Igbo Entrepreneurs: Ụmụafọ Igbo iri bụ 'entrepreneur' kajara akaja

Innocent Chukwuma,Stella Okoli na Innocent Chukwuma

Ebe foto si, Chicasson/Emzor/Innoson

Dịka a na-ekwu na ndị Igbo bụ ndị e ji ịzụ ahịa wee mara, lee ụfọdụ ndị Igbo ma nke ha riri gbasara iji ego achụ ego nakwa ikepụta ọrụ n'ala Naịjirịa.

Ịgba mbọ abụghị ihe na-atụ ndị Igbo ụjọ, mana e nwere ndị aha ha ka nke ndị ọzọ ada ụda, na ndị kpatarala akụ na-enye ndị ọzọ ohere ịkpata akụ nke ha.

Ndị a bụ ndị bekee na-akpọ 'Industrialists'.

1) Innoson Group - Innocent Ifediaso Chukwuma

Innocent Chukwuma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Innocent Chukwuma

Chukwuma bụ onyeisi ụlọọrụ Innoson Group.

Chukwuma bụ onye Ụmụdim nke dị na Nnewi, Anambara steeti.

O bidoro iji aha Innoson Group azụ ahịa n'afọ 1981.

Ihe Innoson Group na-emepụta gụnyere:

Ndị ọrụ Innoson na-arụ ụgbọala

Ebe foto si, @innosonvehicles

  • Ọgbatumtum na akụrụngwa ya
  • Keke na akụrụngwa ya
  • Ngwa ụlo na Plastiki
  • Ihe e ji echekwa ndụ
  • Akụrụngwa latrik
  • Ụgbọala dị iche iche na akụrụngwa ha

2) IBETO Group - Cletus M. Ibeto

Mazi Cletus Madubugwu Ibeto bụkwa nwaafọ Nnewi nke dị n'Anambara steeti a ma ama dịka oji ego achụ ego.

A mụrụ ya n'afọ 1952.

O bidoro dịka ọkwọụgbọala na onye na-arụzi ụgbọala.

Ibeto gbaara Lawrence Amazu nke nwe 'Chidiebere Transport Company' odibo tupu o bidozie nke ya.

Ihe IBETO na-eme gụnyere:

  • Sịmentị e ji arụ ụlọ
  • Akụrụngwa ụgbọala
  • Mgbere ụlo obibi na ala (Real Estate)
  • Ahịa mmanụ ụgbọala, dgz

3) Chicason Group - Alexander Chika Okafor

Onyeisi ụlọọrụ Chicason Group

Ebe foto si, Chief Dr. Alex Chika Okafor/Facebook

Nkọwa foto, Alex Chika Okafor Onyeisi ụlọọrụ Chicason Group

Alexander Chika Okafor bụ onyeisi ụloorụ Chicason Group nke dị na Nnewi, Anambra steeti.

Ọ bụ onye Ụmụdim, Nnewi, Anambara steeti.

Ọ bụ n'afọ 1981 ka o bidoro ịzụ ahịa.

Ihe ChicasonGroup na-eme gụnyere:

  • Ahịa mmanụ ụgbọala
  • Ahịa ala na ụlọ obibi
  • Igwuputa akụ ọnatarachi
  • Ụlọọrụ na-emepụta mmanụ e ji esi nri
  • Ụlọọrụ na-arụpụta ncha
  • Plastiki na akụrụngwa ụgbọala
  • Ụlọọgwụ
  • Okpu mgbochi (helmet)
  • Ụgbọala na-ebu kọntena

4) Erisco Foods Limited - Mazi Eric Umeofia

Mazi Eric Umeofia

Ebe foto si, @IsaacFAdewole/Twitter

Umeofia bụ onyeisi 'Erisco Foods Limited'.

Ọ bụ onye Amichi nke dị n'okpuruọchịchị Nnewi Saụt, Anambara steeti.

O bidoro ịzụ ahịa akụrụngwa ụgbọala n'afọ 1983 na Sokoto.

Aha onyonyo, Ọgbambọ: Ị ma Erisco? Lee ka N4200 sị mụtara ya ụlọ mmepụta tomato kachasị n'Afịrịka

Umeofia bụ onye ọ na-amasị inyere ndị mmadu aka.

Ihe Erisco Foods Limited na-eme

Ihe e jiri mara ụlọọrụ Erisco bụ:

  • Osikapa
  • Nnu
  • Tomato agbara na mkpọ
  • Ọtọ bịrịbịrị (Sugar)
  • Chọkọleti
  • Mmiri ara ehi
  • Ngwa nri, dgz

5) Coscharis Group - Cosmas Maduka

Cosmas Maduka

Onyeisi ndị ụloọrụ Coscharis Group bụ Cosmas Maduka bụ nwaafọ Nnewi nke dị n'Anambara steeti.

