Nne ọmụgwọ, Ezenwaanyị, Agadi nwaanyị na aha ndị ọzọ a na-etu ụmụnwaanyị Igbo

Aha e ji mara ụmụnwaanyị

Ebe foto si, BBC/Regina Daniels/Instagram

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Ịmụta nwa nwaanyị n'ala Igbo bụ ihe oke aṅụrị maka na a na-ahụta nwaanyị dịka akụ.

Nwata nwaanyị a mụrụ ọhụrụ ga-agafe ogogo dị iche iche dịka ọ na-eto tupu o ruo na nka.

E nwere aha ndị Igbo na-agbakwunyere ogogo ọbụla ụmụnwaanyị ndị a ruru, nke na-egosipụta afọ ole nwaanyị gbara nakwa ọnọdụ ha nọ.

Aha ndị a na-amalite site na mgbe a mụrụ nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe ọ kara nka bụrụ agadi, nke gụnyere;

Aha ụmụnwaanyị n'ogogo dị iche iche

Ndị ọkachamara n'omenala Igbo gụnyere Durueke Nwangene na Ihunanya Anusiem tinyere ọnụ na nkọwapụta ọnọdụ ndị a.

Nwa nwaanyị

Jidenna Jesse Osondu

Ebe foto si, Abia Info

Nke a bụ aha a na-akpọ nwaanyị site na mgbe a mụrụ ya ọhụrụ ruo mgbe ọ gbara ihe dịka otu afọ.

Ọ bụrụ na o ruo afọ abụọ gawa afọ ,a kpọọ ya 'nwata nwaanyị na-etolite etolite'.

O nwereike ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị e bu ụzọ mụọ, a ga-akpọ ya 'Nwada nwaanyị'.

Obere agbọghọ

ụmụaka na-egwu egwu

A na-akpọ nwaanyị 'obere agbọghọ' ma ọ bụrụ na o tolite site n'afọ itoolu ruo afọ iri na itoolu.

Mgbe ahụ e nweela mgbanwe n'ahụ ya nke gụnyere; ịkpụ ara, ịgba ajị abụ na nke ngada, ịhụ nsọ ya nakwa mgbanwe ndị ọzọ.

Site n'afọ iri na asatọ gawa ruo afọ iri abụọ na otu, e nwereike ịkpọ ya 'Agbọghọ nwaanyị'.

Nwaagbọghọ tozuruoke:

Ụmụagbọghọ

Ebe foto si, nemz_photography

Ogogo a bụ mgbe nwaanyị tozuru etozu ịlụ di dịka mkpụrụosisi chara acha na-eche ọghụghọ,

Nke a bụ mgbe ọ gbara ihe dịka afọ iri abụọ na otu ruo afọ iri atọ.

Ọ nọ na di:

Nwaanyị lụrụ di ọhụrụ

Ebe foto si, Franklyn Idika

Nke a bụ aha a na-enye nwaanyị ma ọ bụrụ na ọ lụọ di. Mgbe ọ lụrụ di ọhụrụ, ndị mpaghara Bende n'Abia Steeti na-akpọ ya 'mgbirichi'.

Dịka nwaanyị lụchara di, aha ndị ọzọ a na-etu ya gụnyere Ori aku, Odozi akụ, Oso di eme, Oso di akpa akụ dgz.

Di ya maọbụ nwoke nwereike kpọọ ya 'nwunye m', mgbe ahụ ọ ga na-eme ihe a tụrụ anya n'aka ya dịka ị na-achịkọta ezinaụlọ.

Nne nwa maọbụ nne ọmụgwọ:

Nne ọmụghọ

Ebe foto si, Regina Daniels/Instagram

Ọ bụ aha a na-etu nwaanyị lụrụla di ma mụọ nwa maọbụ ụmụ.

Mgbe ọ mụrụ nwaanyị ọhụrụ ka a na-akpọ ya 'nne ọmụgwọ' mana ọ bụrụ na ụmụ ya tolite a ga-akpọ nwaanyị ji nwa maọbụ ji ụmụ.

