Budget 2018: Ndị na-eme ngaghariwe chọrọ ka Saraki na Dogara rituo n'ọkwa

Ebe foto si, @NGRSenate
Ọgbaghara dapụtara n'ụlọomeiwu ukwu dị n'Abuja dịka ndị na-eme ngagharị iwe wakporo ebe ahụ na-ekwu ka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na ogbo ya nke ụlọomeiwu nke nta bụ Yakubu Dogara, tinye akwụkwọ arụkwaghịm.
Ndị otu a kpọrọ 'Citizens' Action to Take Back Nigeria (CATBAN)', n'ụbọchị Tuusde, Julaị 3, na-ebo ndị ụlọomeiwu ebubo izupụ ego a kwadoro maka ọrụ na mpaghara ha na-anọchite nakwa iwepụ ego ma tinyekwa ebe ụfọdụ na Bọjetị 2018.
Ụfọdụ ozi dị n'akwụkwọ ha ji egosi iwe ha na-ekwu sị: Saraki, tinye akwụkwọ arụkwaghịm, kwụsị ịkwa ndị nwụrụ anwụ emu; "Ndị ụlọomeiwu si azụ ụlọ etinye ihe na bọjetị emetọọla ọrụ ndị ụlọomeiwu kwesịrị ịrụrụ ndị ha na-anọchite, o kwesịrị ka a hazigharịa ya."
Onyeisi otu ahụ bụ Ibraheem Wala, kwuru na aka ndị isi ụlọomeiwu adịghị ọcha ịnọ n'ọkwa ha.
Wala kwukwara, "O doro anya na ihe ha gbakwụnyere na bọjetị dị nnukwu nke gosiri oke mpụ nke mkpakwasa ụkwụ ya bụ ịhazihari bọjetị."
Ọ kpọrọ oku ka a nwụchie ma kpụpụ n'ụlọikpe ndị mere mpụ a n'ụlọomeiwu.





