Igbo Culture: Ezenwaanyị, Ugoeze, Iyom na echichi ndị ọzọ a na-echi ụmụnwaanyị n'ala Igbo

Ụmụnwaanyị e chiri echichi n'ala Igbo

Ebe foto si, BBC/Goge Africa/Bianca Ojukwu

Echichi bụ ihe a na-eme iji kwanyere ụfọdụ ụmụnwoke nakwa ụmụnwaanyị ugwu pụrụiche n'obodo maka ọrụ ọma ha na-arụ.

Igbo tụrụ ilu sị na 'ezi aha karịrị ego', 'onye a na-akpọ nwere nke ọ na-eme'.

Nke a pụtara na onye e chiri echichi n'obodo nwere ihe ọma o mere, nke mere e jiri nye ya ezi aha echichi.

Ụmụnwaanyị e chiri echichi n'ala Igbo

Ebe foto si, Goge Africa

N'ala Igbo, e nwere echichi ndị a na-echi ụmụnwoke gụnyere nze, ọzọ, ichie, Igwe dgz.

Mana akụkọ a ga-eleba anya n'echichi a na-echi ụmụnwaanyị igosi uru ha bara nakwa ọrụ ha na-arụ.

Echichi ndị a dị iche iche dịka obodo si dị iche iche n'ala Igbo mana ha niile na-egosi nkwanye ugwu nye ndị e chiri ha.

Nkọwa echichi ụmụnwaanyị

Ụmụnwaanyị e chiri echichi n'ala Igbo

Ebe foto si, Goge Africa

Nze Ifeanyichukwu Obindi Ikechukwuma bụ onye omenala Igbo doro anya ma bụrụkwa otu n'ime ndị Ogbaru Nnewi kọwara ihe banyere echichi ndị a.

Ọ sị na etu e si echi ụmụnwoke echichi dịka nze na ọzọ, ka e si echi nwaanyị echichi dị iche iche dịka Ekwe (Nnewi) mana omenala na-eso ya anaghị ejucha eju ka nke nwoke.

"Echichi a na-echi ụmụnwaanyị bụ iji kwanyere ha ugwu n'ihe ha meere ndị obodo"

Ndị Iyom

Ebe foto si, Bianca Ojukwu

"O nwere ndị a na-echi 'Adaugo', 'Adaukwu' nke obodo ha maka iwetere obodo otu ihe maọbụ nke ọzọ".

Nze Ifeanyi sị na a naghị echi ụmụnwaanyị echichi dịka Nze maọbụ ọzọ n'ala Igbo kama nkwanye ugwu ka a na-akwanyere ha.

"A na-echi ụmụnwaanyị echichi ndị a, ha anaghị eyi okpu isiagụ maọbụ okpu agọrọ ndị nze na ọzọ, ha na-afụ naanị ịchafụ"

Kedụ onye kwesịrị ichi nwaanyị echichi?

Onye ndu obodo na ụmụnwaanyị e chiri echichi

Ebe foto si, Goge Africa

Nze Ifeanyi sị na ọ bụghị onye okenye ọbụla tozuru ogogo ichi nwaanyị echichi n'ala Igbo.

Ọ sị na ndị na-echi ha echichi bụ Igwe maọbụ Eze, onye ọzọ nwekwara ike ichi ha echichi bụ onyeisi ọha obodo a kpọrọ 'president general'.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụghị naanị n'obodo a mụrụ nwaanyị maọbụ nke di ya ka a na-echi ya echi echi.

"Obodo ọzọ nwereike ichi nwaanyị echichi maọbụrụ na o nwere ihe o meere ha nke zuru ichi ya echichi ahụ."

Ọmụmatụ echichi ndị a gụnyere;

Ezenwaanyị

Martha Dunkwu, Omu nke Anioma

Nke a bụ echichi a na-echi nwaanyị dịka onye ndu n'obodo ya.

Obodo dịka Anioma na Delta Steeti nwere Ezenwaanyị a na-akpọ Ọmụ Anioma. Ọ bụ ya na-ahụ maka ụmụnwaanyị, ahịa nakwa arụsị ndị obodo.