A mụrụ ya n'afọ 1958 n'obodo Jọs dị na Platu steeti.

O bịdoro ịzụ ahịa mgbe ọ dị afọ iri na asaa.

Ọ bụ n'afọ 1977 ka o bidoro ụloọrụ Coscharis site n'ire akụrụngwa ụgbọala.

Ihe Coscharis Group na-eme

  • Ha na-ere ma na arụziri ndị omee ụgbọala 'BMW', 'Ford', 'MINI', 'RollsRoyce', 'Jaguar', 'Land Rover', dgz ụgbọala ha na Naịjiria.
  • Akụrụngwa Teknụzụ
  • Ngwa nri nke gụnyere mmiri, osikapa na mmiri ara ehi
  • Akụrụngwa ndị ụloọgwụ ji arụ ọrụ
  • Orụ ugbo dị iche iche

6) Airpeace - Allen Onyema

Allen Onyema

Ebe foto si, Airpeace

Nkọwa foto, Allen Onyema bụ onyeisi ụlọọrụ Airpeace

Mazi Allen Onyema bụ ọnye obodo Mbọsị nke Ihiala dị n'Anambara Steeti.

A mụrụ ya n'afọ 1964 na Bini dị n'Edo steeti.

Ọ bụ onye ọkaiwu tupu ọ malite ụlọọrụ 'Air Peace' n'afọ 2013.

Ihe Airpeace na-eme

Airpeace bụ ụlọọrụ njem ụgbọelu.

7) Kotec Group of Companies - Chika Emenike

A mụrụ Chika Emenike onye bụ onyeisi 'Kotec Group' na 'Tummy Tummy noodles' n'afọ 1969 n'Amanatọ Ụzụakọlị dị n'Uruala, Ideatọ nke Imo steeti.

Ọ bụ site n'ire akụrụngwa ọgbatumtum ka o si bido ịzụ ahịa ndị ọzọ.

Ihe Kotec na TummyTummy na-eme

  • Akụrụngwa e ji arụzi ọgbatumtum
  • Akụrụngwa e ji arụzi ụgbọala
  • Ihe e ji achọ ụlọ mma
  • Ihe oriri a na-akpọ 'Noodles'
  • Mmiri ọṅụṅụ

8) Loius Carter - Louis Onwugbenu

Mazị louis Onwugbenu bụ onyeisi ụlọọrụ Louis Carter bụ nwaafọ Uruagụ Nnewi, Anambara steeti.

A mụrụ ya n'afọ 1953.

Ihe Louis Carter Group na-eme

  • Akụrụngwa ụgbọala ọkachasị 'Brake Pad'
  • Ihe oriri
  • Mmiri ọṅụṅụ
  • Ọgbatumtum
  • Akwụkwọ ụtaba

9) Orange Group - Mazi Tony Ifeanyichukwu Ezenna

Mazi Tony Ifeanyichukwu Ezenna bụ onye Akọkwa nke Ideato, Imo steeti.

A mụru ya n'afọ 1957.

O bụ n'afọ 1988 ka 'Orange Drugs' bidoro ọrụ.

Ihe Orange Group na-eme

  • Ha na-emepụta ma na-ere ọgwụ dị iche iche maka ahuike
  • Ncha eji asa ahụ

10) Emzor Pharmaceuticals - Stella Chinyelu Okoli

Stella Okoli

Ebe foto si, Facebook/Stella Okoli

Nkọwa foto, O nwetala nturuugo Officer of the Order of the Niger, OON nakwa Member of Order of Nigeria, MON

Stella Okoli bụ onye Nnewi dị n'Anambara steeti.

O so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ahụike na Naịjirịa.

A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Julaị nke afọ 1944.

Ọ bụ n'afọ 1977 ka ọ malitere Emzor Pharmaceuticals dịka kemist.

Ihe Emzor Pharmaceuticals na-emepụta:

  • Ụlọọrụ ya na-emepụta ọgwụ ndị mmadụ na-eji achụ ọrịa dị iche iche.

Ndị a edepụtara ebe a abụghị naanị ndị oji ego achụ ego e nwere n'ala Igbo.

E nwekwara ndị ọzọ dịka Leo Stan Ekeh nwere Zinox Kọmputa nakwa Konga.com, dgz.

Zitere anyị ndị ọ dị gị ka aha ha e kwesịrị ịdị ebe a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị