Ihe ụmụakwụkwọ chọrọ ide JAMB na-agabiga maka inweta akara NIN

Ihe karịrị ụmụakwkwọ puku abụọ bụ ndị wụsara n'ụlọ ọrụ MIMC n'Enugwu n'ihi na Jamb amaala ọkwa na onye ejighị ya bụ "national Identity number"(n'Enugwu,Legọs) agaghị ele ule ahụ na 2020.
Ụmụakwụkwọ ahụ na awụghari ụlọ ọrụ ndị NIMC ahụ nke dị na Emene Enugwu dịka igurube.
Nwata akwụkwọ anyị gbara ajụjụ ọnụ bụ Maduabuchi Kingsley kwuru na ọ bụ ka mgbe afọ gara aga ka ya malitere gawa ije inweta ya bụ NIN.
Ụfọdụ mmadụ na-ajụ ihe kpatara o jiri daa ọtụtụ ụmụakwụkwọ na mberede dịka Jamb marala ọkwa ahụ afọ gara aga.
Otu n'ime ụmụakwụkwọ o metụtara bụ Kingsley Mmaduabụchi gwara BBC Igbo na ya bidoro ịgba mbọ idenye aha ya n'afọ 2019. "
"M bịa , ha sị m bịa echi, ya bụ, ọ bụghị taata ka m bịara."
Kingsley tụtụ arịrị na"ndị mmadụ karịrị. Ha na-elekwa anya n'ihu were enye ya."
Mana kwaa arịrị na ka ọ dị ugbua na ya enwetabeghị ya n'ihi na ọghọtaghị ihe mere ndị ọrụ NIMC ji asị ha bịa ta bịa echi.

Ụmụakwụkwọ ndị ọzọ kọwakwara na ha ataala ahụhụ nke ukwuu iji nata ya bụ NIN wee yọọ gọmenti ka ha mee ka usoro ịnweta ya diwanye mfe ka ha wee ghara inwe nsogbu na Jamb.

Ka ọ dị be oke, ka ọ dị na be ọgịnị dịka ụmụakwụkwọ nọ na Legọs na-agabigakwa otu ihe ahụ.
Igwurube ụmụakwụkwọ juputara n'ọtụtụ ụlọọrụ NIMC dị na Legọs.
Otu nwaakwụkwọ bịara n'ụlọọrụ NIMC dị n'Okpuruọchịchị Oshodi na Legọs achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ike ya bụ ahụhụ agwụla ya, na ya ga ala chere Jamb afọ ọzọ.

Kepukepu na-efegharị na soshal midia na ebokwa ebubo na a na-ana ụmụakwụkwọ aka azụ tupu enye ha akara NIN.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana Tomiwa Olatunji, nwa akwụkwọ BBC Igbo gbara ajụjụọnụ n'ụlọrụ NIMC,Oshodi kwuru na o nweghị onye nara ya aka azụ.
Olatunji onye kwuru na ya debanyere aha ya ụbọchị Tọzde ma nweta akara ahụ n'ụtụtụ Fraide sị, "Naanị nari naira abụọ bụ ihe a nara m."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, NIMC
Ozi ụlọọrụ bipụtara n'igwe okwu Twitter sị ụlọọrụ ha bụ na "ndebanye aha bụ n'efu," ma kpoo oku ka onye ọbụla a nara ego wetara ha ozi.











