Akụkọ dị mkpa taa: Iwu bụ na ị ga-eji 'ID card' nke Naịjirịa bido na 2019
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ị ga-ejirirị 'ID card'gị

Ebe foto si, @nimc_ng
Ngalaba na-ahụ maka njirimara na Naịjirịa bụ National Identity Management Commission (NIMC), ekwuola na onye ọbụla ga-amalite iji akwụkwọ njirimara ya bido n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2019, site n'iwu gọọmentị etiti nyere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Iwu a na-ekwu na a ga na-eji akwụkwọ a eme ihe gbasara azụmahịa ụlọakụ, ndebanyeaha maka ịnata akwụkwọ ikike njem, akwụkwọ mkpuchi ahụike nakwa ịnata akwụkwọ e ji akwọ ụgbọala.
ADF ga-akwado 'restructuring'

Ebe foto si, Uzodinma Nwala
Ndigbo bi na mba Amerịka ekpebiela ikwado mkpebi ndigbo e mere n'ọgbakọ Enugu nakwa nke Anambra.
Ha kwuru na ha kwenyere na ala Igbo ga-akwụnwuru onwe ha ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị ekweghị ka a hazigharịa obodo Naịjirịa dịka o kwesịrị.
Na mba ofesi,
Mmiri ebufuola mmadụ abụọ isi na-ezuchaghi oke n'obodo Saụt Karolaịna dị na mba Amerịka.
Ndị uweojii kwuru na ọnwụ mmadụ abụọ ahụ nwụrụ n'ime ụgbọala ndị bulitere ọnụọgụgụ ndị oke idemmiri a gburu n'obodo ahụ ruo iri atọ na asaa.

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe a ga-ebido ịgba asọmpi Champions League nke abalị a, Man City na Lyon ga-ezute, ebe Real Madrid na Roma ga-ama mbe n'abọ nke bụ oke n'etiti ha.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Enyimba nke Aba na otu Rayon nke Rwanda ga-akwata isi n'isi n'Aba taa n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi iko CAF Confederation afọ 2018.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Enyimba lọtara ka ha na ndị Rayon gbara onwe ha onye laba onye laba mana ha bụ enyi kwenyesiri ike na ha ga-ememina ndị Rwanda taa.
Ọ bụrụla ihe ịgba anya mmiri ihe idemmiri na-eme na steeti dị icheiche ọkachasị Anambara steeti na ebe ndị ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ kwuru n'oke idemmiri emiela ụlọakwụkwọ mahadum nke Federal Polytechnic dị n'Atanị, n'okpuru ochichi Ogbaru na steeti ahụ.
Naịjirịa
Mana gọọmenti etiti ebela akwa arịrị banyere ya bụ nsogbu ebe onyeisiala Muhammadu Buhari kpọrọ ya ọdachi megide ala niile.

Ebe foto si, Getty Images
Buhari nyere iwu ka ngalaba gọọmenti niile were ikike ha na ihe niile ha nwere nyere ndị ọdachi a metụtara na stetti niile dị na Naịjirịa aka.
Ọ sị n'ụfọdụ ndị sineti na ndị nchekwa so kpa nkata izu ọfọ n'imeụlọ sineti.
Akụkọ mba ofesi
N'ofesi, Nọt Koriya ekwetala imechi otu n'ime ebe kachasị ọ na-emepụta ma na-anwale ngwọagha nuklia na mba ha dịka onyeisi mba Saụt Koriya si kwuo.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a na-abịa ka ndị isi mba abụọ ahụ zutere n'ọgbakọ na Pyongyang ma kwekọrịta etu ha ga-esi wezuga ngwọagha nuklia ha nwere.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:










