2019 Top Searches: Naira Marley, RUGA na ihe ndị ọzọ a kacha chọọ n'ịntanetị n'afọ 2019

Regina Daniels, Naira Marley na onye ọchịehi

Ebe foto si, Instagram/Getty

Ọbịbịa ịntaneetị emeela ka mgbasa na nzikọrịta ozi dịwanye mfe.

Ịchọpụta akụkọ maọbụ onye na-ewu ewu bụzị naanị nkeji olemole ka ọ na-ewe.

Dịka afọ 2019 na-abịa n'isi njedebe, anyị mere nchọpụta gbasara akụkọ, isiokwu nakwa ndị mmadụ a kachasị chọọ n'ịntanetị.

Lee ha ebe a:

Isi akụkọ a kacha chọọ na ịntaneetị

1. RUGA

Fulani ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Dịka mwakpo ndị ọchịehi na-abawanye na Naịjirịa, gọọmentị etiti wepụtara atụmatụ ha kpọrọ 'Rural Grazing Area' (RUGA).

Mana ndị mmadụ anabataghị atụmatụ ahụ chaa chaa.

2. Abụbụ ọrụ ndị ASUU

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi

Ebe foto si, Federal Ministry of Labour

Nkọwa foto, Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi na onye ọzọ.

Abụbụ ọrụ ndị otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naịjirịa abụghịzị ihe ọhụrụ.

Nke ikpeazụ ha gbara bụ n'ọnwa Febrụwarị 2019 ka ha kwụsịrị ya.

N'ọnwa Nọvemba, ASUU jikwa abụbụ ọrụ yijaa gọọmentị n'ihi na ha achọghị iso n'atụmatụ a kpọrọ 'Integrated Payroll Personnel Information System' (IPPIS).

3. Asọmpi iko mba Afrịka

Ndị mba Ọljiria

Ebe foto si, AFP

Asọmpi iko mba Afrịka afọ 2019 kporo nnukwu ọkụ.

Ọ bụ na mba Ijipt ka a gbara ya.

BBC Igbo guzoro ka odogwu iwetara ndị Igbo etu ya bụ egwuregwu si gaa.

4. Iko mba ụwa ụmụnwaanyị

Ụmụnwaanyị Amerịka buliri iko mba ụwa ụmụnwaanyị nke 2019

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị Amerịka buliri iko mba ụwa ụmụnwaanyị nke 2019

Nke dịkwa ka ya bụ iko mbaụwa ụmụnwaanyị a gbara na mba Brazil.

Ọ bụ ụmụnwaanyị mba Amerịka tuuru ugo na ya.

5. Xenophobia

Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Mwakpo a na-awakpo ndị mbịarambịara na mba Saut Afrịka kawanyere njọ n'afọ 2019.

Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa si mba ahụ gbalata n'ihi ya bụ ihe.

Ndị mmadụ a kacha chọọ

1. Naira Marley

Naira Marley on May 20 for

Ebe foto si, Economic and Financial Crimes Commission

Onye oti egwu a wuru ewu maka ihe ọjọọ nakwa nke ọma.

Nke ọjọọ bụ na ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo izu ohi na ịntaneetị.

Ikpe ahụ ka na-aga n'ihu ugbu a n'ụlọikpe dị na Legọs.

Nke ọma bụ na Naira Marley tiputara egwu ọhụrụ ọ kpọrọ LOL (Lord Of Lamba).

Nwaokorobịa a nwere ọtụtụ ndị ntorobịa egwu ya na-amasị.

2. Atiku Abubakar

Atiku Abubakar

Ebe foto si, @atiku/Twitter

Atiku bụbu osote onyeisiala Naịjirịa, nke so wee zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 mana kụọ afọ n'ala.

Oge e mechara ntụliaka ahụ, Atiku gara ụlọikpe na-ekwu ka e mee ya onyeisiala, mana nke ahụ nyụkwara pịị.

3. Neymar

Neymar

Ebe foto si, Getty Images

Neymar bụ onye ọgba bọọlụ mba Brazil a ma ama.

O wuru ewu na oge ndị mmadụ che na ọ ga-alaghachi otu egwu Barcelona bụ ebe o si pụọ gawa PSG n'afọ 2017.

