School building fire: Ọkụ agbagbuola ụmụaka ruru 26

Igwe mmadụ gbakọrọ na nso ebe ọdachị ahụ mere
Nkọwa foto, Igwe mmadụ gbakọrọ na nso ebe ọdachị ahụ mere
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọkụ bidoro n'ụlọobibi ụmụakwụkwọ agbagbuola o pekata mpe ụmụaka ruru 26 n' isi obodo Liberia bụ Monrovia.

Ụmụaka ndị a dị agbata afọ iri na afọ iri abụọ na-arahụ ụra n'ụlọ dị nso n'ụlọụka Alakụba oge ọkụ ahụ bidoro n'ụzọ ụtụtụ taa bụ Wenezde.

Ndị uweojii mba ahụ gwara BBC na a ka na-achọ ozu ndị nwụrụ anwụ.

Naanị otu onye nkuzi nakwa ụmụakwụkwọ abụọ bụ ndị zọtara isi onwe ha n'ọdachị ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Moses Carter gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters na ọ bụ nsogbu metụtara ọkụ latrik butere ọdachi ahụ mana na ha na-aga n'ihu na nnyocha ha.

Mapụ

Ka ọ dị ugbua, onyeisiala mba Liberia bụ George Weah ezipụrụla ezinaụlọ ọdachi ahụ metụtara ozi iti aka n'obi n'akara Twitter ya.

O kwuru sị na "ekpere m na-agara ezinaụlọ ụmụaka nwụrụ oge ụlọakwụkwọ gbara ọkụ n'abalị n'obodo Paynesville."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Onye ntaakụkọ BBC bụ Jonathan Paye-Layleh, onye nọ si ebe ihe mere zite akụkọ kwuru na ụgbọ na-ebu ozu nke otu 'Red Cross abịala bupụ ozu ndị a.

A na-elekwa anya ili ozu ụmụaka ndị ahụ n'ehihie taa bụ Wenezde.

Akụkọ ka na-abịa.