Mgbe ahụ nwaanyị a nwereike nọrọ n'ihe dịka afọ iri abụọ na otu gbagoo elu.

Ọ bụrụ na nwaanyị lụọ di na-amụtaghị nwa, a na-akpọ ya 'Nwaanyị Aga' mana ọ bụ ọnọdụ mwute.

Ụfọdụ nwaanyị dị etu a na-anọ n'ihe iru uju, n'ihi na ụfọdụ ndị na-ahụta ya dịka osisi na-amịghị mkpụrụ na-eche ụbọchị a ga-egbutu ya.

Ugoeze na lọlọ:

Eze bụ nwaanyị n'Asaba

Ebe foto si, Getty Images

Dịka nwaanyị lụrụ dị ma mụọ ụmụ, na-azụ ụmụ ya ka ha na-eto n'otu aka ahụ ọ ga na-etokwa.

Ọ ga na-eto ruo ogogo e nwereike chie di ya echichi dịka Eze, Nze, Ọzọ maọbụ Ichie.

A na-eso na-echi nwaanyị dị etu a echichi dịka 'Ugoeze, Lọlọ. A na-akwanyere ha ugwu ebe ọ pụrụiche karịa ụmụnwaanyị ndị ọzọ.

Ezenwaanyị, Dibia na Nnekwu nwaanyị: Nke a bụ aha a na-etu ụmụnwaanyị maka echichi e chiri ha nke mere ha ji pụọ iche na ndị ọzọ.

Ezenwaanyị bụ aha a na-etu nwaanyị na-eme ihe mmiri, Dibia a bụrụ nke a na-etu nwaanyị na-eme ihe mmụọ ebe Nnekwu nne nwaanyị bụ echichi e chiri nwaanyị maka ọrụ ọma ọ na-arụ n'obodo.

A na-akwenyechara ụmụnwaanyị dị etu a ugwu pụrụiche.

Nwaanyị isimkpe (Ajad)

Nwaanyị na-ebe akwa ebe a na-eli mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eliri mmadụ 73 nwụrụ na mwakpo emere na Benue n'ọnwa Jenụwarị

Nke a bụ aha a na-akpọ nwaanyị lụrụ di ma di ya anwụọ.

Ọ ga-eji otu afọ ruo uju ọnwụ di ahụ ebe ọ ga-ewezuga onwe ya iche na-esoghi ndị mmadụ na-eme ihe ha na-eme.

Mgbe otu afọ gachara, a ga-eme omenala iji tọpụ ya na mkpe mana ọ ga na-azakwa nwaanyị isi mkpe.

Agadi nwaanyị

Mama Jessie Onuigwe

Mgbe nwaanyị tofere ajadu, o nwere ogogo ọ ga-eru mgbe afọ ya na-agbada ala, a kpọọ ya 'Agadi nwaanyị'

Ọ bụ nwaanyị nọrọla ndụ hụ ụmụ ụmụ ya, onye a na-akpọtụrụ n'obodo ma ihe sie ike.

A na-ahụta agadi nwaanyị dịka nwoke n'agbanyeghi na ọ bụ nwaanyị, a na-akwenyere ha ugwu dị elu n'omenala Igbo.

Agadi bụ ogogo ikpeazụ nwaanyị na-eru mgbe ọ katarala ahụ, n'ihe dịka afọ iri asaa na ise gbadawa ala.

Na nchịkọta, uru dị n'ịmata ogogo ndụ ụmụnwaanyị bụ maka igosi nsọpụrụ na nkwanye ugwu.

Igbo tụrụ ilu sị na "ugwu bụ nkwanye nkwanye mere nwaanyị ji mụta ibe ya."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Dele Momodu: Ndị mmadụ ahụla ugbua ihe Nnamdi Kanu na-alụrụ ọgụ ya