4. MC Oluomo

MC Oluomo

Ebe foto si, Twitter/Mc_Oluomo1

Nkọwa foto, MC Oluomo

Oluomo bụ onyeisi ndịọrụ ụgbọala na steeti Legọs.

Ọbụkwa onye nkwado Bola Tinubu, aka chiburu Legọs Steeti.

Ndị otiegwu

1. Zlatan

Zlatan

Ebe foto si, Twitter/Zlatan_Ibile

Zlatan nwetara nnọọ aka nchawa n'afọ 2019.

Egwu ya dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ.

2. Burna Boy

Burna Boy

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Damini Ebunoluwa Ogulu a ma díka 'Burna Boy etiela ótútú egwu gúnyere 'Like to party', 'Burn Identity'

Ọnwa Burna Boy na-etizi ugbu a.

Nke kacha bụ na ahọpụtara egwu ya maka iso zọọ nrite 'Grammy'.

3. Teni

Teni

Ebe foto si, Twitter/TeniEntertainer

Nkọwa foto, Teni

Nwaada a sozi n'ihe a na-eme ugbua.

Egwu ya na-atọba ndị mmadụ n'ụbụrụ isi.

4. Kizz Daniel

Kizz Daniel

Ebe foto si, Instagram/iamkizzdaniel

Kizz Daniel tiputara egwu ọhụrụ di icheiche n'afọ a.

Ha gunyere 'Pak n Go', 'Ello Baby' na 'Eko'.

Ndị na-eme ejije a kacha chọọ

1. Regina Daniels

Regina Daniels

Ebe foto si, Instagram/regina.daniels

Nkọwa foto, Regina Daniels

Nwa agbọghọ anaghị agha igosi mma nakwa akụnaụba ya oge ọbụla.

Ihe ọzọ kpatara o ji ewu ewu mgbe niile nwere ike bụrụ maka na di ya bụ onye ọgaranya a ma aha ya.

2. Genevieve Nnaji

Genevieve Nnaji

Ebe foto si, Instagram/genevievennaji

Nkọwa foto, Lion Heart bụ ejije izizi Gnevieve Nnaji mepụtara n'onwe ya.

Afọ 2019 maara Genevieve Nnaji nnukwu mma.

E wepụtara ihe onyonyoo ya bụ 'Lion Heart' maka ituru ugo 'Oscar'.

Mana o mechara ọ dabaghịzị.

3. Tonto Dike

Tonto Dike

Ebe foto si, Instagram/Tontolet

Nkọwa foto, Tonto Dike

Aha ọzọ i nwere ike ịkpọ Tonto Dike bụ 'Azụanụụka'.

O wuru ewu n'afọ maka ọtụtụ ihe, otu n'ime ha bụ maka na ọ gara ụlọọgwụ gbanwee ahụ ya nke bekee na-akpọ 'cosmetic surgery'.

4. Hadiza Gabon

Hadiza Gabon

Ebe foto si, Instagram/adizatou

Hadiza bụ onye na-eme ihe nkiri n'asụsụ awụsa nakwa bekee.

Mana ebe a kacha mara ya bụ n'ejije nke ndị awụsa.

Ihe nkiri TV a kacha chọọ

1. Big Brother Naija

Mercy Eke

Ebe foto si, Mercy Eke

Nkọwa foto, Mercy Eke bụ nwaanyị mbụ na-emeri BigBrother Naija

Nke a bụ ihe nkiri kacha ibe ya e mere na Naịjirịa n'afọ 2019

2. Mehek

Mehek

Ebe foto si, Twitter/ZeeWorldAfrica

Nke abụ ihe nkiri a na-eme 'Zee World'.

'Zee World' bụ ihe ejije ndị mba India mana ọ na-amasị ọtụtụ ndị Naịjirịa.

3. Captain Marvel

Captain Marvel

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ ihe nkiri nke si mba Amerịka.

Ya bụ ihe nkiri wuru ewu oge e wepụtara ya.

4. When they see us

When they see us

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụkwa ihe nkiri si 'Hollywood'.

Ọ na-amasị ọtụtụ ndị Naịjirịa nke ukwu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị ya:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ekeresimesi oge ọchịchị Rochas ọ ka nke Ihedioha mma?