Igbo traditional wedding outfit: Uwe anyị na-eyi agba nkwu

Ebe foto si, Teyannasecret/Instagram
- Onye dere ya, Chioma Nkemdilim
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo Service
Ịlụ di maọbụ nwaanyị bụ ezigbo njem na ndụ mmadụ. Ọ bụ ihe mmadụ ole n'ole chọrọ ijide aka tupu ha ahapụ ụwa.
N'ala Igbo, nwoke gara ịlụ nwaanyị ga-amara na ọ bụghị sọọsọ nwunye ya ka ọ na-alụ. Ọ na-alụkwa ndị be ya niile. N'otu aka ahụ, nwaanyị na-alụ di na-alụkwa ndị be ya. N'ihi nke a, onye ọbụla siri n'ezinụlọ ha abụọ na-etinyekọta aka ịhụ na mmemme gbasara ndị a na-achọ ịlụ onwe gara nke ọma.
Ihe ukwu nke dị n'alụm di na nwunye bụ uwe ha ga-eyi n'ahụ makwa nke ndị ga-abịanụ ga-eyi.
Ndị a bụ uwe dị icheiche ndị be anyị na-eyi n'ala Igbo.
Ejiji pụrụ iche
Uwe nwaanyị na-alụ dị na-adị iche maka ọ bụ ya ka onye ọbụla ga-ekiri ụbọchị ahụ. Nke nwoke na-apụkwa iche nke ya.

Ebe foto si, Clarisbay/Instagram
Ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-eme ịgbankwu na-eyị uwe elu na nke mwụda. Ọbụghị iwu na uwe a ga-enwe otu agwa, mana agwa akwa nwaanyị ga-eyi ga-emejurịta ibe ya.
Aka uwe elu a nwere ike ịkwụsị ebe ọbụla. E nwere ike iji ọla akwa dị icheiche achọ ya mma. Uwe mwụda bụ ụdịrị akwa na-amasị ndị ibe nke nwunye na ndị agbọghọ bịara mmemme a. Ndị nwaanyị lụrụla di na-adị ama akwa n'ukwu.
Ndị nwoke na-eyi uwe elu na traụza. Ụfọdụ na-ama akwa n'ụkwu.
Uwe isi
Nke a bụkwa uwe ọzọ dị mkpa n'ejiji alụm dị na nwunye dịka omenaala Igbo sịrị dị.

Ebe foto si, Divalukky/Instagram
Nwaanyị nwere ike ịsụ ịchafụ n'isi. E nwere ike itinye ola uwe n'ịchafụ nke nwaanyị ka ọma ezigbo mma. Nwoke na-ekpu okpu isi. O nwere ike ịbụ okpu na-acha uhie uhie, edo na ndị ọzọ.
Ọla, akpụkpọ ụkwụ na ihe ndị ọzọ
Uwe a na-eyi n'igba nkwụ nwaanyị anaghị ezu oke ma ọbụrụ na ola dị icheiche adịghị na ya. Ọla ọcha, ọla edo, kọral, ọdụ na ọla a na-etinye n'akwa. Ha juru eju. Nwaanyị na nwoke na-agba uwe olu na nke aka. Ọzọkwa, nwaanyị na nwoke nwere ike iji ọdụ ịnyịnya. Nwaanyị nwekwara ike iji akụpe n'aka ma ọ chọọ.
Abịa na akpụkpọ ụkwụ, ndị nwaanyị na-eyi akpụkpọ ụkwụ mara mma. Ufọdụ na-eyi nke dị elu maọbụ nke ala ka ha nwe ohere ịgba egwu. Nke ndị nwoke bụ nke e ji akpụkpọ anụ mee.

Ebe foto si, Teyannasecret/Instagram
N'ikpeazu, nwoke nwere ike jide mkpọrọ o ji aga ije.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










