Chieftaincy title: Ihe ọ na-ewe nwaanyị inweta echichi n'ala Igbo

Tonto Dike na Oge Okoye

Ebe foto si, Instagram/OgeOkoye/TontoDike

Nkọwa foto, Tonto Dike na Oge Okoye bụ ndị na-eme ihe nkiri na Nollywood
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Abịa n'ihe gbasara echichi n'ala Igbo, ụmụnwaanyị katara ahụ ka a na-echibu ya, mana ugbua ọtụtụ ndị na-echizi echichi n'agbọghọbịa.

Enweghị mgbe Igbo sọrọ nsọ nwaanyị ichi echichi, kama mgbe gboo naanị ụmụnwaanyị lụrụ di maọbụ nwere ezigbo ego ka ọ dịịrị ichi echichi, mana ugbua, afọ ole nwaanyị dị anaghị egbochi ya ichi echichi.

Ụmụnwaanyị na-eme ọfụma n'azụmaahịa maọbụ gụrụ akwụkwọ ọfụma chọrọ ichi echichi ga-echinwu ya ma ọ bụrụhaala na uche ya dị ya, ma bụrụkwa na ọ ga-emenwu ihe dị n'ime ya.

Gịnị dị na nwaanyị ichi echichi n'ala Igbo?

Tupu nwaanyị Igbo echie echichi, ego ji ọrụ. Ọ ga-eme ọtụtụ ihe e ji ego eme.

  • Ọ ga-azụta ma ji ma ede ma ọjị nakwa nnu
  • Ọ ga-ewetakwa ego nke a ga-ekesara ụmụnwaanyị ndị nọ n'otu ndị na-echi echichi
  • Ọ ga-azụta mmanya dị iche iche

Akụkọ kwuru na ihe kpatara e ji eme ihe ego otu a bụ ịmata ma nwaanyị na-achọ ichi echichi onwere ikike ịbụ "omere ọha" ma ihe ndapụta dapụta.

Ụbọchị a ga-akpọpụta ya n'ihu ọha ugboro abụọ ebe ọ ga-eji egwu duputa ụmụnwaanyị ndị ọzọ chiri echichi n'ihu ọha.

Ihe nwaanyị Igbo chiri echichi agaghị emenwu

Na nwaanyị chiri echichi agaghị eme ya ka o nweta ohere ime ihe ụmụnwoke ibe ya nwere ike ime.

  • Ịgba mmọnwụ
  • Ịlụ ọgụ maọbụ ịga agha
  • Ịwa ọjị
  • Ịrị osisi nkwụ

Ụmụnwaanyị Igbo na-ewuewu chiri echichi

Oge ụmụnwaanyị anọ a nwetara echichi ha, ha alụbeghị di.

1) Ome ihe nkiri bụ Genevieve Nnaji chiri echichi 'Eze Ada nke Amuzu Nweafọr' n'afọ 2014.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

2) Chika Ike bụkwa onye na-eme ihe nkiri chikwara echichi 'Akwa Ugo mbụ nke Amoli' n'afọ 2013.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

3) Oge Okoye nwetara echichi 'Igolo Nwaanyị mbụ nke Awgu' n'afọ 2013

Skip Instagram post, 3
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 3

4) Tonto Dike nwetara echichi 'Adadịọramma nke mbụ na Nollywood' ya n'afọ 2017

Skip Instagram post, 4
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 4

Akụkọ ga-amasị gị: