New Year's Day: Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’

- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ka a na-abanye afọ iri ọhụrụ nakwa agba ọhụrụ ọzọ, ọtụtụ ihe agbanweela nke bụ na ụfọdụ ndị a mụrụ n'otu oge agaghị amata ihe ha bụ.
Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị dịbu adị mana ụmụaka a mụrụ n'oge Bekee kpọrọ 'Generation Z' (site n'afọ 1999 ruo ugbua), amaghị ya dịka etu a ọ dịbu.
Ha mazị ya ugbua site n'ụzọ ọgbara ọhụrụ e si rụgharịa ya, nke bụ na ihe ndị ahụ adịla mfe iji n'aka na-akpagharị ma ị chọọ.
Lee ụfọdụ ihe ndị ga-agba ụmụaka 'Generation Z' gharịị:
Kaseetị 'Cassette player':

N'ihe karịrị afọ iri gara aga, a na-etinye ihe a kpọrọ 'kaseetị' n'ime igwe okwu na-enwekarị ma redio ma ihe na-akpọ ya bụ kaseetị, tupu ị gere egwu.
Mana ugbua, e nweela ihe dị ka 'YouTube', Audio Mack, Spotify, Boom Play na ihe ndị bụ ebe ị ga-esi butuo egwu ọbụla masịrị gị, tinye ya n'ekwentị gị maka igere ya oge ọbụla ị chọrọ.
Ọ bụrụkwanụ na ị chọghị ibutu ya ebutu, ị nwereike lere ya ka vidio n'elu ịntanetị mgbe ọbụla ị chọrọ.
Ka ọ dị ugbua, ekwentị niile a na-arụpụta ugbua na-ebu redio n'ime ya; nke ọ ga-abụ ịkwụnye ihe ntị ya nke bekee kpọrọ 'earphone', ọ bụrụzịa gere gawa.
Ekwentị:

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụrụ na ị ma mgbe a na-eji ekwentị a akpọ mmadụ, e kwesịrị ka a na-akpọ gị 'daa' maọbụ 'dee'.
Makana ọ gafeela afọ iri abụọ (20) e wepụtara nke a na-ejizi n'aka nke bekee kpọrọ 'mobile phone'.
Ndị ma ekwentị a ma ihe ha ji anya ha hụ gbasara ịkpọ mmadụ. Ọ pụtara na onye ahụ ga-anọgodu nso ya bụ ekwentị tupu ọ zaa ya.
Mana ugbua, ọ bụghị naanị na ị ga-anọnwu ebe ọbụla zaa ekwentị gị ma mmadụ kpọọ gị, ị ga-ejinwu ekwentị gị nweta ozi maọbụ chọta ozi site n'ihe a kpọrọ 'ịntanetị'.
Ihe e ji emepe komkom

Ebe foto si, Science & Society Picture Library
N'agbanyeghi na ụfọdụ ka na-eji mma emepe komkom, e nwere ihe a rụpụtara iche a n-eji emepe ya.
Ihe ahụ nke bekee kpọrọ 'tin cutter', bụ ihe a na-eji agba komkom okirikiri.
Tupu afọ 2000 eruo, a na-eji nke ọ ga-abụ ị sụnye n'ime komkom ị were aka gị na-akụ n'elu ya, megide etu a wee gazuo okirikiri okwuchi komkom ahụ.
Mana ugbua, egwu adagharịala makana ndị nke a na-arụpụta ugbua anaghị ata ndụ mmadụ ahụhụ.
Akwụkwọ ozi ịhụnanya (Love letter):

Ndị agba ọhụrụ a ka ma na a na-ede leta ugbua?
Mgbe ochie bụ na ị ga-ede akwụkwọ ozi, nye mmadụ ka o nye onye i deere ya, maọbụ gaa n'ụlọorụ nzipu ozi a kpọrọ 'post office' ịga zipu ya.
Mana ụbọchị agbanweela ugbua, kama ogologo usoro ahụ, ị ga-edenwuzi ihe bekee kpọrọ 'text message' n'elu ekwentị gị, zipu ya na-erughi otu nkeji, onye ahụ asakwaa gị ozugbo.
Nke ugbua bụ na ị nwere ike zie onye ị chọrọ izi ozi, ihu na ihu site na nke a kpọrọ 'video call'.
Owu e ji akpa isi:

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụaka ọgbara ọhụrụ nwereike ha ahụtubeghidị owu isi a anya mbụ makana a na-achọzị ya achọ n'ahịa.
Mana oge ọ na-ewu, ihe a bụ ihe e ji eke isi dị iche iche, na-achọ mma n'ụzọ pụrụ iche. Akụkọ kwukwara na ọ na-enye aka ime ka ntutu mmadụ too ogologo.
Ugbua, kama iji isi owu kee isi, e nweela nke a na-akpọ 'attachment', 'weaveon' nakwa ndị ọzọ dị iche iche a na-eji eke isi.
'Typewriter'

Ọ bụrụ na ị ji taịpraịta gụọ akwụkwọ maọbụ rụọ ọrụ, ekelekwaa m gị oo!
Kọmputa pụtara ụwa napụzịa taịpraịta ọrụ ọ na-arụ bụ iji ya ebi ihe n'akwụkwọ.
Ugbua, kama ọ ga-abụ i jiri taịpraịta na-ede ihe ị gbaa mbọ hụ na i tinyere 'ịnk', na ị kwagharịkwara ya ma ị degide ruo n'isi dgz, ị ga-edenwuzi ihe niile ị chọrọ n'elu kọmputa gị, na-atụfughi ụra n'ebe ị ga-esi weta ịnk makana ọ gwụlahịri gị.
Kọmputa emeela ya ka ọ dị mfe ide ihe na mpempe akwụkwọ.
Kedụ ndị ọzọ ị ma?
Akụkọ ndị a ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