Ezenwaanyị a (Omu) anaghị alụ di, ọ bụ nwoke ma bụrụkwa nwaanyị.

Iyom (Otu Odu)

Nke a bụ echiche e mere naanị ụmụnwaanyị n'ala Igbo.

Ụmụnwaanyị a na-echi ya bụ ndị nwere agba n'obodo. Ọ dị ka echichi Igbo ọzọ a na-echi ụmụnwoke.

Tupu e chie nwaanyị ọbụla echichi a, ọ na-enwete nkwado n'aka di ya, ụmụnne nakwa ụmụnna ya.

Nwaanyị e chiri iyom

Ebe foto si, Goge Africa

A na-ahụta kaarị echichi Iyom n'obodo dị iche iche n'Anambra Steetị.

Ugoeze

Dịka aha ya siri dị, ọ pụtara 'ugwu' dịịrị onye Eze, ọ bụ echichi a na-echi nakwa aha a na-etu nwunye Igwe maọbụ Eze.

A na-echi ya nwaanyị ọbụla e chiri di ya Eze maọbụ Igwe obodo, ọrụ ya bụ ịhụ maka ọ dị mma ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka n'obodo.

Ụmụnwaanyị e chiri echichi n'ala Igbo

Ebe foto si, Goge Africa

Lọlọ

Nke a bụ otu n'ime echichi a na-echi ụmụnwaanyị n'ala Igbo. A na-echi ya nwaanyị nwere bara ọgaranya. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ echiche e chiri nwaanyị ọbụla e chiri di ya ichie (chief).

E nwekwara echichi ndị ọzọ a na-echigaasị ụmụnwaanyị n'ala Igbo. Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-echi echi Chief, ọkachasị n'oge ọgbara ọhụrụ.

Chimamanda na Igwe Achebe

Ebe foto si, Chimamanda Adichie

Iji maa atụ - na nso nso a, e chiri odeakwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie echichi 'chief' nke a kpọrọ ya 'Odeluwa' n'obodo ya bụ Abba dị n'Anambra steeti.

Echichi ya butere ọtụtụ okwu na soshal midia, ọtụtụ ndị sị na ọ dịghị mma ichi nwaanyị 'chief' n'ala Igbo na ọ bụ naanị ụmụnwoke ka e meere echichi ahụ.

Kedụ usoro e ji echi nwaanyị echichi?

Mgbe a na-echi Bianca Ojukwu echichi

Ebe foto si, Bianca Ojukwu

Nze Ifeanyichukwu sị na ọ bụrụ na ọha obodo chọpụta ọrụ nwaanyị ahụ na-arụ n'obodo, ha ga-akpọtụrụ ya ka e chie ya echichi.

Ọ bụrụ na o nwee mmasị, ọ ga-ahọrọ aha echichi ya, ndịisi obodo tụlee ya, ọ dị ha mma ha ga-echi ya echichi ahụ.

Mgbanolu

Nwaanyị ahụ ga-eme omenala dị n'ichi ya echichi ahụ.

N'ụbọchị ahụ, a ga-akpọku ọha obodo, nwaanyị a ga-ejikere ọfụ ma pụta n'ihu ọha obodo ebe igwe maọbụ onyeisi obodo ga-echi ya echichi.

Mgbanaka

E chichaa ya echichi ahụ, a ga-enye enye ọdụ enyi, nza, akụpe, mgbanolu, mgbanaka, mgbanụkwụ na ihe ndị ọzọ.

A ga-akọwakwara ya ihe ndị ahụ pụtara tupu e yinye ya n'ahụ ma kpunye okpu ma sị ọha mmadụ tuo ya aha echichi ya.

Aha otutu a na-etu ụmụnwaanyị e chiri echichi dị iche iche dịka aha ha siri chọọ maọbụ ndị chiri siri chọọ.

Ụfọdụ aha otutu ndị a gụnyere; Adaọha, Adaukwu, Osodieme, Odoziobodo, Nneọha, Agunwaanyị, Odoziakụ dgz.