha kwenyere na ebe alọ nwata liri ka okpokoro isi ya ga-eli.”
Onye ọzọ kwuru okwu gbasara nke a bụ Frank Uju Ebelebe. Ọ sịrị na ihe mere ndị Igbo ji eli alọ nwa ọhụrụ ha bụ iji nyefee ya n’aka ndị ichie nwụrụ anwụ maka nchekwa.
O kwukwara na ụfọdụ obodo na-eme ya iji nyeghachi nne nwata ahụ ọmụmụ n’ihi nkwenye ha nwere na ala na-anọchiteanya ọmụmụ.
Mba ndị na-eli alọ nwa ha n’ụlọ
E wezuga ndị Igbo, e nwekwara mba ndị ọzọ na-eli alọ nwa ha n’ụlọ iji gosipụta na ya bụ nwata bụ nwaafọ ezinaụlọ ahụ nakwa obodo ya.
“Ya bụrụ ma ị gụọ akwụkwọ nsọ, tupu nwunye Abraham bụ Sarah anwụọ na mba ọzọ, o jiri ego ya zụọ ala ma kwuo ka e lie ya ebe ahụ n’oge ọnwụ ya”.
“Ị hụkwara mgbe Jacob sooro ụmụ ya gaa Ijipt, mgbe ọ na-enye ha iwu tupu ọ nwụọ, ọ gwara ha ka ha chekwaa ọkpụkpụ ya ma lie ya n’obodo ha ọ bụrụ ma ha laa”.
“Anaghị m ekwu na Igbo bụ ndị Juu, ihe m na-ekwu bụ na omenala ndị ọbụla dịịrị ha; omenala onye ọbụla bụ nke kachasị mma,” ka Maazị Nnabuihe kwuru.









