Igbo maternal inheritance: Ị ma na ụfọdụ obodo n'ala Igbo na-eri ekpe na nne?

Ndị nne obodo Ohafia
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

N’omenala Igbo, e kwenyere na nna bụ onyeisi ezinaụlọ nke kpatara onye nna ọbụla ji agba mbọ ịlekọta ezinaụlọ ya nke ọma.

Site n’ịrọpụtara ha ihe oriri, ụlọ, uwe, ihe ndị ọzọ dị oke mkpa e ji ebi ndụ nakwa ihe a ga-eketa n'aka ya ma ọ nwụọ.

Ọ bụrụ na nna zụlite ụmụ ya, a na-atụ anya na ọ ga-ekesa akụnaụba ya n'etiti ụmụ ya iji hụ na ụkwụ siri ha ike n'ala ma a bịa n'ihe nweta.

N’oge gboo, ọ bụ naanị ụmụ ndị nwoke na-eketa oke n’akụnaụba nna ha n’ala Igbo mana ugbua, n’ihi mmepe anya na mgbanwe a na-ahụta n’ụwa, a na-ekenyezi ụmụ ndị nwaanyị oke site n’akụnaụba nna ha.

Ụfọdụ mgbe, nna na-eji aka ya kesaara ụmụ ya akụnaụba ya n’oge ọ dị ndụ ebe oge ụfọdụ ọ na-abụ mgbe nna nwụrụ ka ụmụ ya na-ekesa akụnaụba ndị ọ hapụrụ laa mmụọ.

Usoro ikesara ụmụ akụnaụba nna ha ka ndị Igbo na-akpọ ‘iri ekpe’ maọbụ ‘ike ekpe’.

Ya bụ na nwa nwoke ọbụla a mụrụ n’ime ezinaụlọ ka a na-atụ anya iketa oke n’akụnaụba nna ya.

Mana a bịa n’ụfọdụ mpaghara ala Igbo dịka n’Abia nakwa n'Ebonyi, nwoke na-eketa oke n’akụnaụba nna ya ma na-eketakwa oke n’ikwu nne ya maọbụ ibe nne ya.

Ọ bụ ọnọdụ dị etu a ka ndị Igbo maara dịka ‘iri ekpe na nne’ ebe obodo ndị na-agbaso ụdị omenala dị etu a ka a na-akpọ ‘ndị ori na nne’.

Gịnị bụ 'iri na nne'

Ndị nne n'obodo Ohafia, Abia Steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Maazị Sunny Idika nke ụlọọrụ Darling FM Owerri bụ onye ọkachamaara n'omenala Igbo gwara BBC Igbo na iri ekpe na nne bụ ọnọdụ na-enye nwoke ikikere iketa oke n’ikwu nne ya.

Ọ kọwara na obodo dịka Ọhafịa dị n’Abịa Steeti na-eketa oke n’ụlọ nna ha nakwa n’ikwu nne ha mana ihe e ji maara ha bụ ndị ‘na-eri ekpe na nne’.

Dịka o siri kwuo “n’Ọhafịa, nwoke na-eketa oke n’ụlọ nna ya nakwa n’ikwu nne ya. Ihe mere e ji akpọ anyị "ndị na-eri ekpe na nne" bụ n’ihi na ọ na-amasị anyị ịnọ n’ụlọ ebe a mụrụ nne anyị.

“Iji maa atụ, ọ bụrụ na anyị lọta ụlọ n’oge mmemme ekeresimesi, anyị na-enwe oke mmasị ịnọ n’ikwu nne anyị n’ihi na ọ bụ ebe anyị na-enwe obi iru ala.

“Anyị na-eketa oke n’ụlọ nna anyị dịka ala na ụlọ mana echeghị m na anyị ga-enwe ike keta ala n’ikwu nne anyị, ọ bụrụkwanụ na nke ahụ pụrụ ikwe omume, amaghị m maka ya ewezuga ma ọ bụ ala nne anyị nwe n’onwe ya,” ka o kwuru.

