How to Link NIN: Etu ị ga-esi jịkọọ NIN na SIM kadị gị

Ebe foto si, NIMC/ Website
Cheta na gọọmenti etiti dọtịburu oge ụmụ Naịjirịa nwerike iji denye ma jịkọta akara NIN ha na SIM ha.
Kama n'ụbọchi Mọnde bụ ụbọchị anọ nke ọnwa maachị afọ 2022 ka Mịnịsta mgbasa ozi bụ Isa Pantami nyere iwu ka egbochie ndị na ejikọbeghị NIN na SIM kadị ha.
Etu ị ga-esi si n'ekwentị gị nweta akara 'National Identification Number' gị
I nwere ike ịmata akara njirimara onye Bekee kpọrọ "National Identification Number" (NIN) site na iji akara 'USSD, n'ekwentị.
Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka akara njirimara onye, a kpọrọ "National Identity Management Commission" (NIMC), sị ụmụ Naijiria ha pịa *346# n'ekwentị ha iji mata akara 'NIN'.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ NIMC nyere ndị Naijiria naanị izuụka abụọ iji were denye akara NIN ha n'akawụkwọ ndenye aha SIM ha meburula mbụ.
Onye ọbụla nọ na netwọk MTN, Airtel, 9mobile maọbụ Glo, nwere akara USSD nke ya..
Ọ bụ ngalaba na-ahazi nkwụrịtaụka n'ekwentị bụ NCC n'ịchafụ wepụtara amụma ọhụrụ nke mere ya iwu na onye ọbụla nwere ekwentị ga-etinyerịrị akara njirimara ya n'akwụkwọ ndebanye aha ndị nwere ekwentị.
Ọ bụrụ na i nwere ekwentị mana idebanyebeghị aha gị mbụ maka kaad njirimara NIN lee usoro ị ga-agbaso iji mee nke a:
Nzọụkwụ Mbụ
- Gaa na websaitị NIMC ka imejuo akwụkwọ maka onye chọrọ idebanye aha: https://penrol.nimc.gov.ng/loginForm.tpl.html.php
- Gbaa mbọ tinye nke bụ eziokwu n'ajụjụ nile dị n'ihu akwụkwọ na websaitị ahụ.
- Budata ya bụ ozi ma bipụta ya n'akwụkwọ a hụrụ anya.
Nzọụkwụ nke Abụọ
- Wega akwụkwọ ahụ i bipụtara n'ọnọdụ ndebanye aha nke 'NIMC' dị gị nso.
- Jirikwa asambodo maọbụ akwụkwọ akaebe nke ga-egosi na ozi niile idenyere bụ eziokwu.
- N'ebe ahụ, ha ga-egosi gị onye ọrụ ya bụ ibanye aha ndịị mmadụ. Onye ahụ ga-eleba anya n'ozi i denyere n'akwụkwọ iji mata ma ihe niile adịkwa etu o kwesịrị.
- Ọ bụrụ n'ozi ahụ idenyere dị n'anya ya, onyeọrụ ndenyeaha ahụ ga-akụziri gị etu ị ga-esi tinye akara mkpịsịaka (fingerprints) gị na foto ihu gị.
- E mechaa ihe ndi a nke ọma, onye ọrụ ndenye aha ga-ebipụtara gị akwụkwọ na-egosi na idebanyela aha gị.
Nzọụkwụ nke Atọ
Ịnata akara 'NIN' gị
- Oge o kwesịrị iwe tupu ị nata akwụkwọ akara njirimara 'National Identification Number' (NIN) gị bụ abalị ọrụ abụọ maọbụ atọ iji ga tinyecha akara mkpịsịaka na foto ihu gị n'ụlọọrụ 'NIMC'.
- Mana mgbe ụfọdụ, inweta akara 'NIN' nwere ike iwe oge karịa otu a dịka ha na-enyocha ozi iwetara ha.
- Ọ dị mkpa na i dowere ibe akwụkwọ ihe akaebe na idebabanyere aha ọfụma maka oge ị ga-achọ ịnata mbembe akwụkwọ akara NIN gị.
Kedụ etu ị ga-esi ama na Kaadị NIMC ọ dịla?
Gaa na websaịtị National Identity Management Commission [NIMC] website- www.nimc.gov.ng
Gaaa na mpaghara websaitị ahụ ebe e dere 'e-ID Card Status Portal' , pịa ya iji maata na ọ dịla nakwa ebe ị ga-aga were ya.
Tinye aha gị, aha nna gị nakwa akara NIMC nyere gị maka ịchọ ya ma pịa 'check now'.
Oge ijikọ NIN na akara ekwentị ga-ebi n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febuwarị afọ 2021
Onye na-ahụ maka ihe gbasara iwu obodo nke ndụ ụloọrụ National Identity Management Commission bụ Hadiza Dagabana gwara BBC Igbo na gọọmenti etiti Naịjirịa nyere maka ijikọ National Identity Number nakwa akara ekwenti ga-ebi n'ụọchị itolu nke ọnwa Febuwarị afọ 2021.
Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ruo ugbua ha enwetebeghị ya bụ NIN ma ya fọrọ ijikọ ya na ekwenti ha.
Cheta na ikwesiri ịjịkọ NIN gị na akara SIM Airtel,Glo na MTN iji eme intaneti.
Cheta na ndị ndịọrụ na-arụ na ngalaba "National Identity Management Commission' (NIMC) gbara abụbụọrụ nso nso a maka enweghị ngwaọrụ zuru oke ịrụ ọrụ ha.
Ndị mmadụ ka na-ege nti ka ha mara ma o nwere ihe ga-agbanwe tupu echi e nyere dịka ngwụcha eruo.
A malitebeghị usoro a ga-eji jịkọta NIN na BVN
Gọọmenti Naịjiria ekwuola na ha amalitebeghị usoro iji National Identity Number (NIN) nọchịe Bank Verification Number (BVN).
Nke a bụ ihe Uwa Suleiman bụ ọnụ kwụchitere 'Ministry of Communication and Digital Economy' gwara BBC dịka o na-ekwu okwu gbasara akụkọ na gọọmenti ewerela NIN nọchie BVN.
Akụkọ pụtaburu na minista na-ahụ maka teknụzụ na Naịjirịa bụ Isa Pantami kwuru mgbe ọ na-eduharị ndị ntaakụkọ iji gosi ha etu ịdebanya aha na NIN sị aga, na gọọmenti etiti nwere ebumnuche ịji NIN nọchie BVN.
Mana Uwa kwuru na ọ bụghị ihe mịnista kwuru ka ihe ahụ pụtara.
O kwuru na minista na-ekwu maka etu inweta NIN si dị ezigbo mkpa nakwa ezi nchekwa ọ nwere ruru pasenti 99.9.
Pantami kọwara na BVN bụ atụmatụ ebe NIN bụ iwu.
Gụọ ihe ndị Naijirịa na-ekwu maka nke a
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5

Ebe foto si, National Identity Management Commission
Gọọmentị Naịjirịa agbatịala oge ha nyere maka idebanye aha na NIN nakwa ijikọ ya na akara ekwentị site ugbua ruo izuụka asatọ na-abịa abịa.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ mgbasaozi n'ekwentị nakwa ụlọọrụ n'ahụ maka akara njirimara mmadụ.
Onye tinyere aka n'akwụkwọ a bụ minista mgbasaozi n'igwe ekwentị bụ Isa Pantami.
Cheta na a sịburu na idebanye aha ga-akwụsị n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Fenụwarị, 2021.