Gorilla glue girl video: Tessica Brown agaala ụlọọgwu ebe a ga-ewepụ 'packing gel' o ji nyaa onwe ya n'isi

Ebe foto si, Tessica Brown Instagram
Tessica Brown agaala ọtụtụ ụlọọgwụ mana oweghị nke nwereike ịwepụ gel o ji nyachie 'packing gel' ya ruo ugbua.
O wepụtara onyonyo gosiri ebe ọ na-egosi ahụ ụfụ mgbe a na-agba mbọ iwepụ ya bụ gel n'isi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Etu ihe si kwụrụ ugbua, Brown agwaala ndị nso nso ya na ọ na-aga ụlọọgwụ iwa ahụ maka ọnọdụ isi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Cheta na nwaanyị a si Louisiana dị n'Amerịka nweteburu onwe ya n'ụlọọgwụ ka o ji ihe nyachị akpọrọ "Gorilla glue spray adhesive" mee isi kama ijiri ụdị nke a ma ama eji eme isi.

Ebe foto si, TESSICA BROWN/GETTY
Nsogbu Tessica Brown wuru ewu na soshal midia na mbido February ka o kwuru na o buola otu ụzọ isi ruo otu ọnwa makana o ji ihe nyachị tara akpụ mee isi ya ka nke o ji emebụ isi gwụchara.
Brown kwuru na ọ saala isi ya ugboro iri na ise mana ihe nyachị ahụ ekweghị asachapụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 3
Ụlọọrụ Gorilla Glue depụtara na webụsaiti ha na ihe nyachị ahụ bụ nke siri ike ukwu nakwa e ji ya anyachị 'tiles' dị ebe a na-asa ahụ, ala na elu ụlọ.
Ọ bụ naanị mmanya na-aba n'anya nakwa Isopropyl were ike ịsachapụ ya
Ụlọọrụ Gorilla Glue zigara nwaada a ozi nkasiobi n'ọba ozi twitter ya.
Tessica gwakwara ndị mmadụ ka ha na-ekpere ya ekpere maka ihe ọ na-agabiga ugbua n'isi ya.
Ihe ụlọọrụ Gorilla Glue kwuru maka ọnọdụ Brown
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ha na-ekwusi ike na ihe nyachị ahụ abụghị maka ntụtụ isi makana ọ naghị apụ apụ ma ọ nyado ma na-egosi anụrị ha na Brown na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.
Ha gwara ndị na-azụ ahia ha na ha gụọ ịdọ aka na ntị edere n'ahụ ngwa ahịa ha tupu ha egoro ya.
Gịnị na-emezi ugbua?
Ụlọọrụ mgbasa ozi TMZ kwuru na Brown na-emete Tik Tok ọfụma ka bukwa isi ya ahụ bekee kpọrọ 'parking gel' ruo ugbua.
N'ozi ha, ogbugbu ụlọrụ GG wetere enyereghị Brown aka nke mere na ọ na-achọ ikpọpụ ụlọọrụ ahụ pụwa ụloikpe.
Ndị nọketere Brown gwara TMZ na ọ bụ elekere iri abụọ (22 hours) ka Brown nọọ n'ụlọọgwụ nke juru ndị nọọsụ anya , mbọ niile agbara iwepụ ihe nyachị ahụ tara akpụ kpụrụ afọ n'ala.
Brown esila na ntụkọta ego GoFundMe ruru $9,000 ma na -aga kwa n'ihu kwụọ ụfọdụ ụgwọ ụlọọgwụ.











