National Identification Number: E ji NIN a akpa ego?

Akwụkwọ njirimara onye nke Naijiria

Ebe foto si, Getty Images

Mpekele akwụkwọ njirimara onye - nke Bekee kpọrọ "National Identity card" - abụrụla okwu akpụ n'ọnụ ugbu a n'ala Naijiria dịka gọọmenti etiti kwuru na a ga-amalite iji akwụkwọ ahụ were na-eme ihe bido n'afọ 2019.

Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọtụtụ ndị mmadụ enweghị ya.

Ụfọdụ sịrị na ha amaghị maka ya, ebe ụfọdụ boro ebubo na ndị ụlọọrụ NIMC na-anaha ego tupu agbanye ha akwụkwọ ahụ.

Aha onyonyo, Ndị ụlọọrụ NIMC na-ana anyị ego tupu agbanye anyị akwụkwọ

Nwada Chisom Odinkemma boro ndị ụlọọrụ NIMC ebubo na mgbe ya gara na ogige ha dị na Shoprite Enugwu, a gwara ya kwụọ N500 tupu enye ya akwụkwọ ahụ.

Onye ọzọ aha ya bụ Ukamaka Ugwu gwara BBC na ya gara n' Enugwu North ịgbata nke ya ebe ha sịrị ya na ndị ọzọ tụta ego mmanụ eji etinye ọkụ n'igwe na-enye ọkụ.

Onye ọzọ achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ya aghọtaghị ihe akwụkwọ ahụ pụtara.

BBC Igbo gara n'ụlọ ọrụ ndị NIMC n'Enugwu mana onyeisi ha bụ HBC-Ogboko Chizoba anọghị n'oche ya ịza ajụjụ maka ebubo ndị ahụ.Onye ọrụ NIMC nke enyeghị aha ya sịrị na ọ bụ okwu asị na ụlọorụ ha na ana ndị mmadụ ego.

BBC Igbo gakwara ebe ndị ụlọọrụ ahụ na-agbanye akwụkwọ n'ọdọ ahịa Shoprite Enugwu were hụ na ya bụ ụlọọrụ na-ana ndị mmadụ N500 tupu edebanye aha ha.Ozi NIMC depụtara ihe ndị mmadụ ga-eji bịa were ya bụ akwụkwọ NIN gụpụtara ihe ndị dịka; asambodo ọmụmụ, International passport, affidavit, asambodo ụgwọ ọkụ, nakwa N500.

Ihe eji enweta kwụkwọ njirimara onye n'Enugwu

Ha dere ozi a dote n'elu tabulu ha jị arụ ọrụ.

ọgwakwara anyị laghachị n'izu ụka na abịa oge

Lee ụfọdụ ihe ndị eji ya eme:

NIMC
Nkọwa foto, Ụlọọrụ Nimc n'Enugwu
  • Eji ya achọpụta ọtụtụ ihe gbasara onye ya dịka, aha, ebe onye si, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ
  • Eji ya akwụ ụgwọ ahịa na mba ụwa niile, ma jirikwa ya e ziga ego site n'otu ụlọakụ were ruo n'ọzọ
  • Ọ na-enye nchekwa na nkparịta ụka ndị mmadụ, ya nakwa ime ka enwee ezi ntụkwasị obi na-atụmatụ azụmaahịa bụ ndị nke eji igwe kọmputa eme
  • Ọ ga-eme ka onye ji ya nweta ezi eji ahụike site na mgbakọ aka nke ụlọọrụ nchekwa ahụike akpọrọ National Health Insurance Scheme (NHIS)
  • Mpekele njirimara a nwekwara ike inyere ndị lara ezumike nka aka iji chekwa ma hazie ego ezumike nka ha.
Nimc
Nkọwa foto, Ndị ọrụ Nimc

Etu ị ga-esi nweta mpekele kaadị a:

Maka ịmata nke a n'uju, gaa na website ha bụ www.nimc.gov.ng