Coscharis Group: Etu N200 jiri gbanwe bụrụ ide ego n'aka m

Cosmas Maduka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onye ojiego achụa ego a ma ama bụ Cosmas Maduka onye e ji Coscharis mara, kọwara etu o siri bụrụ ide ego na mkparịta ụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Tọọzde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2019.

Maazị Maduka sị na ya bidoro njem ịchụ ego ya n'ịgba bọị, tupu nna ya ukwu eji narị naịra abuo duo ya n'afọ 1976.

Lee etu o siri gbarie njem ya:

Etu o sibido

Maduka kọwakwara etu o si malite njem azụmahịa ya wee ruo n'ogogo ọ nọ ugbua.

Ọ kọwara na "Coscharis" bụ nchịkọta aha ya na nwunye ya bụ Cosmas na Charity.

Ọ kwụsịrị agụmakwụkwọ n'elementarị nke atọ ma bido ịmụ ahịa n'aka nna ya ukwu bụ onye ji naanị N200 dụọ ya ụlọ n'afọ 1976.

Ọ bụ ahịa akụrụmgwa ọgbatumtum ka o jiri bido.

Ihe mere Cosmas Madụka jị bụru Ide

1) Ndụmọdụ na nkwado Nne ya

"Agụụ chineke mere ka m hara igahe ụzọ." Cosmas Maduka

Nne ya bụ ezigbote onye na-ekpere chineke, ọ gwara ya ka ọ nwee okwukwe na Chineke nakwa n'ime onwe ya.

Nne ya kuziri ya etu e si ekpe ekpere ma nye ya ndụmọdụ etu o ga-esi bie ezigbo ndụ.

Mama Madụka mere ka ọ nwee ezigbo olileanya na okwukwe na ihe ga-agaziri ya.

Madụka sị na onweghi ike iwepụ anya n'ebe Chineke nọ.

2) Inwe atụmanya makaọdịnihu

Cosmas na Charity Maduka, Tony Elumelu na Dele Momodu

Ebe foto si, @DeleMomodu

Nkọwa foto, Cosmas Madụka dị afọ iri na itolu mgbe ọ lụrụ nwunye ya

"Onweghị ihe dịka ihu ụzo (Vision) ọ ga enyere gị aka imata ihe i ga-eji nd g mee." Cosmas Maduka

Mazi Cosmas Maduka rịọrọ ndị ntoroọbịa ka ha bido n'oge chụwa ewu ojii.

Madụka kwuru na onweghị ihe o mere ma mmadụ bido n'afọ iri na abụọ nwee ihe ọ na-atuanya n'ime ndụ ya.

o kwuru na ihe niile abụghị ihe ndapụta maka na e nwere iwu na-ahazị ihe n'ụwa.

Mazi Madụka kwuru na mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọ marala ihe ọ chọrọ ibụ.

Ọ dekwara n'akwụkwọ na tupu ọ ruo afọ iri abụọ na atọ na ọ ga-ego ụgbọala nke ya.

Ọ sị na o mezuru nke a ka o si dee ya.

Ọ gwara BBCIgbo na ihe mmadụ na-eme taa ga-egosi ihe ọ ga-abụ na mgbe na-adịghị anya.

3) Onye ọbụla kwesiri inwe onye nduzi (Mentor)

Onye ọ bụla kwesiri inwe onye ga-edu ya ma soro nzọ ụkwụ onye ahụ.

O kwuru na ọ bụ mgbe ọ gbara nna ya ukwu "Boy boy", ka ọ chịkwara onwe ya ma soro ezigbo nzụ ụkwụ dịka nwata.

4) Igba mbọ na ịkwụwa aka ọtọ

Mkpuhe ụgbọala Ford

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Coscharis bụ ndi nnochite anya FORD na Naijirịa

" Ego 'dot.com' ga efukwa ka 'dot.gone' " Cosmas Madụka

Cosmas Maduka gwara BBC na ebe ọbụla mmadụ chọro i ga n'ụwa a, ọ gbado anya ọ ga-erute ya.

Mana ọ dị kwa mkpa ka onye ahụ kwụwa aka ya ọtọ.

Ọ sị na ọ bụ ndị Japan mepere ya ụzọ n'ahia.

O kwuru na ọ bụ ikwụwa aka ya ọtọ mere ka ndị ụlọọrụ Japan tukwasị obi n'ebe ọ nọ ma mepere ya ụzọ.

Maduka kwukwara na ọ bụ ezi omume a mere ka ụlọọrụ ya bụ Coscharis ji na-anọchite anya ụlọọrụ dịka Jagua, Rolls Royce, Range Rover na Ford na Naịjirịa.

5) Uzọ ndụ

"Ndi enweghị ebe ha na-aga ga-achọ ka gị na ha nọrọ n'otu ebe." Cosmas Maduka

Ọ naghị ele ihe onyonyo, kama ọ ga-ele ihe onyonyo ya gụọ akwụkwọ.

Enweghị ihe onyonyo mekwara ka ya na nwunye nwee ezigbo mmekọrịta.

Ọ bụ akwụkwo mgbasa ozi ka o ji amata ihe na-eme.

Mazi Madụka na-eri ezigbote nrị na-edozi ahụ.

6) Ichụso ọdịnihu

Mazi Maduka nwere ala rụrụ oke ala 3,000Ha ebe ọ kọrọ osịkapa n'Anambra steeti.

Kama ọ bụ naani 1,200Ha ka ha na-akọ ugbua.

Ọ kwuru na Naijirịa na-emefu Ijeri naịra atọ n'ibubata osikapa, na ọ chọrọ inweta pasentị iri abụọ na ise (25%) n'ime ego a.

Ọ ka na arụ ya, mgbe ọ rụchara ọ ga-enye ndị mmadu ruru 3,000 ọrụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Akara ntụ-ntụ

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara

Akụkọ ga-amasị gi

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Migration: Ntaramahụhụ ụmụ Afrịka na-agabiga n'ịga mba Amerịka