N’aka nke ya Maazị Enyioma Kalu Ndu, onye lara ezumiike nka ọrụ sịrị na iri ekpe na nne apụtaghị na nwoke na-eketa oke n’ikwu nne ya.

Ọ sịrị na “ihe nke ahụ pụtara bụ na nwoke onye Ọhafịa lụọ nwaanyị n'Ọhafịa, ụmụ ha ga-erite uru karịsịa n’ikwu nne ha.

“Ọ pụtaghị na ha agaghị erite uru n’ụlọ nna ha kama ebe a ga-amara ha amara bụ n’ikwu nne ha.

Ihe mere ụfọdụ obodo ji eri na nne

Ụmụokoroọbịa ndị na-eri ala na nne

Maazị Kalu kwuru “ihe mere o ji dịrị etu a bụ n’ihi na ndị Ọhafịa hụtara oke uru ndị nne bara dịka ndị na-elekọta ụmụ ha anya nke ọma, ndị na-ekpuchite ụmụ ha pụọ na nsogbu na ndị na-enwe nnukwu ihụnanya n’ebe ụmụ ha nọ,” ka o kwuru.

Ọ kọwakwara na mgbe ọnọdụ iri ekpe na nne na-apụta ihe nke ọma bụ mgbe nwoke Ọhafịa lụrụ nwaanyị Ọhafịa mana ọ bụrụ ma nwoke Ọhafịa alụọ nwunye na mba ọzọ, ọnọdụ ahụ agaghị adị ire.

“Dịka mụ onwe m, nwunye m abụghị onye Ọhafịa, ya mere na ụmụ m nọ n’ikwu m, ha anọghị na nke nwunye m. Mana ọ bụrụ na nwunye m bụ onye Ọhafịa, ha gaara anọ n’ikwu nne ha,” ka Maazị Kalu gbakwunyere.

Onye ọzọ kwuru okwu banyere nke a bụ Maazị Sunny Umah, onye ọrụ mgbasaozi. Ọ siri na otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere ndị Ọhafịa ji eri ekpe na nne bụ n’ihi na ọ bụ naanị nwaanyị dị ime maara onye tụwara ya ime nke pụtara na mgbe ụfọdụ nwaanyị nwere ike nọrọ na dị ma tụrụ ime n’aka nwoke ọzọ.

Dịka Maazị Ụmah siri kwuo “ọ bụrụ ma ndị Ọhafịa achọpụta na nwa a mụbatara n’ezinaụlọ abụghị nwannadị n’ezinaụlọ maọbụ n’obodo alụbatara nne ya, nwa dị etu ahụ aghaghị ịbụ nwa nne ya.”

Ihe ọzọ mere ndị Ọhafịa ji eri ekpe na nne dịka Maazị Sunny Umah siri kọwaa bụ nke gbakwasara ụkwụ n’omenala ndị obodo ahụ.

Ọ sịrị na n’oge agba ochie, otu nwanna ha gburu mmadụ nke pụtara na a ga-egbu ya maọbụ ọ kpọta onye ga-anwụchitere ya ọnwụ.

Dịka Maazị Umah siri kwuo “nwoke ahụ kwetara inye otu nwa ya ka ọ nwụchitere ya ọnwụ mana mgbe ọ gakwuuru ụmụnwaanyị ya niile, enweghị nke kwere akpọpụta nwa ya ka egbuo.

“Mgbe o ruru n’ụbọchị a kara aka, enweghị onye nwoke ahụ kpọtara ka ọ nwụchitere ya ọnwụ nke pụtara na a ga-egbuzi ya.

“Dịka ozi ruru Adanne ya ntị na a na-akwado igbu nwanne ya nwoke, ọ kwara akwa arịrị ma kpọpụta nwa ya nwaanyị ka egbuo n’ọnọdụ nwanne ya nwoke.

“Nwoke ahụ ṅụrụ iyi n’ụbọchị ahụ sị akụnaụba ya niile, ihe nketa ya niile, ihe ọ bụla si n’ahụ ya pụta ga-ala n’ikwu nne ya n’ihi na ọ bụ ha zọrọ ya ndụ n’oge ezinaụlọ ya na ụmụnnadị ya jụrụ ya,”

“Akụkọ a gbara anyị ume ịkwalite omume iri ikwu na nne n’ihi na oge ụfọdụ, mkpa kpaa mmadụ ọ bụ n’ikwu nne maọbụ be nwanne ya nwaanyị ka o si enweta enyemaka karịa n’ezinaụlọ ya maọbụ n’ụmụnna ya,” ka Maazị Sunny Umah gbakwunyere.

Nwaada Adaeze Jane John kwuru na ndị obodo ya bụ Idim Abam nke dị n’Abia Steeti na-eri ekpe na nne.

Ọ sịrị na iri ekpe zuru Igbo niile ọnụ mana iri ekpe na nne bụ nke a na-ahụta n’ụfọdụ obodo dị iche iche n’ala Igbo.

N’okwu Adaeze “iri ekpe na nne bụ ọnọdụ ndị mmadụ na-aga n’ikwu nne ha kere oke, nke na-adịghị n’omenala Igbo.

Obodo ndị ọzọ na-eri na nne

Ndị egwu ikperikpe ọgụ

“A bịa n’Abịa Steeti, obodo ndị na-eri ekpe na nne gụnyere Arọchukwu, Bende na Ọhafịa. A bịakwanụ n’Ebonyi Steeti, obodo ndị na-eri ekpe na nne bụ Afikpo North, Ehugbọ, Afikpo South, Edda nakwa akụkụ Ivo ụfọdụ.

“Abịrịba bụkwa obodo ọzọ na-eri ekpe na nne n’Abịa Steeti. Ọ bụ ha bu omenala iri ekpe na nne n’isi. Ndị Abam sokwa eri ekpe na nne.

Nwaada Adaeze kwuru na ndị Abam nakwa ụfọdụ obodo ndị ọzọ dị iche iche ebelatala aka n’iri ekpe na nne mana ndị Abịrịba ka bu ya n’isi.

Dịka o siri kwuo, ihe mere ụfọdụ obodo ndị ahụ jiri belata aka n’iri ekpe na nne bụ n’ihi ụfọdụ ihe ọghọm ọ na-ebute.

N’okwu Adaeze “ihe mere Ụfọdụ obodo dịka Abam jiri belata aka n’iri ekpe na nne bụ n’ihi na ọ na-abụ ngwangwa nwoke nwụrụ, ndị ikwu nne ya awụchaa ma bukọrọ ihe niile o nwere, gbawa ezinaụlọ ya aka. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ataala ahụhụ maka nke a.

“Mana e nwere etu ọ ga-esi mee, ọ gaghị emetụta ezinaụlọ nwoke nwụrụ anwụ. Iji maa atụ, ọ bụrụ na nwoke ahụ nwụrụ anwụ si obodo ọzọ lụbata nwunye ya n’Abam, Abịrịba, Ọhafịa maọbụ obodo ọzọ na-eri ekpe na nne, ihe nke ahụ pụtara bụ na nwoke ahụ enweela ikwu ọzọ. Ụmụ ya aghọọla ikwu ya, ụmụ ya na ụmụnne ya.

“Ọ bụrụ ma a chọọ nwoke ahụ ma ahụghị ya, ike ekpe na nne agaghị emetụta nwunye ya na ezinaụlọ ya etu ọ ga-esi metụta nwaanyị obodo ahụ a lụrụ n’obodo ahụ,” ka Adaeze kwuru.

Na nkọwa Adaeze, ụzọ mmadụ nwere ike i si gbanarị ọnọdụ iri ekpe na nne bụ ịlụ nwunye maọbụ di n’obodo ọzọ.